Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite n’April 9
Abụ nke 201
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Young People Ask—What Will I Do With My Life? bụ́ nke e nwere n’ụdị DVD. Nke a bụ iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ. Dọrọ uche ndị na-ege ntị gaa n’igbe bụ́ “Main Menu” [Ihe Ndị Dị na Ya] ma kọwaa otú e si esi n’otu akụkụ nke vidio ahụ agafe n’akụkụ ọzọ. Jiri aro a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche April 15 na Teta! April–June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa jụrụ ajụjụ ọ ga-aza ma ọ bịa nletaghachi.
Minit 15: “Anyị Nile Pụrụ Iso Mee Ka Mmadụ Ghọọ Onye Na-eso Ụzọ Kraịst.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ndị nọ n’ọgbakọ si gbaa ha ume tupu ha emee baptizim. A pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha agwa tupu oge eruo ka ha wee nwee ike ịkwadebe ihe ha ga-ekwu.
Minit 20: Abụ M Onye Dị Otú A! Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Ụfọdụ ndị ntorobịa adịghị achọ ime ka a mara ha dị ka Ndịàmà Jehova n’ihi na ha na-eche na ndị ntorobịa ibe ha ga-achị ha ọchị. Ma, e nwere ọtụtụ ezigbo ihe mere i kwesịrị iji kọwaa onye ị bụ. Ọ bụrụ na ndị nkụzi amata ihe ndị i kweere na ha, o yiri nnọọ ka hà ga-aghọta ọnọdụ gị ma ghara ịmanye gị iso mee ihe ụfọdụ na-ekwesịghị ekwesị. Obi agaghị akacha ndị ntorobịa na-aka anya ịkpọ gị ka i sonyere ha n’omume ọjọọ ha. Ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe ịghọta ihe mere i ji kpebie na ị gaghị eso ha eme ihe ndị dị ka iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa, egwuregwu a na-eme n’ụlọ akwụkwọ, na ihe ndị ọzọ a na-eme mgbe a gbasachara ụlọ akwụkwọ. Ụjọ agaghịkwa na-atụ gị ikwusa ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ mgbe ị hụrụ nwa klas gị ka ị na-ezi ozi ọma n’ókèala unu. (g02-IB 4/8 p. 28) Gwa ndị nkwusa ka ha kọọ otú o sirila baara ha uru ime ka a mata na ha bụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ. A pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha agwa tupu oge eruo ka ha wee nwee ike ịkwadebe ihe ha ga-ekwu.
Abụ nke 43 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’April 16
Abụ nke 161
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Minit 15: “Kwuo Okwu Chineke n’Atụghị Egwu.”b Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.
Minit 20: “Gịnị Ka Ị Ga-eji Ndụ Gị Mee?”—Akụkụ nke 1.c Kwuo okwu mmeghe dị mkpirikpi nke ga-adabere na paragraf nke 1-2, ma malitezie ịjụ ajụjụ ndị dị na paragraf nke 3-4. Mgbe ị na-atụle ajụjụ nke 4 nke dị na paragraf nke 3, gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ ahụ e zoro aka na ha. Ná mmechi, tụleghachi igbe bụ́ “Main Menu” [Ihe Ndị Dị na Ya]. Gbaa mmadụ nile ume ikiri akụkụ bụ́ “Interviews” na akụkụ bụ́ “Supplementary Material” bụ́ ndị dị na vidio ahụ iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ. Ma ọ bụkwanụ, tụlee traktị bụ́ “Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee?”
Abụ nke 207 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’April 23
Abụ nke 215
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche May 1 na Teta! April–June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.
Minit 10: Lee! Ìhè ahụ Dị Ebube! Okwu dabeere n’Ụlọ Nche March 15, 2007, peeji nke 12-14.
Minit 25: “Gịnị Ka Ị Ga-eji Ndụ Gị Mee?”—Akụkụ nke 2.d Bido ozugbo jụwa ajụjụ ndị dị na paragraf nke 5-7. Jiri okwu agbamume dị na paragraf nke 8 mechie. Ma ọ bụkwanụ, tụlee isiokwu bụ́ “Ụlọ Akwụkwọ nke Ndị Si na Ya Pụta Na-enyere Ndị Mmadụ Aka Gburugburu Ụwa.” Ọ dị na peeji nke 10 nke Ụlọ Nche November 15, 2006.
Abụ nke 172 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’April 30
Abụ nke 186
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa April. Tụlee Igbe Ajụjụ.
Minit 10: Mkpa ọgbakọ.
Minit 25: “Mgbakọ Distrikti ‘Na-eso Kraịst!’ nke Ndịàmà Jehova nke 2007.”e Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Tupu ị tụlewe ihe ntinye ahụ, gụọ akwụkwọ ozi April 1, 2007, bụ́ nke e ji kenye ọgbakọ unu mgbakọ distrikti unu ga-aga. Mgbe ị na-atụle paragraf nke 8 nke ihe ntinye ahụ, gụọ nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e dere n’igbe bụ́ “Otú E Si Enweta Ụlọ Obibi.” Gbaa mmadụ nile ume ịmalite ozugbo o kwere mee kwadebewe maka mgbakọ distrikti.
Abụ nke 44 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na May 7
Abụ nke 164
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 15: Ndokwa Ndị A Na-eme Maka Ebe A Na-anọ Efe Ofufe. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.
Minit 20: “Mgbe Ndị Mmadụ Na-anọghị n’Ụlọ.”f Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya.
Abụ nke 178 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.