Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na June 11
  • Izu Na-amalite na June 18
  • Izu Na-amalite na June 25
  • Izu Na-amalite na July 2
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 6/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na June 11

Abụ nke 153

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa June. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche June 15 na Teta! April–June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 15: Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke. Okwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche February 15, 2002, peeji nke 24-28. Ụfọdụ ndị nkwusa adịghị ekwe agwa ndị nwere mmasị ka ha mụwara ha Bible n’ihi na ọ na-adị ha ka ha erughị eru iduzi ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, Jehova na-eji Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ ya eme ka anyị ruo eruo ijere ya ozi. Ihe bụ́ mkpa anyị abụghị nanị inyefe ndị mmadụ akwụkwọ. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ịkụziri ha ihe. (Mat. 28:19, 20) Gbaa ndị nkwusa ume ka ha na-eji iduzi ọmụmụ Bible akpọrọ ihe.

Minit 20: Na-emenụ Ihe Nile Iji Nye Chineke Otuto. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, isi nke 13.

Abụ nke 144 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na June 18

Abụ nke 217

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Minit 15: Ì Chetara? Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’Ụlọ Nche April 15, 2007, peeji nke 19.

Minit 20: “Obi Dị Anyị Ụtọ na Anyị Na-etinye Onwe Anyị n’Ozi Jehova!”a Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 82 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na June 25

Abụ nke 15

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche July 1 na Teta! April–June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 20: “Ị̀ Pụrụ Ịbanye ‘n’Ọnụ Ụzọ Buru Ibu nke Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ’?”b Gbaa otu onye ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ n’ụzọ dị nkenke. Olee mgbanwe ndị ha mere iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile? Olee ngọzi ndị ha nwetarala?

Abụ nke 138 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 2

Abụ nke 208

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa June. Kwuo akwụkwọ a ga-eji jee ozi n’ọnwa July, meekwa ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi nyefee ya.

Minit 15: Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi—Otu Ụzọ Dị Mkpa E Si Ekwusa Ozi Ọma. Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 101-102. Kwuo ụfọdụ ụzọ ndị dabara adaba n’ókèala unu a pụrụ isi gbaa àmà n’oge a na-anọghị n’ozi. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị bụ́ ịgba ha nwetarala mgbe ha gbara àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi.

Minit 20: “Nọgide ‘Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu.’”c Mgbe ị na-atụle paragraf nke 4, gụnye ihe e kwuru n’igbe bụ́ “Otú E Si ‘Eji Ntachi Obi Amị Mkpụrụ,’” bụ́ nke dị n’ Ụlọ Nche February 1, 2003, peeji nke 21.

Abụ nke 69 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya