Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na July 9
  • Izu Na-amalite na July 16
  • Izu Na-amalite na July 23
  • Izu Na-amalite na July 30
  • Izu Na-amalite n’August 6
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 7/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na July 9

Abụ nke 4

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche July 15 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 15: Olee Ihe Na-eweta Ezi Obi Ụtọ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke May 15, 2006, peeji nke 28-29, paragraf nke 11-12. Gbaa otu nwanna ajụjụ ọnụ dị nkenke, bụ́ onye merela ka ije ozi ọma bụrụ ihe mbụ ọ na-ebute ụzọ ná ndụ ya kama ịdị na-ebute ihe ụtọ na ọrụ ego ụzọ. Gịnị mere o ji họrọ ịchụso ihe ndị metụtara ofufe Chineke? Olee otú nke ahụ sirila wetara ya obi ụtọ?

Minit 20: Igbe Ajụjụ. Ọ bụ okenye ga-eme ya. Gụọ ma kọwaa ihe nile dị na ya. Gụnye ihe ndị e kwuru na Teta! nke June 8, 2005, peeji nke 13-14, n’okpuru isiokwu nta bụ́, “Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Aghụghọ na Izochi Ihe” na “Ịhọrọ Ịnọ Ihu na Ihu Kwuwe Okwu Ọlụlụ Kama Isi n’Intanet Na-ekwu Ya.”

Abụ nke 91 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 16

Abụ nke 16

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa July.

Minit 20: Ịhụ na Ọgbakọ Nọgidere Na-adị n’Udo Ma Na-adị Ọcha. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, malite na peeji nke 144 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 150.

Minit 15: “Mgbanwe Ndị Magburu Onwe Ha A Ga-eme n’Ụlọ Nche!”a

Abụ nke 189 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 23

Abụ nke 133

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufe. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 1 na Teta! nke July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 20: Na-elenụ Ibe Unu Ọbịa. Okwu ga-adabere n’Ụlọ Nche nke January 15, 2005, peeji nke 21-23. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ e ji ile ọbịa mara ajụjụ ọnụ. Olee otú ha sirila lee ọbịa? Olee ngọzi ndị ha na ezinụlọ ha nwetarala n’ihi ile ọbịa?

Minit 15: Ịkwadebe Okwu Mmeghe Ndị Na-arụpụta Ihe Bara Uru. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 2, paragraf nke 1-2. Meekwa ihe ngosi nke ebe a na-enyefe onye nwe ụlọ akwụkwọ a ga-eji eje ozi n’August.

Abụ nke 61 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 30

Abụ nke 200

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa July.

Minit 15: Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eweta Ngọzi Jehova. Okwu ga-adabere n’Ụlọ Nche nke November 15, 2005, peeji nke 8-9.

Minit 20: “Obi Ụtọ Na-adịrị Onye Nọgidere Na-atachi Obi n’Ọnwụnwa.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú okwukwe siri ike ha nwere sirila nyere ha aka mgbe ọnwụnwa bịaara ha na mberede. A pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha agwa tupu oge eruo ka ha wee nwee ike ịkwadebe ihe ha ga-ekwu.

Abụ nke 13 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite n’August 6

Abụ nke 106

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 20: “Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro.”c Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, gwa ndị na-ege ntị, bụ́ ndị na-enwebughị mmasị ịnụ eziokwu ahụ, ka ha kwuo ihe mere ha ji nwewezie mmasị.

Abụ nke 211 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe gị ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe gị ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe gị ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya