Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na May 12
Abụ nke 134
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa May. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke May 1 na Teta! nke April-June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.
Nkeji 15: Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla! Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke June 15, 2005, peeji nke 30-31. Gwa ndị nkwusa ole na ole ka ha kọọ otú Jehova sirila nyere ha aka ịnagide ọnwụnwa.
Nkeji 20: Ì Nwere Ike Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Oge Ezumike? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Tụlee peeji nke 112-113 nke akwụkwọ Ndị A Haziri, ma kwuo ihe ndị a chọrọ n’aka mmadụ iji ruo eruo ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Gwa ndị nwerela mgbe ha weere oge ezumike ha rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ka ha kọọ ngọzi ndị ha nwetara. Gwa ndị ji oge ezumike ụlọ akwụkwọ ha rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ka ha kọọ otú ndị ọzọ si gbaa ha ume ma nyere ha aka. Olee otú ịsụ ụzọ inyeaka si nyere ha aka ịbịarukwu Chineke nso? Olee ihe ndị nyere ha ọṅụ? Gbaa mmadụ niile ruru eru ume ka ha chebara ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa July, August na September echiche, karịsịa, ebe ọ bụ na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ga-anọ ezumike n’oge ahụ.
Abụ nke 187
Izu Na-amalite na May 19
Abụ nke 47
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ.
Nkeji 15: “Irite Uru Site n’Akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.”a Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Meekwa ihe ngosi ga-ewe nkeji asaa nke ebe nne ma ọ bụ nna na-eduziri nwa ya ihe, dabere na peeji nke 120 paragraf nke 4 ruo peeji nke 121 paragraf nke 3 nke akwụkwọ ahụ. Jiri ajụjụ ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze a duzie ya.
Nkeji 20: “I Nwere Ike Inweta Akụnụba!”b Kwuo ihe ndị ga-eme ka mmadụ ruo eruo ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, bụ́ ndị dị na peeji nke 113-114 nke akwụkwọ Ndị A Haziri. Ndị chọrọ ịmalite ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile na September 1 kwesịrị idejupụta akwụkwọ maka ya ma weta ya ozugbo o kwere ha mee.
Abụ nke 206
Izu Na-amalite na May 26
Abụ nke 103
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa May. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke June 1 na Teta! nke April-June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke abụọ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.
Nkeji 15: “Nyaranụ Yok M.”c Dabere n’oge e nwere, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu ahụ.
Nkeji 20: Nyefee akwụkwọ Fee Chineke Ofufe n’ọnwa June. Okwu a ga-eme ihe ngosi na ya. Tụleghachi aro ndị a tụrụ na peeji nke 3 na nke 5 nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2005. Kwuo otú e nwere ike isi jiri ihe osise paradaịs ndị dị n’akwụkwọ ahụ malite nkwurịta okwu. Mee ihe ngosi nwere akụkụ abụọ. Gosi otú e nwere ike isi nyefee akwụkwọ ahụ na otú a ga-esi mee nletaghachi, n’ebumnobi nke iji akwụkwọ Bible Na-akụzi malite ọmụmụ Baịbụl.
Abụ nke 169
Izu Na-amalite na June 2
Abụ nke 221
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Nkeji 20: Ndị Na-eme Ihe n’Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-enweta Ọtụtụ Ngọzi. (Ilu 28:20) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke odeakwụkwọ ga-ekwu. Kwuo otú Jehova sirila gọzie mgbalị ọgbakọ unu mere iwepụtakwu oge iji jee ozi n’ọnwa March, April, na May, ma jaa ndị nkwusa unu mma. Maa ọkwa mmadụ ole rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ọmụmụ Baịbụl ọhụrụ ole a malitere, na ihe ọma ndị ọzọ a rụzuru n’ozi. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na n’oge a na-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù. E nwere ike ime ihe ngosi nke ahụmahụ ndị magburu onwe ha e nwetara n’oge a na-aga ozi ọma. Jiri nkeji ole na ole gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ ka ha kọọ ngọzi ndị ha nwetara mgbe ha na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
Nkeji 15: “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla.”d Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha si akwadebe maka ozi ụlọ n’ụlọ, na mgbe ha ji eme ya.
Abụ nke 44
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.