Irite Uru Site n’Akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
1 N’oge na-adịbeghị anya, otu onyeisi ezinụlọ jụrụ otu okenye ihe ọ ga-eji kụziere nwa ya nwoke izere ịgha ụgha. Okenye ahụ gwara ya ka ọ gaa n’isi nke 22 nke akwụkwọ bú Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, ị̀ maara uru dị n’iji akwụkwọ a akụzi ihe? E dere ya iji kụziere ụmụaka ịkpa ezi àgwà. E wezụga ịkụziri ụmụaka izere ime ihe ọjọọ, ọ na-akọwara ha eziokwu Baịbụl ma na-egosi ha otú e si ezere ihe ize ndụ ndị dị n’ụwa ọjọọ a anyị bi n’ime ya.
2 N’eziokwu, ụmụaka anyị niile ga-erite uru n’akwụkwọ a. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ya abụrụkwa na gị na ụmụ gị amuchabeghị akwụkwọ a, ọ́ gaghị adị mma ma ị hazie ka unu jiri ya na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ? Mgbe gị na ezinụlọ gị mụchara ya, ọ ga-adịziri gị mfe karị iji ihe ndị dị iche iche ị mụtara na ya na-enyere ụmụ gị aka ná nsogbu dị iche iche ha nwere.
3 Mgbe Mozis gụpụtachara Iwu Chineke, o kwuru sị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị.” (Diut. 6:6, 7) Ị ga na-agbaso ndụmọdụ a amamihe dị na ya ka i ji akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na-akụziri ụmụ gị ihe ndị bara uru. A haziri ajụjụ ndị so Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a bịa iji nyere gị aka mgbe i ji akwụkwọ a na-eduzi ọmụmụ ihe. Biko tinye akwụkwọ ajụjụ ahụ n’ime akwụkwọ nke gị, o nwekwara ike ịbara gị uru ma ọ bụrụ na ị na-ele anya na ya mgbe a na-amụ akwụkwọ ahụ.