Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! A ga-eme mgbalị pụrụ iche ileta ndị malitere inwe mmasị ọhụrụ, bụ́ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs na okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche, bụ́ ndị na-abatabeghị n’ọgbakọ. Ihe mere a ga-eji eleta ndị a bụ iji malite ịmụrụ ndị a na-amalitebeghịrị ọmụmụ Baịbụl ọmụmụ ihe. June: Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. July na August: E nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi Ị̀ Chọtawo Ya?
◼ Òtù ndị okenye kwesịrị ịtụleghachi akwụkwọ ozi July 6, 2006, bụ́ nke kwuru banyere ịkwadebe maka ọdachi, ma hụ na ha nwetara adres na nọmba ekwe ntị nke onye nkwusa ọ bụla. N’ebe a na-enwekarị ọdachi, e kwesịrị inweta adres na nọmba ekwe ntị nke onye nkwusa na-ebighị n’ógbè ahụ, bụ́ onye nwere ike inye aka mgbe e nwere ihe mberede. E wezụgakwa n’ọnọdụ mberede, ọ bụrụ na onye nkwusa achọọ ime njem ọ ga-anọte aka, dị ka ihe atụ, ịga ezumike ma ọ bụ ime njem azụmahịa, ịga ụlọ ọgwụ a ga-enye ya àkwà, na njem ndị ọzọ, ọ na-enye aka ma ọ bụrụ na ọ gwa onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ya ma ọ bụ okenye ọzọ.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’—Bekee, French, Igbo, Yoruba
Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!—Itsekiri
Ihe Ndị Na-eme ná Ndụ Gị Hà Si n’Akara Aka? (Traktị Nke 81)—Abụa, Edo, Efịk, Bekee, Gokana, Hausa, Igbo, Isoko, Itsekiri, Khana, Tiv, Urhobo, Yoruba
Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ? (Traktị Nke 24)—Efịk, Hausa, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ—Igbo
Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ (nke nwere mkpo siri ike na nke nwere mkpo na-esighị ike)—Igbo