Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/08 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Ụlọ Akwụkwọ Na-aga nke Ọma nke Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1996
  • Jehova Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-arụ Ọrụ A
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Ụlọ Akwụkwọ nke Na-akwadebe Anyị Maka Ihe Ndị Kasị Mkpa
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikele Ndị Meere Anyị Ihe Ọma?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 5/08 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Ndị na-ege ntị hà kwesịrị ịkụ aka mgbe e mechara ihe omume nke ọ bụla n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi?

Mgbe Onye Okike anyị, bụ́ Jehova, kere ụwa, “kpakpando ụtụtụ tikọrọ mkpu ọṅụ ọnụ, ụmụ Chineke niile amalitekwa iti mkpu otuto.” (Job 38:7) Ọ masịrị ndị mmụọ ozi a bụ́ ụmụ Chineke ito Jehova maka ihe ndị mara mma o kere, nke bụ́ ụzọ ọhụrụ o si gosi na ya nwere amamihe, ịdị mma, na ike.

Ọ dị mma ka anyị gosi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka mbọ ụmụnna anyị gbara ime ihe omume e nyere ha. Dị ka ihe atụ, anyị na-akụrụ ndị kwuru okwu na ndị mere ihe ngosi ná nnọkọ anyị ndị pụrụ iche aka, dị ka ná mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ sekit, na mgbakọ distrikti. Ndị mere ihe omume ná mgbakọ ndị a wepụtara nnọọ oge ha na ume ha iji kwadebe ha. Aka anyị na-akụ abụghị naanị iji kelee ọkà okwu maka mbọ ya, kama nke ahụ, ọ bụkwa iji kelee Jehova maka ihe ndị o ji Okwu ya na nzukọ ya na-ezi anyị.—Aịza. 48:17; Mat. 24:45-47.

Oleekwanụ maka ịkụ aka n’ihe omume ndị a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi? Ọ dịghị iwu machibidoro mmadụ ịkụ aka ma ọ bụrụhaala na ọ kụrụ ya iji gosi na o nwere ekele, dị ka ihe atụ, mgbe nwa akwụkwọ mere ihe omume mbụ ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ma, ọ bụrụ na a kpachaghị anya, ịkụ aka nwere ike ịghọ ihe e ji emezu iwu, ma gharazie inwe ihe ọ pụtara. N’ihi ya, ọ bụghị mgbe niile e mechara ihe omume ka anyị na-akụ aka.

Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ghara ịkụ aka n’ọtụtụ ihe omume a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi, e nwere ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere ekele maka ihe a na-ezi anyị n’ọmụmụ ihe ndị ahụ, nakwa maka mbọ ụmụnna ndị mere ihe omume ndị ahụ gbara. Anyị nwere ike ime nke a site n’ige ntị nke ọma mgbe ha na-eme ihe omume ndị ahụ. A gbasaakwa ọmụmụ ihe, anyị nwekwara ike ịgakwuru ha n’onwe anyị ma kelee ha maka mbọ ha gbara.—Efe. 1:15, 16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya