Jehova Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-arụ Ọrụ A
1. Mgbe ọ bụla Jehova gwara ụmụ mmadụ ihe ọ chọrọ ka ha mee, olee ihe ọzọ ọ na-eme?
1 Mgbe ọ bụla Jehova gwara ụmụ mmadụ ihe ọ chọrọ ka ha mee, ọ na-agwa ha otú ha ga-esi eme ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, Noa arụtụbeghị ụgbọ. Ma, mgbe Jehova gwara ya ka ọ rụọ ụgbọ, ọ gwara ya otú ọ ga-esi arụ ya. (Jen. 6:14-16) Mozis bụ nwoke na-azụ atụrụ, ọ dịkwa umeala n’obi. Mgbe Jehova gwara ya ka ọ gakwuru ma ndị okenye Izrel ma Fero, o mesiri ya obi ike, sị ya: “Mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị, m ga-akụziri gị ihe ị ga-ekwu.” (Ọpụ. 4:12) Jehova na-enyekwara anyị aka n’ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ taa. O ji Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi akụziri anyị otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ a. Olee ihe anyị ga-eme ka ọzụzụ a Jehova na-azụ anyị baara anyị uru?
2. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike irite uru n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?
2 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke: Tupu ị gawa ọmụmụ ihe, buru ụzọ gụọ ebe ihe omume ndị a ga-eme si. Mgbe ndị nwe ihe omume ndị ahụ mewere ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị ga-ahụ otú ha si kọwaa ha, gị esi otú ahụ mụtakwuo otú e si akụzi ihe nke ọma. (Ilu 27:17) Jiri akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi gị bịa ọmụmụ ihe, sapetakwa ya ma onye na-eduzi ụlọ akwụkwọ kwuwe okwu na peeji nke ọ bụla n’ime ya. Ọ bụrụ na e nwere ọkpụrụkpụ ihe ọ rụtụrụ aka n’akwụkwọ ahụ mgbe onye mere ihe omume mechara, kaa ihe ahụ ihe. Deekwa ihe n’akụkụ peeji ahụ ma ọ bụrụ na e nwere ihe ị chọrọ idetu. Ma, ụlọ akwụkwọ a ga-akacha abara gị uru ma ọ bụrụ na i denye aha gị na ya. Ì denyekwala aha gị? E nye gị ihe omume, mụọ ya nke ọma. A tụọrọ gị aro otú ị ga-esi mekwuo nke ọma, gbalịa mee ihe a gwara gị. Ị gaa ozi ọma, mee ihe ị mụtara n’ụlọ akwụkwọ a.
3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike irite uru ná Nzukọ Ije Ozi?
3 Nzukọ Ije Ozi: Ọ bụrụ na anyị na-ewepụta oge gụọ ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe a, jikerekwa ịza ajụjụ, ọ ga-eme ka anyị na-echeta ihe ndị a mụrụ. Ọ bụrụkwa na azịza anyị adịrị nkenke, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị tinye ọnụ n’ihe ahụ a na-amụ. Gee ntị nke ọma mgbe a na-eme ihe ngosi, ị gaa ozi ọma, meekwa ihe ndị ị mụtara n’ihe ngosi ahụ. E nwee isiokwu ndị gbara n’Ozi Alaeze Anyị, bụ́ ndị ga-abara gị uru n’ozi ọma, gbalịa dewe ha ebe aka gị ga-eru ha ngwa ngwa.
4. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe kpọrọ ihe?
4 Otú ahụ ọrụ e nyere Noa na Mozis na-adịrịghị ha mfe ka ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ n’ụwa niile na-adịrịghị anyị mfe. (Mat. 24:14) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, bụ́ Onye Ozizi Ukwu anyị, ma jiri ihe ndị a na-akụziri anyị kpọrọ ihe, anyị ga-eme nke ọma.—Aịza. 30:20.