Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 19
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 19
Abụ nke 78 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 9 ¶19-24, igbe dị na p. 73 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 135-141 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 137:1–138:8 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ihe Pọl Kwuru ná Ndị Rom 14:7-9 Ji Akasi Anyị Obi (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndị Mmụọ Ozi Nupụrụ Isi—td 10CH (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Ije Ozi Gara Aga? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kwuo otú ọgbakọ unu si jee ozi n’afọ ije ozi gara aga. Lekwasị anya n’ihe dị mma unu rụpụtara ma jaa ọgbakọ unu mma. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ nwere ahụmahụ ndị tọrọ ụtọ ajụjụ ọnụ. Kwuo otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ ọgbakọ unu ga-agbalị imekwu nke ọma n’afọ ije ozi ọhụrụ a anyị banyere, tụọkwara ha aro ga-enyere ha aka imekwu nke ọma n’ebe ndị ahụ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Ị Ga-aza? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 198, ajụjụ nke 12 na nke 13.
Nkeji 10: “Jehova Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-arụ Ọrụ A.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 117 na Ekpere