Rite Uru Site n’Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke 1999
1 Jisọs bụ Onye Nkụzi Bụ́ Ọkà. ‘Ibobo ozizi Ya nwụrụ ndị mmadụ n’ahụ.’ (Mak 1:22) Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ ikwu okwu ma zie ihe nke ọma dị ka Jisọs ziri, anyị pụrụ ịgbalịsi ike iṅomi ya. (Ọrụ 4:13) Iji mezuo nke ahụ, anyị ikere òkè n’usoro ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eme ka nkà ikwu okwu na izi ihe anyị na-adịwanye mma.
2 Na 1999, Ihe Omume nke 1 ga-esite n’ụzọ ka ukwuu n’isiokwu ndị sitere na magazin Ụlọ Nche na Teta! nke 1997. Anyị ga-aghọtakwu ihe ime mmụọ n’ụzọ dị ukwuu ma anyị gụọ ihe ọmụma a tupu oge eruo ma nụzie ya n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ. Ndị e nyere okwu izi ihe ndị a kwesịrị ịkọwa ụzọ a pụrụ isi tinye ihe a na-atụle n’ọrụ n’ụzọ dị irè, na-ekwu ya n’ụzọ na-adọrọ mmasị ma na-ekpo ọkụ. Ihe Omume nke 3 ga-adabere n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, Ihe Omume nke 4 ga-adabekwara n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu (mbipụta nke 1998), ọ bụ ezie na a pụrụ ịgbanwerịta ebe e si nweta ihe omume ndị a. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwesịrị iji nlezianya tụlee ihe ndị ahụ a ga-atụle tupu o kenye ha. Ndị mmụta nile e nyere ihe omume n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ kwesịrị ịbụ ezi ihe nlereanya ná ndụ ezinụlọ nke ha.
3 Tinye Ndụmọdụ n’Ọrụ, Kwadebekwa Nke Ọma: Onye ọ bụla pụrụ inwekwu ọganihu na nkà ikwu okwu na izi ihe. (1 Tim. 4:13) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị na-achọ ịnata ndụmọdụ ma ghara ile ya anya mgbe ọ bụla dị ka ihe e kwesịrị izere ezere. (Ilu 12:15; 19:20) Ikwupụta eziokwu ahụ n’ụzọ dị irè ná nzukọ na n’ozi ubi chọrọ ihe karịrị nanị ịkọ ihe ndị bụ́ eziokwu ma ọ bụ ịgụpụta akụkụ akwụkwọ nsọ n’ụzọ iji mezuo iwu. Ọ dị anyị mkpa iru n’obi ma kpalie ndị na-ege anyị ntị. Anyị pụrụ ime nke a site n’iji obi anyị kwupụta eziokwu ahụ n’ụzọ ga-eme ka e kwenye na ya. (Tụlee Ọrụ 2:37.) Ndụmọdụ anyị na-enweta n’ụlọ akwụkwọ ga-enyere anyị aka imezu nke a.
4 Ozugbo ị natara ihe omume, chee echiche banyere ọdịdị okwu ị ga-arụ ọrụ na ya dị ka a kọwara n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ. Tụlee ihe ọ dị gị mkpa ime iji tinye ndụmọdụ ị natara n’oge gara aga n’ọrụ. Tụgharịa uche n’isiokwu gị, ọnọdụ okwu ị ga-eji eme ihe ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, na ụzọ ị ga-esi jiri akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị n’ihe omume gị mee ihe. Tụgharịa uche banyere ụzọ kasị mma ị pụrụ isi jiri ihe ọmụma ahụ kụzie ihe ma kpalie ndị mmadụ.—1 Tim 415, 16.
5 Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị idenye aha gị n’ụlọ akwụkwọ ahụ, kpee ekpere banyere ya ma soro onye nlekọta ụlọ akwụkwọ tụlee mmetụta gị. Onye ọ bụla pụrụ irite uru site n’iji usoro ihe omume ahụ a ga-ewepụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na 1999 mee ihe n’ụzọ zuru ezu.