Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 26
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 26
Abụ nke 101 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 10 ¶1-9, igbe dị na p. 79 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 142-150 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 144:1–145:4 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: E Kere Ụwa Ka Ọ Bụrụ Paradaịs—td 44A (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Zere ‘Ile Mmadụ Anya n’Ihu’?—Jems 2:1-4 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Unu kwurịta ihe e kwuru n’isiokwu bụ́, “Otú E Nwere Ike Isi Jiri Broshuọ Baịbụl Na-ekwu Duzie Ọmụmụ Baịbụl.” Jiri ihe dị ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” bụ́ nke dị na peeji nke 4, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Ọktoba. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 10: Igbe Ajụjụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuokwa ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke March 2005, peeji nke 4.
Nkeji 15: Jikere Inye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọktoba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ndị ahụ nye ha magazin ndị ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ha. Ebe ọ bụ na Teta! Ọktoba–Disemba bụ Teta! pụrụ iche, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ụdị ndị magazin ahụ ga-amasị nakwa otú a ga-esi hụ na e kesara ya nke ọma n’ókèala unu. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 41 na Ekpere