Ilu
2 Ka onye ọzọ* too gị, ejila ọnụ gị eto onwe gị.
Ka ndị ọzọ* too gị, etola onwe gị.+
5 Ọ ka mma ịbara mmadụ mba n’ihu ọha kama ịhụ mmadụ n’anya ma ghara igosi ya na a hụrụ ya n’anya.+
6 Ọnyá ezigbo enyi mmadụ na-emepụ ya dị mma+
Karịa ọnụ onye kpọrọ mmadụ asị na-esusu ya ọtụtụ ugboro.*
7 Onye afọ juru enweghịdị ihe o ji ezigbo mmanụ aṅụ kpọrọ,*
Ma ihe na-elu ilu na-atọdị onye agụụ na-agụ ụtọ.
8 Nwoke hapụrụ ụlọ ya gbapụ
Dị ka nnụnụ fepụrụ n’akwụ́ ya.
9 Mmanụ na ihe na-esi ísì ọma* na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ.
Ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-emekwa ka obi dị enyi ya ụtọ.+
10 Ahapụla enyi gị ma ọ bụ enyi nna gị,
Abanyekwala n’ụlọ nwanne gị n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị gị.
Onye agbata obi nke nọ nso ka nwanne nke nọ n’ebe dị anya mma.+
12 Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo.+
Ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.
13 Chịrị uwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nara onye ọ na-amaghị n’ibé.
Nara ya ihe ibé ma ọ bụrụ nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* ka ọ nara n’ibé.+
14 Ọ bụrụ na mmadụ ejiri olu dara ụda na-agọzi mmadụ ibe ya n’isi ụtụtụ,
A ga-ewere ya na ọ na-abụ onye ahụ ọnụ.
15 Nwaanyị nke na-esekarị okwu dị ka elu ụlọ nke na-ehi mmiri n’akwụsịghị akwụsị n’ụbọchị mmiri na-ezo.+
16 Onye ọ bụla nke ga-ejiteli nwaanyị ahụ ga-ejideli ifufe,
Ọ ga-ejidelikwa mmanụ n’aka nri ya.
19 Otú ahụ mmadụ na-ahụ ihu ya ma o lee anya na mmiri
Ka mmadụ na-eji ihe dị ya n’obi amata ihe dị mmadụ ibe ya n’obi.
21 Otú ahụ a na-eji ite na ọkụ anụcha ọlaọcha na ọlaedo+
Ka a na-eji otuto a na-eto mmadụ amata ụdị onye ọ bụ.
22 Ọ bụrụgodị na i jiri ọdụ sụrie onye nzuzu
Otú e si asụri ọka n’ikwe,
Nzuzu ya agaghị apụ ya apụ n’ahụ́.
23 I kwesịrị ịma ìgwè atụrụ gị nke ọma.
Na-elekọta atụrụ gị nke ọma,*+
24 N’ihi na akụnụba anaghị adịru mgbe ebighị ebi,+
Okpueze anaghịkwa adịru ọgbọ niile.
25 Ahịhịa na-akpọnwụ, ahịhịa ọhụrụ epupụta,
A na-egbutekwara anụmanụ ahịhịa ndị dị n’ugwu.
26 Ị na-esi n’ebule enweta uwe gị,
A na-ejikwa mkpi akwụ ụgwọ ala.
27 A ga-enwekwa mmiri ara ewu ga-ezuru gị
Na ndị ezinụlọ gị nakwa ụmụ agbọghọ na-ejere gị ozi.