Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 3/8 p. 4-7
  • Ihe Mere E Kwesịrị Iji Kwurịta Banyere Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere E Kwesịrị Iji Kwurịta Banyere Ya
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zere Nghọtahie
  • Eziokwu—Ọ̀ Dị Ọha Mma Ka Ọ Bụ na Ọ Dịghị?
  • Ụzọ Isi Chọta Ụzọ Ziri Ezi
  • Ndị Ozizi Hà Dị Mkpa?
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Filip Emee Onye Ọchịchị Etiopia Baptism
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 3/8 p. 4-7

Ihe Mere E Kwesịrị Iji Kwurịta Banyere Ya

“Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.”—Ilu 27:17, Bible.

A DỊGHỊ amụcha ihu mma site n’ịkụkọta ya na ọzọ. Ịmụcha ihe bụ usoro na-aga nwayọọ nwayọọ karị. N’otu aka ahụ, e nwere ụzọ ndị ziri ezi na ndị na-ezighị ezi isi jiri mkparịta ụka mụchaa uche, karịsịa n’isiokwu ndị chọrọ akọ dị ka nke okpukpe.

Iji malite, anyị aghaghị ịsọpụrụ ùgwù onye nke ọzọ ma gosi nsọpụrụ ahụ n’okwu na n’omume anyị. “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Kọlọsi 4:6) Okwu e ji amara ekwu na nke dị ka e tinyere ya nnu abụghị nke e ji ikwesị olu ike ekwu, ọbụna mgbe o doro onye na-ekwu ya anya na ya na-ekwu ihe ziri ezi nakwa na nke onye nke ọzọ ezighị ezi.

A na-egosipụtakwa amara n’ụzọ anyị si ege ntị. Anyị agaghị abụ ndị ji amara na-ege ntị ma ọ bụrụ na anyị na-anapụ onye ọzọ okwu n’ọnụ ma ọ bụ ọ bụrụ na uche anyị adịghị n’ihe ọ na-ekwu n’ihi na anyị na-eche ihe ọzọ anyị ga-eji rụọ ụka. O yikarịrị ka onye ahụ na-ekwu okwu ọ̀ ga-achọpụta enweghị mmasị anyị pụtara ìhè n’echiche ya ma ikekwe kwụsị nkwurịta okwu ahụ. Ọzọkwa, anyị ekwesịtụghị ịmanye onye ọzọ ma ọ bụ kakwasị ya anya ịgbanwe echiche ya. E kwuwerị, ọ bụ ‘Chineke na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu na-aba ụba’ n’obi nke onye na-ege ntị na-anabata ihe.—1 Ndị Kọrint 3:6.

Anyị nwere ezi ihe nlereanya nke Pọl onyeozi, bụ́ onye jiri ‘ntụgharị uche’ na ‘ime ka e kwenye’ mee ihe n’ozi ya. (Ọrụ 17:17, NW; 28:23, 24) Pọl so ndị mmadụ kwurịta banyere okpukpe n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ha, dị ka n’ọmà ahịa na n’ebe obibi ha. (Ọrụ 17:2, 3; 20:20) Ndịàmà Jehova na-agbalị iṅomi ihe nlereanya ahụ site n’ịga n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ndị mmadụ na isoro ha na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ.

Zere Nghọtahie

Mba Israel ka malitesịrị ibi n’Ala Nkwa ahụ mgbe nghọtahie banyere otu ebe ịchụàjà fọrọ nke nta ka o duba ha n’agha obodo. Ndị bi n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan wuru ebe ịchụàjà, ma ebo ndị nke ọzọ chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ ebe ịchụàjà maka ofufe ụgha. N’ihi ya, ha jikeere ije agha iji dọọ ụmụnne ha aka ná ntị. Ma e ji amamihe mee ihe. Ndị ahụ gaje ime mwakpo buru ụzọ zipụ ndị nnọchiteanya ije jụta ihe mere e ji wuo ebe ịchụàjà ahụ. N’ụzọ wetaara ha nnọọ obi iru ala, ha chọpụtara na ọ bụ nanị ihe ncheta—“ihe àmà”—iji na-echetara ebo ahụ nile banyere ịdị n’otu ha n’ihu Jehova Chineke. Nkwurịta okwu gbochiri esemokwu—zọpụtakwa ọtụtụ mmadụ!—Joshua 22:9-34.

N’otu aka ahụ, taa nghọtahie na-akpatakarị enweghị ezi mmekọrịta na ọbụna ajọ mbunobi. Dị ka ihe atụ, mmadụ ole na ole elewo Ndịàmà Jehova anya dị ka ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè n’ihi akụkọ banyere ọjụjụ ha na-ajụ ịnara mmịnye ọbara. Ma ndị jụworo Ndịàmà ajụjụ n’onwe ha banyere okwu a enwewo mgbe mgbe ihe ịtụnanya na-enye obi ụtọ ịchọpụta na e nwere ihe ndabere sitere na Bible maka nguzo ha nakwa na e nwere ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ na-adịghị ize ndụ, ndị dị irè. (Levitikọs 17:13, 14; Ọrụ 15:28, 29) N’ezie, n’ihi nsogbu ndị dị n’inye ọbara, otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Ekele dịrị Chineke na Ndịàmà Jehova kwụ n’ihu ná nchọpụta a na-eme maka ihe ndị e ji edochi anya ọbara.”

N’otu aka ahụ, ụfọdụ ajụwo isoro Ndịàmà kwurịta okwu n’ihi na a gwawo ha na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jisọs Kraịst. Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ ụgha! N’ezie, Ndịàmà na-emesi òkè Jisọs na-ekere ná nzọpụta anyị ike, na-akọwa na ọ bụ Ọkpara Chineke, onye Chineke zitere n’ụwa ịgbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie na n’ọnwụ. Site n’isoro Ndịàmà kwurịta banyere okwu a, e wepụwo nghọtahie ndị mmadụ nwere.—Matiu 16:16; 20:28; Jọn 3:16; 14:28; 1 Jọn 4:15.

Eziokwu—Ọ̀ Dị Ọha Mma Ka Ọ Bụ na Ọ Dịghị?

Ikekwe ihe na-eju ọtụtụ anya bụ na mgbe a bịara n’ihe banyere okpukpe, ụzọ nke dị ọha mma na-abụkarị nke na-ezighị ezi. Jisọs Kraịst n’onwe ya kụziri, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14.

N’ụbọchị Noa, ọ bụ nanị mmadụ asatọ kwuru eziokwu ime mmụọ—Noa, nwunye ya, ụmụ ya ndị nwoke atọ, na ndị nwunye ụmụ ya. Obi abụọ adịghị ya na ozi ịdọ aka ná ntị ha na ọrụ ha nke iwu ụgbọ mere ka ha ghọọ ndị a na-akwa emo, ọbụna ndị a na-ekwutọ. Ma e menyeghị Noa na ezinụlọ ya ụjọ; ha gara n’ihu na-eme nkwusa ma na-ewu ihe. (Jenesis 6:13, 14; 7:21-24; 2 Pita 2:5) N’otu aka ahụ, ọ bụ nanị mmadụ atọ rubere isi ná nduzi Chineke ma lanarị mbibi nke Sọdọm na Gọmọra.—Jenesis 19:12-29; Luk 17:28-30.

Gịnị banyere oge anyị? “A sị na Kraịst ga-alọghachi n’anụ ahụ taa, ma eleghị anya ndị mmadụ ga-egbu ya ọzọ,” ka otu onye nwe ụlọ gwara otu n’ime Ndịàmà Jehova. Onye a chere na ozizi na ụkpụrụ omume dị elu nke Jisọs ga-abụ nke na-adịghị ọha mma dị ka ha na-adịghị ha n’afọ 2,000 gara aga. Ì kwere?

Ọ bụrụ otú ahụ, i ziri ezi, n’ihi na Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m”—amụma ghọworo eziokwu. (Matiu 24:9) Ndị ndú ndị Juu nọ na Rom gwara Pọl onyeozi banyere Iso Ụzọ Kraịst, sị: “Banyere ịrọ òtù a, . . . a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Otú ọ dị, Iso Ụzọ Kraịst ịbụ nke na-adịghị ọha mma egbochighị ụmụazụ Kraịst isoro ndị ọzọ kerịta nkwenkwe ha. O gbochighịkwa ndị nwere obi eziokwu ikwusara ndị Kraịst okwu.—Ọrụ 13:43-49.

Taa ozi Jisọs dị mkpa karịa ka ọ dịtụrụla. N’ihi gịnị? N’ihi na ọnọdụ ụwa na-egosi na anyị na-ebi ugbu a na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a nakwa na ụbọchị ndị a ga-ejedebe ná mkpochapụ nke ihe ọjọọ n’ụwa. Jisọs jiri oge anyị tụnyere ụbọchị Noa. (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:37-39) Ya mere ugbu a abụghị oge anyị ga-eji nkwenkwe anyị kpọrọ ihe dị nta, n’ihi na ọ bụ nanị ndị ma Chineke na ndị ‘na-akpọ isi ala nye ya n’ime mmụọ na eziokwu’ ka a ga-enye ndụ ebighị ebi.—Jọn 4:24; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.

Ụzọ Isi Chọta Ụzọ Ziri Ezi

Francis Bacon bụ́ onye England biri ndụ na narị afọ nke 17, bụ́ onye ọkà ihe ọmụma, onye edemede, ọkàiwu, na onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị, dụrụ ndị na-achọ eziokwu ọdụ “iji nlezianya tụlee ihe ma chebara ya echiche.” Otu n’ime ndị president mbụ nke United States, bụ́ Thomas Jefferson kwuru, sị: “Ntụgharị uche na nnwere onwe ịjụta ihe ọmụma bụ nanị ihe ndị dị iré n’igbochi imehie ihe. . . . Ha na imehie ihe adịghị agakọ.” Ya mere ọ bụrụ na anyị na-achọ eziokwu n’ezie, anyị ga-eji “nlezianya tụlee ihe ma chebara ya echiche,” gbasookwa “ntụgharị uche na nnwere onwe ịjụta ihe ọmụma.”

N’igosipụta ihe mere ụzọ dị otú ahụ ji dị mkpa, ọkà mmụta sayensị si Britain, bụ́ Sir Hermann Bondi kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọ karịsịa otu nkwenkwe pụrụ ịbụ eziokwu, n’ihi ya o yikarịsịrị ka ụmụ mmadụ hà ga-eji obi eziokwu kwenyesie ike n’ihe na-abụghị eziokwu n’ihe banyere okpukpe e kpughere ekpughe. Mmadụ ga-atụworị anya ka eziokwu a doro anya duje n’inwetụ obi umeala, n’inwe echiche nke bụ na n’agbanyeghị ókè okwukwe mmadụ dịruru omimi, mmadụ pụrụ ihie ụzọ dị ka a pụrụ iche n’echiche.”

Ya mere, olee otú mmadụ pụrụ isi mata ma ọ nọ n’ezie ‘n’ụzọ ahụ dị mkpagide, nke na-eduba ná ndụ’? Jisọs kụziri na a ghaghị ịkpọ isiala nye Chineke ‘n’eziokwu.’ Ya mere ọgụgụ isi na-eme ka mmadụ kwubie na ọ bụrụ na ozizi abụọ na-emegiderịta ibe ha, ha abụọ apụghị ịbụcha eziokwu. Dị ka ihe atụ, ma ọ́ bụghị na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị ọ bụrụ na ha enweghị. Ma ọ́ bụghị na Chineke gaje itinye aka n’ihe omume mmadụ ọ bụrụ na ọ gaghị etinye. Ma ọ́ bụghị na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu ọ bụrụ na ọ bụghị. Ndị na-achọ eziokwu chọrọ ezi azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ dị mkpa. Ndịàmà Jehova kweere na Chineke enyewo anyị azịza ha n’Okwu ya, bụ́ Bible.a

Ebe “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta,” ụzọ bụ́ isi isi nwapụta ozizi dị iche iche bụ iji Bible tụọ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (2 Timoti 3:16) N’ime otú ahụ, ị ‘na-anwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.’ (Ndị Rom 12:2) Ị̀ pụrụ ‘ịnwapụtara onwe gị’ na nkwenkwe gị gbakwasịrị ụkwụ na Bible? Inwe ike ime otú ahụ dị mkpa n’ihi na Chineke achọghị ka e duhiekọta gị na “ụwa nile mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9.

Ndị Ozizi Hà Dị Mkpa?

Jisọs enyefeghị ndị na-eso ụzọ ya akwụkwọ mpịakọta ole na ole ma sị ha: “Azịza nye ajụjụ unu dịcha n’ime ha. Laanụ gaa gụọ ha n’onwe unu.” Kama nke ahụ, o jiri ndidi na obiọma kụziere ha okwu Chineke. N’aka nke ha, ndị nabatara ozizi ya ṅomiri ụzọ o si eme ihe mgbe ha kụzikwaara ndị ọzọ ihe. Were dị ka ihe atụ Filip onye na-eso ụzọ. Ọ gwara onye ọrụ ọchịchị Etiopia nwere obi eziokwu okwu bụ́ onye marawooro ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ tupu mgbe ahụ site ná mmekọrịta nke ya na ndị Juu. Ma enyemaka dị nwoke ahụ mkpa. Ya mere a gwara Filip—onye nnọchiteanya nke ọgbakọ ndị Kraịst—ka ọ gaa nyere ya aka. A sị na onye ọrụ ọchịchị a adịghị njikere ikwurịta banyere okpukpe, ọ garaghị amụta ihe banyere òkè Jisọs na-ekere ná nzube Chineke. Lee ezi ihe nlereanya onye Etiopia a bụ nye ndị nile na-achọ eziokwu!—Ọrụ 8:26-39.

Ị̀ dị njikere ikwurịta banyere nkwenkwe gị ma jụọ ajụjụ dị ka onye Etiopia a mere? N’ezie i nwere ọtụtụ uru ị ga-erite site n’ime otú ahụ. Obi na-adị Ndịàmà Jehova ụtọ isoro ndị mmadụ kwurịta banyere Bible bụ́ ndị ji ezi obi na-achọ ịmata ihe ọ na-ekwu. Ndịàmà adịghị agwa ndị mmadụ echiche nke aka ha. Kama nke ahụ, ha na-agbalị igosi ndị mmadụ ihe Bible n’onwe ya na-ekwu.

Onye ọrụ ọchịchị Etiopia ahụ mụtara ihe ụfọdụ pụrụ iche banyere Jisọs Kraịst, dị ka otú Chineke ga-esi jiri ya mee ihe n’ihe metụtara nzọpụta anyị. Taa, mmezu nke nzube Chineke na-abịaru nso karị. Ihe ndị dị egwu, dị ebube gaje ime kpọmkwem n’ụwa ebe a. Isiokwu na-esonụ ga-egosi na ọ ga-emetụta mmadụ nile nọ n’ụwa. Otú ọ dị, otú ọ ga-esi metụta anyị ga-adabere n’àgwà anyị na n’ihe anyị na-eme.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ihe àmà iji gosi na Bible bụ Okwu Chineke, biko lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 7]

Onye ọrụ ọchịchị Etiopia nabatara nkwurịta okwu Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya