Ha Mere Uche Jehova
Filip Emee Onye Ọchịchị Etiopia Baptism
KA Ọ nọ n’elu ụgbọ ịnyịnya ya, otu onye Etiopia ji oge ya na-eme ihe bara uru. Ọ nọ na-agụ ihe n’olu dara ụda—omume a na-ahụkarị n’etiti ndị njem narị afọ mbụ. Nwoke a bụ onye ọchịchị “dị ike nke ukwuu n’okpuru Kandesi, eze nwanyị ndị Etiopia.”a Ọ bụ “onye isi akụ̀ ya nile”—ya bụ, ọ bụ minista okwu ego dị n’aka. Onye ọchịchị a nọ na-agụ ihe site n’Okwu Chineke iji nweta ihe ọmụma.—Ọrụ 8:27, 28.
Filip onye na-ezisa ozi ọma nọ nso. Otu mmụọ ozi eduziwo ya gaa n’ebe ahụ, ugbu a kwa a gwara ya, sị: “Jekwuru ụgbọ ala ahụ, nọnyabakwa ya nso.” (Ọrụ 8:26, 29) Anyị pụrụ iche n’echiche Filip ịjụ onwe ya, sị, ‘Ònye bụ nwoke a? Gịnị ka ọ na-agụ? N’ihi gịnị ka e ji duje m n’ebe ọ nọ?’
Ka Filip nọ na-agba n’akụkụ ụgbọ ịnyịnya ahụ, ọ nụpeere ka onye Etiopia ahụ na-agụ okwu ndị a: “E sekpụụrụ Ya, dị ka atụrụ, jee ogbugbu; dị ka nwa atụrụ dakwara ogbi n’ihu onye na-akpacha ya ajị́, otú a ka Ọ na-adịghị asaghe ọnụ Ya: e wepụrụ ikpe Ya n’ime ọnọdụ Ya dị ala: ònye ga-akọ ọgbọ Ya? N’ihi na a na-ewepụ ndụ Ya n’ụwa.”—Ọrụ 8:32, 33.
Filip matara akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ ozugbo. O sitere n’ihe odide Aịsaịa. (Aịsaịa 53:7, 8) Ihe onye Etiopia ahụ na-agụ gbagwojuru ya anya. Filip malitere nkwurịta okwu site n’ịjụ, sị: “Ị̀ na-amata ihe ị na-agụ?” Onye Etiopia ahụ zara, sị: “M̀ ga-esi aṅaa pụ ịmata, ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-edu m?” Ọ rịọziri Filip ka o sonyere ya n’ụgbọ ịnyịnya ya.—Ọrụ 8:30, 31.
“Gịnị Na-anapụ Ime M Baptism?”
“Arịọ m gị,” ka onye Etiopia a gwara Filip, “ònye ka onye amụma nke a na-ekwu okwu a banyere? ọ̀ bụ ya onwe ya ma ọ bụ onye ọzọ dị iche?” (Ọrụ 8:34) Mgbagwoju anya nke onye Etiopia ahụ ejughị anya, n’ihi na ịmata onye “atụrụ,” ma ọ bụ “ohu,” nke amụma Aịsaịa ahụ bụ abụrụwo ihe omimi eri ogologo oge. (Aịsaịa 53:11) Lee otú nke a na-aghaghị isiworị doo anya mgbe Filip kwusaara onye Etiopia ahụ “ozi ọma Jisọs”! Mgbe nwa oge gasịrị, onye Etiopia ahụ sịrị: “Lee, mmiri; gịnị na-anapụ ime m baptism?” Ya mere Filip mere ya baptism ozugbo ahụ.—Ọrụ 8:35-38.
Nke a ọ̀ bụ ihe e mere ọkụ ọkụ? Ọ dịghị ma ọlị! Onye Etiopia ahụ bụ onye na-eso ụzọ ndị Juu.b Ya mere ọ bụrụworị onye na-efe Jehova nke nwere ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ, tinyere amụma dị iche iche banyere Mesaịa ahụ. Otú ọ dị, ihe ọmụma ya ezughị ezu. Ugbu a o nwetaworo ihe ọmụma dị mkpa banyere òkè Jisọs Kraịst na-ekere, onye Etiopia ahụ ghọtara ihe Chineke chọrọ ya n’aka, ọ dịkwa njikere ime ya. Baptism kwesịrị ekwesị.—Matiu 28:18-20; 1 Pita 3:21.
Mgbe nke a gasịrị, “Mmụọ nke Onyenwe anyị wepụrụ Filip.” Ọ gara n’ebe ọzọ e kenyere ya ọrụ. Onye Etiopia ahụ nọ “na-aga n’ụzọ ya na-aṅụrị ọṅụ.”—Ọrụ 8:39, 40.
Ihe Mmụta Nye Anyị
Dị ka ndị ohu Jehova n’oge a, anyị nwere ibu ọrụ inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmụta eziokwu nke Okwu Chineke. Ọtụtụ ndị enwewo ihe ịga nke ọma n’ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ mgbe ha na-eme njem ma ọ bụ n’ọnọdụ mberede ndị ọzọ. N’ihi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, kwa afọ ọtụtụ narị puku na-egosipụta nraranye ha nye Jehova Chineke site n’ịbụ ndị e mere baptism.
Otú ọ dị, e kwesịghị ịkwabanye ndị ọhụrụ ime baptism ọkụ ọkụ. Ha aghaghị ibu ụzọ nweta ezi ihe ọmụma nke Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst. (Jọn 17:3) Mgbe ahụ ha aghaghị ichegharị, na-ahapụ àgwà ọjọọ ma chigharịa iji kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke. (Ọrụ 3:19) Nke a na-ewe oge, karịsịa ma ọ bụrụ na echiche na àgwà na-ezighị ezi agbamiwo mkpọrọgwụ. Ọ bụ ezie na ndị ọhụrụ kwesịrị ịgụkọ ihe ịbụ onye na-eso ụzọ ndị Kraịst ga-efu, ngọzi dị ukwuu na-apụta site n’isoro Jehova Chineke banye ná mmekọrịta a raara nye. (Tụlee Luk 9:23; 14:25-33.) Ndị bụ Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-eduga ndị ọhụrụ dị otú ahụ ná nzukọ nke Chineke na-eji emezu uche ya. (Matiu 24:45-47) Dị ka onye Etiopia ahụ, ndị a ga-aṅụrị ọṅụ n’ịmụta banyere ihe Chineke chọrọ ha n’aka na ime ihe kwekọrọ na ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Kandesi” abụghị aha kama utu aha (nke yiri “Fero” na “Siza”) nke e ji mee ihe banyere usoro ndị eze nwanyị Etiopia.
b Ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ ndị na-abụghị ndị Israel bụ́ ndị họọrọ ịrapara n’Iwu Mosis.—Levitikọs 24:22.
[Igbe dị na peeji nke 8]
N’ihi Gịnị Ka E Ji Kpọọ Ya Ọnozi?
N’ime ihe nile e dekọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 8, e zoro aka n’ebe onye Etiopia ahụ nọ dị ka “ọnozi.” Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Iwu Mosis anabataghị nwoke ọ bụla a pịrị amụ n’ime ọgbakọ, ihe àmà na-egosi na nwoke a abụghị ọnozi n’ụzọ nkịtị. (Deuterọnọmi 23:1) Okwu Grik maka “ọnozi” pụrụ izo aka n’ebe onye nọ n’ọkwá ukwu nọ. N’ihi ya, onye Etiopia ahụ bụ onye ọchịchị nọ n’okpuru eze nwanyị Etiopia.