Filip—Onye Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Zisaa Ozi Ọma
AKWỤKWỌ NSỌ nwere ọtụtụ ihe ndekọ banyere ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị okwukwe ha kwesịrị nṅomi. Tụlee ihe banyere Filip, bụ́ onye Kraịst bụ́ onye ozi ala ọzọ na narị afọ mbụ. Ọ bụghị onyeozi, ma e ji ya mee ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ. N’ezie, Filip ghọrọ onye a maara dị ka “onye na-ezisa ozi ọma.” (Ọrụ 21:8) N’ihi gịnị ka Filip ji nweta aha ahụ? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta n’aka ya?
Filip pụtara n’ihe ndekọ Bible n’oge na-adịghị anya mgbe Pentikọst 33 O.A., gasịrị. N’oge ahụ, ndị Juu na-asụ Grik malitere ịtamu ntamu megide ndị Juu na-asụ Hibru, na-azọrọ na a na-elefuru ndị inyom ha di ha nwụrụ anya ná nri a na-eke kwa ụbọchị. Iji dozie nsogbu ahụ, ndị ozi họpụtara ‘ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà.’ Filip so ná ndị a họpụtara.—Ọrụ 6:1-6.
Ndị ikom asaa a bụ ndị ‘a gbaara ezi àmà.’ Nsụgharị nke James Moffatt na-asị na ha bụ “ndị nwere ezi aha.” Ee, n’oge a họpụtara ha, a marala ha ịbụ ndị ikom ime mmụọ bụ́ ndị nwere ikike iche echiche bara uru. Otú ahụ ka ọ dị taa n’ebe ndị na-eje ozi dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta nọ. A dịghị ahọpụta ndị ikom dị otú ahụ ọkụ ọkụ. (1 Timoti 5:22) Ha aghaghị inwe “àmà dị mma site n’ọnụ ndị nọ n’èzí,” ndị Kraịst ibe ha kwesịkwara ịma na ha nwere ezi uche na uche zuru okè.—1 Timoti 3:2, 3, 7; Ndị Filipaị 4:5.
Ihe àmà na-egosi na Filip rụrụ ọrụ e nyere ya na Jerusalem nke ọma. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ tiwapụrụ ma chụsasịa ụmụazụ Kraịst. Dị ka ndị ọzọ, Filip hapụrụ obodo ahụ, ma ozi ya akwụsịbeghị. N’oge na-adịghị anya, ọ nọ na-eme nkwusa n’ókèala ọhụrụ—Sameria.—Ọrụ 8:1-5.
Imeghe Ókèala Ndị Ọhụrụ
Jisọs ebuworị n’amụma na ndị na-eso ụzọ ya ga-eme nkwusa “n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Site n’ime nkwusa n’ime Sameria, Filip nọ na-ekere òkè n’imezu okwu ndị ahụ. Ndị Juu n’ozuzu ha na-eleda ndị Sameria anya. Ma Filip enweghị ajọ mbunobi n’ebe ndị a nọ, a gọzikwara omume ya nke eleghị mmadụ anya n’ihu. N’ezie, e mere ọtụtụ ndị Sameria baptism, gụnyere onye na-emebu mgbaasị nke aha ya bụ Saịmọn.—Ọrụ 8:6-13.
Ka oge na-aga, mmụọ ozi Jehova gwara Filip ka ọ gaa n’ụzọ ọzara si Jerusalem gaa Geza. N’ebe ahụ Filip hụrụ ụgbọ ịnyịnya nke bu onye ọrụ ọchịchị Etiopia bụ́ onye na-agụ amụma Aịsaịa n’olu dara ụda. Filip gbakwuuru ụgbọ ịnyịnya ahụ ma malite mkparịta ụka. Ọ bụ ezie na onye Etiopia ahụ bụ onye na-eso ụzọ ndị Juu nke nwere ihe ọmụma ụfọdụ banyere Chineke na Akwụkwọ Nsọ, o ji obi umeala kweta na enyemaka dị ya mkpa iji ghọta ihe ọ na-agụ. N’ihi ya, ọ kpọrọ Filip òkù ịbata n’ụgbọ ịnyịnya ahụ ma soro ya nọdụ. Mgbe a gbasịịrị ya àmà, ha rutere ná mmiri. “Gịnị na-anapụ ime m baptism?” ka onye Etiopia ahụ jụrụ. Filip mere ya baptism ozugbo, onye Etiopia ahụ gawakwara ebe ọ na-aga na-aṅụrị ọṅụ. Ma eleghị anya, onye ọhụrụ a na-eso ụzọ gbasara ozi ọma ahụ n’ala a mụrụ ya.—Ọrụ 8:26-39.
Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ozi Filip nke metụtara ndị Sameria na onye ọrụ ọchịchị Etiopia ahụ? Anyị ekwesịghị iche ma ọlị na mmadụ ndị si ná mba, agbụrụ, ma ọ bụ ndị nwere ọkwá ụfọdụ, agaghị enwe mmasị n’ozi ọma ahụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ikwusara “mmadụ nile” ozi Alaeze ahụ. (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị site n’ime nkwusa nye mmadụ nile, Jehova pụrụ iji anyị mee ihe n’ọrụ ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ’ tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a eruo.—Matiu 28:19, 20.
Ihe Ùgwù Ndị Ọzọ Filip Nwere
Mgbe o mesịrị nkwusa nye onye ọrụ ọchịchị Etiopia ahụ, Filip gbara àmà n’Azotọs, “mgbe ọ na-agabiga ọ na-ezisakwa ozi ọma gwa ndị obodo ahụ nile, ruo mgbe ọ bịaruru Sizarịa.” (Ọrụ 8:40) Na narị afọ mbụ, ọnụ ọgụgụ ndị Jentaịl bi n’obodo abụọ a hiri nnọọ nne. Mgbe ọ na-aga n’ebe ugwu iji ruo Sizarịa, o yikarịrị ka Filip ò mere nkwusa n’ógbè ndị Juu a ma ama, dị ka Lida na Jọpa. Ikekwe ọ pụrụ ịbụ ya mere e ji mesịa nwee ike inweta ndị na-eso ụzọ n’ebe ndị a.—Ọrụ 9:32-43.
Mgbe ikpeazụ e kwutere okwu banyere Filip bụ n’ihe dị ka afọ 20 mgbe e mesịrị. N’ọgwụgwụ nke njem ozi ala ọzọ nke atọ ya, Pọl kwụsịrị na Tọlemaịs. “Echi ya,” ka onye ya na Pọl so mee njem bụ́ Luk, na-ekwu, “anyị wee pụọ, jeruo Sizarịa: anyị wee baa n’ụlọ Filip onye na-ezisa ozi ọma.” N’oge a, Filip nwere “ụmụ nwanyị anọ, ndị na-amaghị nwoke, ndị na-ebu amụma.”—Ọrụ 21:8, 9.
Ihe àmà na-egosi na Filip ebirila na Sizarịa. Ma mmụọ ozi ala ọzọ ya efunahụbeghị ya, n’ihi na Luk kpọrọ ya “onye na-ezisa ozi ọma.” Okwu a na-akọwakarị onye hapụrụ ebe obibi ya iji kwusaa ozi ọma n’ógbè ndị a na-akpabeghị aka. Eziokwu ahụ bụ́ na Filip nwere ụmụ nwanyị anọ na-ebu amụma na-enye echiche na ha gbasoro nzọụkwụ ịnụ ọkụ n’obi nke nna ha.
Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst n’oge a kwesịrị icheta na ụmụ ha bụ ndị na-eso ụzọ kasị mkpa ha nwere. Ọ bụrụgodị na ndị nne na nna dị otú ahụ abụrụwo ndị na-aghaghị ịhapụ ihe ùgwù ụfọdụ nke ọchịchị Chineke n’ihi ibu ọrụ ezinụlọ, dị ka Filip ha pụrụ ịnọgide na-abụ ndị ji obi ha dum na-ejere Chineke ozi na ndị nne na nna na-esetịpụ ezi ihe nlereanya.—Ndị Efesọs 6:4.
Nleta Pọl na ndị ibe ya letara ezinụlọ Filip nyere ezinụlọ ahụ ohere mara mma iji lee ọbịa. Cheedị banyere mgbarịta ume ha nwere! Ikekwe ọ bụ n’oge a ka Luk nwetara akụkọ zuru ezu banyere ọrụ Filip, bụ́ ndị o mesịrị dekọọ n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 6 na 8.
Jehova Chineke jiri Filip mee ihe n’ụzọ sara mbara iji mee ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu. Ịnụ ọkụ n’obi Filip nyeere ya aka ịgbasa ozi ọma ahụ n’ókèala ndị ọhụrụ na ịkwalite ọnọdụ ime mmụọ dị mma n’ụlọ ya. Ị̀ ga-enwe mmasị inwe ihe ùgwù na ngọzi ndị yiri nke ahụ? Mgbe ahụ, ị ga-eme nke ọma iṅomi àgwà ndị Filip onye na-ezisa ozi ọma gosipụtara.