Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/04 p. 4
  • Na-egosipụta Mmụọ Ịsụ Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-egosipụta Mmụọ Ịsụ Ụzọ
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Filip—Onye Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Zisaa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Izisa “Ozi Ọma Banyere Jizọs”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Malite Ya Ka Mkparịta Ụka Nkịtị
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 8/04 p. 4

Na-egosipụta Mmụọ Ịsụ Ụzọ

1. Olee otú ị ga-esi akọwa mmụọ ịsụ ụzọ?

1 Ma hà pụrụ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ ka ọ dị ugbu a ma ọ bụ na ha apụghị ije, ndị nkwusa Alaeze nile pụrụ igosipụta mmụọ ịsụ ụzọ. Ha chọrọ n’ezie irube isi n’iwu ahụ e nyere nke bụ́ ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 18:5) Ha na-enwe ezi mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ ma na-achụ ọtụtụ ihe n’àjà iji jee ozi ha n’ụzọ zuru ezu. (Mat. 9:36; Ọrụ 20:24) Ndị ohu Jehova dị njikere ime ihe ọ bụla dị mkpa iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu ahụ. (1 Kọr. 9:19-23) Ka anyị tụlee ihe atụ nke otu onye gosipụtara mmụọ dị otú ahụ, Filip onye na-ezisa ozi ọma.

2. Olee otú ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ isi ṅomie ịnụ ọkụ n’obi Filip n’ozi ahụ?

2 Ime Nkwusa na Izi Ihe: Filip buru ibu ọrụ ndị siri ike n’ọgbakọ narị afọ mbụ. (Ọrụ 6:1-6) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ nnọọ onye nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi. (Ọrụ 8:40) Ya mere taa, ka ha na-arụ ọrụ e nyere ha, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ igosipụta mmụọ ịsụ ụzọ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-edu ndú n’ozi ahụ. Lee ka nke a si eme ka mmụọ e nwere n’ọgbakọ dịkwuo ike!—Rom 12:11.

3. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta mmụọ ịsụ ụzọ mgbe anyị na-eche ule ihu?

3 Mgbe Stivin nwụsịrị, a kpagburu ndị ahụ na-eso ụzọ n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Otú ọ dị, Filip nọgidere na-eme nkwusa, ọ bụkwa n’aka ya ka e si mee ka ndị Sameria malite ịrụ ọrụ ahụ. (Ọrụ 8:1, 4-6, 12, 14-17) Anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya ya site n’ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ mgbe anyị na-eche ule ihu nakwa site n’ikwusara ndị anyị na-ezute ozi ọma ahụ n’eleghị mmadụ anya n’ihu.—Jọn 4:9.

4. Olee ihe nlereanya nke Filip setịpụrụ dị ka onye ozizi?

4 A pụrụ ịhụ nkà izi ihe Filip dị ka onye ozizi nke Okwu Chineke n’ihe ndekọ banyere ntọghata nke ọnaozi Etiopia ahụ. (Ọrụ 8:26-38) Ịzụlite ikike nke iji Bible eme ihe na ‘ịtụgharị uche site n’Akwụkwọ Nsọ’ bụ́ nnọọ ụzọ ọzọ anyị si egosipụta mmụọ ịsụ ụzọ. (Ọrụ 17:2, 3) Dị ka Filip, anyị na-achọ ikwusa ozi ọma ahụ n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ndị mmadụ nakwa n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị.

5. Olee ihe pụrụ inyere ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst aka ịkụnye mmụọ ịsụ ụzọ n’obi ụmụ ha?

5 Ezinụlọ na Ọgbakọ: Obi abụọ adịghị ya na àgwà Filip nakwa ihe nlereanya ya nwere mmetụta dị mma n’ebe ụmụ ya ndị nwanyị nọ. (Ọrụ 21:9) N’otu aka ahụ, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị mere ka ndụ ha hiwe isi n’ihe ndị metụtara Alaeze, na-agba ụmụ ha ume ime otu ihe ahụ. N’agbanyeghị na ike gwụrụ ya n’ihi ọrụ ọ rụrụ n’izu, nne ma ọ bụ nna nke na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ pụrụ inwe mmetụta na-adịgide adịgide n’obi nwata.—Ilu 22:6.

6. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ekele maka ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ anyị?

6 Filip lere Pọl na Luk ọbịa, bụ́ Ndị Kraịst nụrụ ọkụ n’obi, ndị rụsikwara ọrụ ike n’ozi Jehova. (Ọrụ 21:8, 10) Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele nakwa nkwado anyị maka ndị na-anụ ọkụ n’obi taa? Ikekwe, anyị pụrụ iso ndị ọsụ ụzọ rụọ ọrụ n’ụtụtụ ma ọ bụ n’ehihie n’ụbọchị ndị ọ na-abụ nanị mmadụ ole na ole na-apụta ozi. (Fil. 2:4) Anyị pụkwara ịkpọ ha òkù ịbịa n’ebe obibi anyị maka inwe mkpakọrịta na-ewuli elu. Na-agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ anyị, ka anyị nile na-agbalịsi ike igosipụta mmụọ ịsụ ụzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya