Olileanya Ezi Okpukpe Na-enye
DỊ KA e si kee anyị ọ na-amasị anyị ikwurịta banyere ihe ndị na-echegbu anyị ma ọ bụ na-akpali anyị akpali. Nke a bụ otu ihe mere Ndịàmà Jehova ji enwe obi ụtọ isoro ndị ọzọ kerịta ozi dị ebube nke Bible. Ozi ahụ, nke na-ekwu banyere Alaeze Chineke, nwere azịza nye ajụjụ banyere ihe ndị na-echegbu ndị mmadụ taa n’ezie, dị ka ọdịnihu, nchebe, ahụ ike, na obi ụtọ.—Luk 4:43.
Ma tupu anyị agaa n’ihu, gịnị bụ Alaeze Chineke?
Olileanya Na-enye Obi Ụtọ
Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke nke Ọkpara ya, bụ́ “Onyeisi Udo” na-achị. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya . . . Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.”—Aịsaịa 9:6, 7.
N’ilemi anya n’ọdịnihu, ee, n’oge anyị n’akụkọ ihe mere eme na ndị ọchịchị ya, amụma Bible ọzọ kwuru, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Alaeze Chineke a nke Kraịst, bụ́ Onyeisi Udo, na-achị, ga-emezu ekpere ahụ Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe, nke bụ́: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe . . . Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Gịnị ka ọ ga-apụtara anyị pụtakwara ụwa mgbe Alaeze Chineke bịara? Tụlee nkwa ndị Jehova Chineke n’onwe ya kwere, dị ka e si dekọọ ha na Bible. E sere onyinyo ụfọdụ n’ime ha na peji ndị a.
Ozi Sitere n’Aka Chineke
E kwesịghị izochi nkwa ndị ahụ dị ebube dị n’Okwu Chineke ezochi, nke a na-eweghachikwa anyị n’okwu metụtara ikwurịta banyere okpukpe. Jisọs buru amụma na tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a eruo, ndị na-eso ụzọ ya ga-ebute ụzọ n’ikwusa banyere Alaeze Chineke: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 1:8.
Ọ bụ ozi a na-ekwu banyere Alaeze Chineke ka Ndịàmà Jehova na-akpọsa n’ụwa nile. A na-ebipụta magazin ya na nke a na-agakọ, bụ́ Ụlọ Nche, n’asụsụ 130, okwu ahụ bụ́ “Ikwupụta Alaeze Jehova” na-adịkwa n’ihu nke ọ bụla n’ime ihe karịrị nde magazin 22 a na-ebi ná mbipụta nke ọ bụla.
Dị ka onye maara ihe, ị chọrọ ime mkpebi ndị dabeere n’ihe ọmụma banyere ndụ gị. (Ilu 18:13) Ya mere, anyị na-akpọ gị òkù ka ị mụtakwuo ihe n’onwe gị banyere Alaeze dị ebube nke Chineke na ihe ọ pụrụ ịpụtara gị. Iji mezuo nke ahụ, ewezụgala onwe gị n’ikwurịta banyere Bible. Ọ dịghị nkwurịta okwu pụrụ inye ihe ọmụma, ịkpali mmasị, ịdịkwa mkpa karịa ya.—Jọn 17:3.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Nkwa nke Ụwa Paradaịs
Udo zuru ezu ga-ejupụta ụwa. “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.”—Abụ Ọma 72:7, 8.
Ọbụna a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.
A ga-enwe ahụ ike zuru okè ruo mgbe ebighị ebi. “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ndị mmadụ ga-ewu ma biri n’ụlọ nke aka ha. “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha.” —Aịsaịa 65:21.
Ihe oriri ga-ejupụta. “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16.