Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/1 p. 7-10
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iru Eru Ndị Karịrị Nke Mmadụ
  • Nzọụkwụ Ndị Na-eduje n’Udo
  • Ihe Ọzọ A Ga-eme
  • Ụwa nke Dị n’Udo
  • Olileanya nke Siri Ike
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/1 p. 7-10

Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?

EZIOKWU ahụ nke bụ na ụmụ mmadụ apụghị iweta udo ọ̀ pụtara na ọ dịghị mgbe anyị gaje inwe udo? Ee e. Dị nnọọ ka Setan, onye dị ike karịa anyị onwe anyị, bụ ihe mgbochi ikpeazụ e nwere nye udo n’elu ala, otú ahụ ka e nwekwara otu Onye nke dị ike ọbụna karịa Setan, onye ga-emesịa duru ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’inweta udo. Bible, bụ nke kọọrọ anyị banyere Setan, kọkwara banyere Onye nke a. Ọ sịrị: “Ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya [Onye Ndụmọdụ Dị Ebube, NW] Chineke nke bụ Dike, Nna nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo.” (Aịsaịa 9:6, 7) Ònye bụ Onyeisi Udo nke a? Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Jisọs Kraịst, ọ pụkwara iweta udo n’ihi na o ruru eru ime nke ahụ karịa anyị onwe anyị. Ọ̀ bụ n’ụzọ dịgasị anaa?

Iru Eru Ndị Karịrị Nke Mmadụ

Otu ihe bụ na Jisọs adịghị anwụ anwụ. N’eziokwu, ọ dịrị ndụ dị ka mmadụ, nwụọkwa ọnwụ ọchụchụ àjà. Ma a kpọlitere ya n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, ọ bụkwa n’ọnọdụ nke a ka ọ nọ wee ghọọ Onyeisi Udo. Ọ bụ ya mere otu amụma ji kwuo, sị: “Alaeze ya agaghị agwụkwa agwụ.” (Luk 1:32, 33) N’adịghị ka eze Ebe Ọwụwa Anyanwụ ahụ bụ Asoka, Jisọs ga-adị ndụ ebighị ebi iji hụ na ọ dịghị ndị nnọchianya na-erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ga-adị, bụ́ ndị ga-abịa imebisi ọrụ ya.

Ọzọkwa, Jisọs enweghị ntụpọ ọ bụla nke mmehie. Ọchịchị ya dabeere n’amamihe Chineke na ụkpụrụ ezi omume. Aịsaịa onye amụma buru amụma, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ ya n’ahụ ya, bụ mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; . . . ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba: kama ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe.” (Aịsaịa 11:2-4) N’eyighị ndị Europe nke oge gara aga, Jisọs agaghị echebe udo n’ụlọ nanị ịnọ na-ebu agha ná mba ndị ọzọ. N’okpuru ya, udo ga-adị n’eluigwe na n’ala nile.

N’ịga n’ihu, Jisọs nwere ike iweta udo. Amụma ahụ kwuru, sị: “Mmụọ nke Jehova [nwere] ọnọdụ ya n’ahụ ya, bụ mmụọ nke amamihe na nghọta.” Mmụọ nke a ka e ji kee eluigwe na ala tinyekwara oké ọrụ nile nke ezi omume ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible. Ọbụna oké onye mmegide ahụ, bụ Setan, enweghị ihe agha ọ bụla nke ga-enwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide ike nke mmụọ Chineke.

Nzọụkwụ Ndị Na-eduje n’Udo

Olee ụzọ Jisọs ga-esi duru ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’inweta udo? Ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe ijuanya ịmata na ọ maliteworị ime ya. N’akwụkwọ amụma ahụ bụ Mkpughe, a hụrụ ka Jisọs na-anata ọbụbụeze site n’aka Chineke n’Alaeze nke eluigwe. (Mkpughe 11:15) Ọ bụrụ na anyị atụlee amụma nile nke Bible nke ọma wee jiri ha tụnyere ihe ndị na-eme n’ime narị afọ nke anyị a, anyị na-ahụ na Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze dị ka Eze n’eluigwe laarị azụ na 1914. (Matiu 24:3-42) Nke ahụ bụ nzọụkwụ bụ isi n’iweta udo n’elu ala.

Ma ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, n’ihi gịnị ka Agha Ụwa Mbụ ahụ ji tiwapụ na 1914? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka narị afọ nke anyị a jiworo hụ agha ndị dị njọ karịa ndị ọ bụla a lụworo n’akụkọ ihe mere eme? Ọ bụ n’ihi na ihe mbụ Eze eluigwe ahụ mere bụ ịchụpụ Setan ruo mgbe ebighị ebi site n’eluigwe, wee tụda ya na gburugburu elu ala. Gịnị si na nke a pụta? Amụma ahụ na-akọ, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:7-12) Oké agha ndị a lụworo n’ime narị afọ nke anyị a nwere njikọ n’etiti ha na ọnụma nke Setan. Ma rịba ama: ọnụma Setan bụ ruo “nanị nwa oge.” Ọgba aghara ahụ ga-agabiga n’oge na-adịghị anya!

Ma tupu ọ gabiga, Onyeisi Udo ahụ na-eme nkwadebe ndị ọzọ dị mkpa maka udo. Iji malite, ụmụ mmadụ aghaghị ịma banyere nzube Chineke nke iweta udo site n’aka Kraịst. N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Jisọs buru amụma na n’oge anyị a, “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Iji mezuo nke a, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ahụ taa n’akụkụ nile nke ụwa.

Mgbe ahụ, aghaghị inye ndị obi ha ziri ezi ọzụzụ n’ụzọ nile nke udo. Bible kwere nkwa, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gi ga-abakwa ụba.” (Aịsaia 54:13) Ọtụtụ nde ndị obi ha ziri ezi na-anata ọzụzụ nke a ọbụna ugbu a.

Ihe Ọzọ A Ga-eme

Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na oge eruwo ugbu a maka nzọụkwụ ọzọ bụ isi n’usoro ahụ nke iweta udo. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ nke ọtụtụ ndị maara n’aha ya, ma nke ọ bụ nanị mmadụ ole na ole maara ihe bụ nzube ya n’ezie. Bible kpọrọ ya “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” ma ọ bụ Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) Ọtụtụ ndị na-eche echiche banyere Amagedọn dị ka agha nuklia nke ga-ebibi mmepeanya nile. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ọ bụ ihe Jisọs ga-eme n’onwe ya, bụ Onyeisi Ụdo ahụ, iji mezuo ihe ndị dị mkpa iji weta udo.

Nke mbụ, Amagedọn ga-ewepụ mmadụ nile ndị bụ ihe mgbochi nye udo. Amụma nke dị n’Abụ Ọma 37:10 na-asị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebị iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ.” Ee, Jisọs ga-ewepụ “onye na-emebị ịwu”—bụ́ ndị na-ebu agha, ndị omempụ, ndị na-eyi ọha egwu, tinyekwara ndị nile jụrụ ịnakwere Onyeisi Ụdo ahụ—sịte n’elu ala. Ọ gaghị abụkwa ihe ruuru ha ịnọgide na-adị ndụ n’elu mbara ala nke a.—Mkpughe 19:19-21.

Nke abụọ, n’Amagedọn, a gaje imezu amụma nke a nke Daniel: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) A ga-ekpochapụ ịkpa ókè nke mba dị iche iche, bụ́ ndị kpataworo agha ọtụtụ mgbe. N’ikpeazụ, a gaje inwe ọchịchị ụwa nke dị n’okpuru onye ọchịchị anyị pụrụ ịtụkwasị obi!

Olee mgbe Amagedọn ga-abịa? Bible ekwughị. Ma ihe ndị na-eme n’ụwa, bụ́ ndị na-emezu amụma, na-egosi na ọ ga-abụ n’oge na-adịghị nnọọ anya. Bible buru amụma doro anya banyere otu ihe omume nke ga-eme n’oge na-adịghị anya tupu ọ bịa. Pọl onyeozi sịrị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Mgbe ahụ, ozugbo e nwesịrị mbibi mberede ahụ nke ga-ejedebe n’Amagedọn, a gaje iwepụ ihe mgbochi kasị ukwuu nye udo. “Nanị nwa oge” nke Setan ga-agabiga, a ga-etinyekwa ya n’ọnọdụ ebe ọ na-apụghị ịkpata nsogbu ọzọ n’elu ala ebe a. (Mkpughe 20:1-3) Lee nnọọ ihe ntụrụ ndụ nke a ga-abụ!

Ụwa nke Dị n’Udo

Jiri anya nke uche gị lee ọnọdụ nke ga-adị n’oge ahụ. Onye ọbụ abụ buru amụma, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) Ndị a dị umeala n’obi ga-anọgide na-emezu ọmarịcha amụma nke Aịsaịa, bụ: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.

N’ikpeazụ, na nke mbụ ya eri oge Iden, mmadụ nile dị ndụ ga-enweta ọṅụ ná ngọzi Jehova Chineke, ọ ga-emezukwa nkwa ya ahụ bụ: “Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Olileanya nke Siri Ike

Ya mere, olee onye pụrụ iduru ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’inweta udo? Ọ bụ Jisọs Kraịst, bụ Onyeisi Udo ahụ a họpụtara ahọpụta. Nke a ọ̀ bụ olileanya kwesịrị ekwesị nye anyị taa? Ee, ọ bụrụ na nkwa ndị Bible kwere bụ ndị a na-apụghị ịdabere na ha, a gaghị enwe ezi olileanya ọ bụla maka udo. Ụmụ mmadụ ga-anọgide na-alụ ọgụ, na-egburịta onwe ha n’enweghị ọgwụgwụ ọ bụla dị nso. Ma Bible bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya, Alaeze Chineke nke dị n’okpuru Kraịst ga-ewetakwa udo. Anyị na-agba gị ume ige ntị n’ozi ọma Alaeze ahụ nke Ndịàmà Jehova ji na-abịa n’ụlọ gị ka i wee hụ nke a n’onwe gị. Mgbe ahụ, mgbe oge ya ruru, ka i sorokwa ná ndị ahụ dị umeala n’obi ndị ga-eketa ala, ndị ịba ụba nke udo ga-atọkwa ụtọ.

Olileanya nke udo nke a tụlere n’isiokwu nke a sitere na Bible. Taa, mgbe ọtụtụ ndị na-adịghị ekwerekwa na Bible, ị pụrụ ịjụ ajụjụ ma olileanya nke a ò kwesịkwara ekwesị. Ndịàmà Jehova kwesiri ike na o kwesịrị ekwesị. Ha na-anakwere Bible dị ka Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ ya, wee si otú ahụ bụrụ ihe kwesịrị ntụkwasị obi n’ozuzu ya nile. Na 1989, ha bipụtara otu akwụkwọ nke isiokwu ya bụ The Bible—God’s Word or Man’s? nke wepụtara ọtụtụ ihe àmà iji kwadoo eziokwu nke a. A ga-atụle ihe ọmụma ụfọdụ sitere n’akwụkwọ ahụ n’isiokwu abụọ ndị na-esonụ, bụ nke anyị na-akpọ gị òkù ka ị gụọ.

A gaje inwetakwu ihe ọmụma banyere nkwa Bible na-ekwe maka udo n’isiokwu bụ “Udo Uwa—Gịnị Ka Ọ Ga-apụta n’Ezie?” nke a ga-ebipụta ná mbipụta April 15, 1990, nke Ụlọ Nche.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ọ bu nanị Jisọs ruru eru iduru ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’inweta udo

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Taa, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’akụkụ nile nke ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya