Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 5-7
  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye nke Pụrụ Iweta Udo
  • Ihe Omume Ndị Na-eduje n’Udo nke Na-adịgide Adịgide
  • Ihe Àmà nke Ikpeazụ
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 5-7

Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?

“WILL na Ariel Durant dere n’akwụkwọ ha bụ The Lessons of History, sị, “Agha bụ otu n’ime ihe ndị na-adịgide adịgide n’akụkọ ihe mere eme, mmepeanya ma ọ bụ ọchịchị onye kwuo uche ya emebeghịkwa ka o belata. Udo bụ ọnọdụ ịha nhata nke na-adịghị adịgide adịgide, nke a pụrụ ichebe nanị mgbe o doro anya na otu onye ka ibe ya ike ma ọ bụ mgbe ike e nwere hà nhata.”

N’eziokwu, n’agbanyeghị oké mgbalị ndị a na-eme, udo na-adịgide adịgide erubeghị ihe a kpọrọ mmadụ aka ruo ugbu a. N’ihi gịnị? Ihe kpatara ya bụ na ihe ndị na-akpata agha gbanyere mkpọrọgwụ dị omimi karịa ndọrọ ndọrọ ịchị ọchịchị, nke ókèala, ma ọ bụ nke ọha mmadụ ndị anyị na-ahụ n’elu elu. Will na Ariel Durant dere, sị: “Ihe ndị na-akpata agha bụ otu ihe ndị ahụ na-akpata ịsọrịta mpì n’etiti ụmụ mmadụ n’otu n’otu: oké ọchịchọ inweta ihe, ịchọ esemokwu, na mpako; ọchịchọ maka ihe oriri, ala, ihe onwunwe, ihe dị iche iche e ji enweta ike, ịchị ndị ọzọ.”

Otú ọ dị, karịsịa, Bible na-eme ka a mara isi ihe na-akpata esemokwu na agha n’etiti ụmụ mmadụ n’otu n’otu nakwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karị. Anyị na-agụ, sị: “Olee ebe ibu agha si bịa, [oleekwa ebe] ịlụ ọgụ si bịa, bụ́ nke dị n’etiti unu? Ọ́ bụghị n’ebe ahụ, bụ́ ihe ụtọ nile unu nke na-ebu agha n’ihe nile dị unu n’ahụ, ka ha si bịa? Agụụ na-agụ unu, ma unu enweghị: unu na-egbu mmadụ, na-ekwokwa ekworo, unu apụghịkwa ịhụ ihe unu chọrọ: unu na-alụ ọgụ, na-ebukwa agha.”—Jemes 4:1, 2.

Ya mere, ihe bụ isi dị na ya bụ nke a: Ka e wee nweta ezi udo, anyị ga-ewepụchasị ọ bụghị nanị ihe mgbaàmà dị iche iche—agha, ọgba aghara, nkwatu ọchịchị, mgbanwe ọchịchị—kamakwa isi ihe ndị na-akpata ya—inyo mmadụ enyo, anyaukwu, ịkpọasị, esemokwu—n’ime mmadụ nile. A ghaghị iji àgwà ndị ọzọ dochie anya ndị a, bụ́ ndị kwekọrọ n’àgwà achọghị ọdịmma onwe onye ndị dị ka ịhụnanya, obi ọma, ntụkwasị obi, na imesapụ aka. Ọ̀ dị onye dị adị nke nwere ike imezu nke a? A sị na ọ dabeere n’ebe ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè, ndị na-anwụkwa anwụ nọ, azịza ya aghaghị ịbụ ee e. Ma ọ dị onye nke a na-agaghị esiri ike nke ukwuu. Nke a bụ Onye ahụ nke ji azịza nye ajụjụ ahụ bụ: Olee mgbe udo ga-abịa n’ezie?

Onye nke Pụrụ Iweta Udo

N’ihe dị ka 28 narị afọ gara aga, a kpaliri Aịsaịa onye amụma ikwupụta, sị: ‘A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onye isi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube, Chineke nke Bụ Dike, Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi, Onye Isi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi ya na udo ya ga-agwụ.’—Aịsaịa 9:6, 7.

E mesịrị gosi na onye nke a nke gaje iweta udo na-adịghị agwụ agwụ adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Jisọs Kraịst, bụ́ “Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu.” (Luk 1:30-33; Matiu 1:18-23) Ma n’ihi gịnị ka onye nke a ga-eji nwee ihe ịga nke ọma ebe ndị isi na ndị ọchịchị ọzọ nile daworo ada? E kwesịrị ibu ụzọ rịba ama na “nwa” ahụ e kwere ná nkwa agajeghị ịnọgide ruo mgbe ebighị ebi dị ka nwa ọhụrụ nke na-adịghị ike ọ bụla, dị ka ụfọdụ ndị pụrụ iche banyere ya. Kama nke ahụ, ọ gaje “ịbụ onye isi” dị ka “Onye Isi Udo,” nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi ebighị ebi.

E nwere ihe ka ukwuu dị n’ọchịchị Jisọs. Dị ka ‘Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,’ bụ́ onye nwere nghọta pụrụ iche nke ọdịdị mmadụ na ike na-enweghị atụ, ọ ga-enwe ike irute na mkpọrọgwụ nke ihe iseokwu ndị ahụ siri ike wee si otú a dozie oké ihe isi ike ndị ahụ na-eche ndị ọchịchị ụwa ihu taa, ndị ha na-apụghịkwa ime ihe ọ bụla banyere ha. (Matiu 7:28, 29; Mak 12:13-17; Luk 11:14-20) Mgbe ahụ, dị ka “Chineke nke Bụ Dike,” Onye ahụ bụ chi nke e meworo ka o si n’ọnwụ bilie, bụ́ Jisọs Kraịst, onye nọkwasịworo n’ocheeze ugbu a n’eluigwe dị ka Eze Mesaịa, ga-arụ ọrụ iweta udo site n’imeghachi n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ihe o mere mgbe ọ nọ n’elu ala—ịgwọ ndị ahụ nwere ọrịa a na-apụghị ịgwọ agwọ, inye oké ìgwè mmadụ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, ọbụna na-achịkwa ọnọdụ ihu eluigwe. (Matiu 14:14-21; Mak 4:36-39; Luk 17:11-14; Jọn 2:1-11) Dị ka “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi,” Jisọs nwere ikike ịkpọghachite ná ndụ ndị ahụ nile laworo n’iyi n’ọnwụ, nyekwa ha ndụ ebighị ebi. Ya onwe ya ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi, wee si otú a na-eme ka e jide n’aka na ọchịchị ya na udo ahụ agaghị enwe ọgwụgwụ.—Matiu 20:28; Jọn 11:25, 26; Ndị Rom 6:9.

N’ịbụ onye a kwadebere n’ụzọ dị otú a, o doro anya na Jisọs Kraịst bụ onye nke nwere ike imeri isi ihe ndị ahụ gbamiri mkpọrọgwụ ndị na-akpata agha na esemokwu. Ihe ọ ga-eme abụghị nanị iguzobe nkwekọrịta ma ọ bụ atụmatụ udo maka ihe ahụ a kpọrọ mba dị iche iche ibikọ n’udo, nke agha ọzọ ga-emesịa tisasịa. Kama nke ahụ, ọ ga-ewepụsị ahaghị nhata nile nke metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ókèala, ọnọdụ ọha mmadụ, na nke akụ na ụba, site n’ime ka ihe nile a kpọrọ mmadụ bịa n’okpuru otu ọchịchị, nke Alaeze Mesaịa ahụ. Site n’iduzi ndị nile n’ofufe nke nanị otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ọ ga-ewepụchasị ihe ahụ nke na-akpatakarị agha—okpukpe ụgha. E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Isi Udo, ga-emezu ihe a nile. Ajụjụ dịnụ bụ, ọ̀ bụ òle mgbe?

Ihe Omume Ndị Na-eduje n’Udo nke Na-adịgide Adịgide

Mgbe mbilite n’ọnwụ na nlago ya n’eluigwe gasịrị n’afọ 33 O.A., ọ dịrị mkpa ka Jisọs chere ruo oge a kara aka ka ọ malite ime ihe. Nke a bụ dị ka iwu Jehova si dị: “Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịịrị ụkwụ gị abụọ. Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.” (Abụ Ọma 110:1, 2; Luk 22:69; Ndị Efesọs 1:20; Ndị Hibru 10:12, 13) Olee mgbe nke ahụ ga-eme? Ruo ihe karịrị 70 afọ, Ndịàmà Jehova anọwo na-akpọsa gburugburu ụwa ozi ọma ahụ nke bụ na Jisọs Kraịst malitere ịchị achị n’Alaeze Chineke n’eluigwe n’afọ 1914.a

Ma ị pụrụ ikwu, sị, ‘E nwebeghị udo ọ bụla kemgbe 1914. Kama nke ahụ, ọnọdụ ndị e nwere esiwo n’ịdị njọ gaa n’ịdị njọ karị eri mgbe ahụ.’ Ihe i kwuru ziri nnọọ ezi. N’ezie, nke a na-egosi na ihe ndị na-emenụ na-eme kpọmkwem dị ka e buru ha n’amụma. Bible na-agwa anyị na kpọmkwem n’oge ahụ mgbe “alaeze nke ụwa [ghọrọ] alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya: . . . mba nile [were iwe].” (Mkpughe 11:15, 18) Kama ido onwe ha n’okpuru ọchịchị nke Jehova Chineke na Onye Isi Udo ya, mba dị iche iche mabanyere n’oké ndọgburịta maka onye ga-achị ụwa, gosipụtakwa iwe megide ndị Kraịst, ndị nọ na-agbara Alaeze Chineke nke e guzobeworo àmà.

Akwụkwọ Mkpughe na-egosikwa na ozugbo Jisọs Kraịst banyere n’ike Alaeze, o mere ihe iwepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe. “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst ya: n’ihi na a chụdara onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebube n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị.” Gịnị si na nke a pụta? Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:10, 12.

Ihe Àmà nke Ikpeazụ

Nke a na-enye anyị nghọta banyere ihe mere na mba nile enwebeghị ike iweta udo n’agbanyeghị mgbalị ha nile. Oké ọnụma nke Ekwensu, bụ́ nke a na-egosipụta n’iwe nke mba dị iche iche na-ewe, emewo ka ụwa nọgide n’ịma jijiji na ọgba aghara dị ka ọ na-adịtụbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Olee mgbe ihe ndị a nile ga-abịaru ná ngwụsị? Bible na-agbara anyị àmà dị mkpa, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.

Ị̀ ghọtara ịdị mkpa nke ịdọ aka ná ntị nke a? Ihe ndị na-eme n’ụwa ndị dị ka ndị ahụ anyị kọwapụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ na-egosi na ndị ọchịchị na ọtụtụ ndị amalitewo ikwu okwu banyere udo, na-emekwa ihe iji nweta ya dị ka ha na-emebeghị mgbe ọ bụla na mbụ. Ụfọdụ ndị na-eche na ọgwụgwụ nke Agha Nzuzo ahụ emewo ka ihe iyi egwu nke mkpochapụ n’agha nuklia bụrụ ihe gabigaworonụ. Ee, mba dị iche iche anọwo na-ekwu ọtụtụ ihe banyere udo na ntụkwasị obi. Ma ọnọdụ ụwa ọ̀ na-eche ihu n’ebe ahụ n’ezie? Cheta na Jisọs kwuru banyere ndị na-ebi n’ime mgbe ikpeazụ ahụ, malite na 1914, sị: “N’ezie asị m unu, ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” (Matiu 24:34) Ee, udo ga-abịa n’ezie n’ime ọgbọ nke a ma ọ bụghị site ná mgbalị nke mba dị iche iche. Udo ahụ nke e guzobesiri ike, nke ziri ezi, nakwa nke ezi omume, nke Jehova Chineke kwere ná nkwa pụrụ ịbịa nanị site n’ọchịchị ahụ na-abịanụ nke Onye Isi Udo ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Aịsaịa 9:7.

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịhụ ụbọchị ahụ mgbe udo ga-abịa n’ezie, na-achọkwa ka gị na ndị ị hụrụ n’anya soro nweta ya, mgbe ahụ, lekwasị Onye Isi Udo ahụ anya, burukwa n’uche okwu ya ndị ahụ na-emesi obi ike, bụ: “Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:36.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa ndị ọzọ n’ihe banyere ọgụgụ oge Bible na amụma Bible ndị mezuworonụ, lee isi 12 ruo 14 nke akwụkwọ ahụ bụ “Ka Alaeze Gị Bịa,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Igbe dị na peeji nke 6]

ỊKỌWA IHE UDO BỤ

Taa, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-eche na udo bụ ọnọdụ nke enweghị agha ma ọ bụ esemokwu. Otú ọ dị, nke a bụ nkọwa na-asaghị mbara nke okwu ahụ.

N’oge e dere Bible, okwu ahụ bụ “udo” (Hibru, sha·lohmʹ) ma ọ bụ okwu ahụ bụ “Udo dịrị unu!” bụ nke e jiri mee ihe dị ka okwu ekele nkịtị. (Ndị Ikpe 19:20; Daniel 10:19; Jọn 20:19, 21, 26) O doro anya na ọ dịghị ezo aka nanị n’ọnọdụ nke enweghị agha. Rịba ama ihe akwụkwọ ahụ bụ

The Concept of Peace

kwuru banyere nke a:

“Mgbe e jiri okwu ahụ bụ shalom mee ihe maka udo, ihe ndị mbụ jiri ya mee ihe bu n’uche bụ ọnọdụ nke ụwa ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ebe e nwere izu okè, ịdị n’otu, ozuzu, izu ezu. . . . Ebe e nwere udo, ebe e ruworo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ịdị adị ma n’ozuzu ma n’akụkụ dị iche iche nke mejupụtara ihe.”

Mgbe Chineke wetara udo, ọ bụghị nanị na ụmụ mmadụ “agaghị amụtakwa agha ọzọ,” kama ‘onye ọ bụla ga-anọ n’okpuru osisi vine na osisi fig nke ya.’—Maịka 4:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 7]

E nwewo mmetụta pụtara ìhè nke enweghị udo kemgbe Agha Ụwa Mbụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya