Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 3/8 p. 10-16
  • Ọkara Narị Afọ n’Okpuru Ọchịchị Aka Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọkara Narị Afọ n’Okpuru Ọchịchị Aka Ike
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Manye M Ime Mkpebi
  • Ọ Fọdụrụ Nwantịị E Jide M
  • Ọrụ A Rụrụ Mgbe Agha Biri
  • Mkpesa Anyị Kpesaara Stalin
  • Mkpagbu Esiwanye Ike
  • Ndụ Ihe Isi Ike na Siberia
  • Mgbanwe ná Ndụ Ụlọ Mkpọrọ
  • Onyeàmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi
  • Ntọhapụ na Ịla
  • N’okpuru Nrụgide n’Estonia
  • Ndị Ndị KGB Lekwasịrị Anya
  • E Gboo Agụụ Ime Mmụọ
  • Ndụ Onye Kraịst Na-eju Afọ
  • Emeriri M Ihe Ịma Aka Nke Ijere Chineke ozi
    Teta!—2005
  • Ebe Mkpagbu Soviet Lekwasịrị Anya
    Teta!—2001
  • Nkwa M Kpebisiri Ike Imezu
    Teta!—1998
  • Ịtachi Obi n’Ọnwụnwa Mere Ka Jehova Gọzie M
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 3/8 p. 10-16

Ọkara Narị Afọ n’Okpuru Ọchịchị Aka Ike

Dị ka Lembit Toom si kọọ

Na 1951, a mara m ikpe ije mkpọrọ ọrụ ahụhụ ruo afọ iri na Siberia. E buuru anyị gaa ọtụtụ puku kilomita ruo otu ogige dị n’ime ime Ógbè Arctic. Ọrụ ahụ na-agwụ ike, oyi na-atụsi ike, ọnọdụ anyị biri ndụ na ya dịkwa oké njọ. Ka m kọwaa ihe mere m ji gaa ebe ahụ na ihe mere na ahụhụ anyị tara abụghị n’efu.

E WEERE papa m dị ka onye nwere ọgụgụ isi n’Estonia, bụ́ mba Baltic bụ́ ebe a mụrụ m na March 10, 1924. Otú ọ dị, n’afọ ndị ikpeazụ ya, o lekọtara ugbo ezinụlọ anyị dị na Järvamaa n’etiti Estonia. Anyị bụ ezinụlọ buru ibu na-aga chọọchị Lutheran nke nwere ụmụ itoolu, ndị m bụ nke ikpeazụ n’ime ha. Papa anyị nwụrụ mgbe m dị afọ 13.

Agụsịrị m ụlọ akwụkwọ elementrị n’afọ na-esote ya. Na September 1939, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, e debanyere aha nwanne m nwoke bụ́ Erich n’ozi agha, enwekwaghị m ike ịga n’ihu n’agụmakwụkwọ m. Mgbe ahụ, na 1940, Estonia batara n’okpuru Soviet Union, ka otu afọ gasịkwara ndị Germany weghaara Estonia. Ha tụrụ Erich mkpọrọ ma a tọhapụrụ ya, ọ lọghachikwara Estonia n’August 1941. Na 1942, enwere m ike ịga ụlọ akwụkwọ a na-amụ banyere ọrụ ugbo.

Ọ bụ mgbe m si ụlọ akwụkwọ lọta maka Krismas na 1943 ka nwanne m nwanyị bụ́ Leida gwara m na dọkịta ezinụlọ anyị agwawo ya banyere Bible. O nyewo ya ụfọdụ akwụkwọ nta ndị Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Agụrụ m ha ma n’egbughị oge chọta Dr. Artur Indus, bụ́ onye mụwaziiri m Bible.

A Manye M Ime Mkpebi

Ka ọ dịgodị, ọgụ ndị Germany na ndị Soviet Union na-alụ bịara ka njọ. Mgbe ọ na-erule na February 1944, ndị Russia abịaruwo ókèala Estonia nso. E debanyere aha Erich n’òtù ndị agha Germany, enwetakwara m akwụkwọ nke m idebanye aha. Ekweere m na iwu Chineke machibidoro igbu mmadụ ibe anyị, Dr. Indus kwukwara na ya ga-enyere m aka ịchọta ebe m ga-ezo ruo mgbe agha ahụ biri.

Otu ụbọchị otu ọfịsa na onye ndú nke ndị nche obodo anyị batara n’ugbo anyị. E nyewo ha iwu ka ha jide m n’ihi iche na m na-achọ izere ije ozi agha. Mgbe ahụ a maara m na aghaghị m ịgbapụ n’ụlọ ma ọ bụ m gaa n’ogige ịta ahụhụ ndị Germany.

Agbabara m n’ugbo nke otu n’ime Ndịàmà Jehova. Iji wusie okwukwe m ike, mgbe m nọ n’ebe m gbabara agụrụ m Bible na akwụkwọ Watch Tower Society ruo ókè ike kwere m. Otu abalị eheere m laghachi ụlọ iwere nri. Ụlọ ahụ jupụtara ná ndị soja Germany, ebe nwanne m nwoke bụ́ Erich kpọwooro ụfọdụ ndị enyị ya lọta maka ezumike ụbọchị ole na ole. Enwere m ike isoro Erich kwurịta okwu na nzuzo n’ebe nzọcha mkpụrụ ákụ́kụ́ n’abalị ahụ. Ọ bụ oge ikpeazụ m hụrụ ya anya.

Ọ Fọdụrụ Nwantịị E Jide M

N’otu abalị ahụ, mgbe m laghachisịrị n’ugbo ahụ m zoro, a wakporo ya. Ọfịsa nke ógbè ahụ na ndị ikom so ná ndị nche obodo mere mwakpo ahụ n’ihi na a gwara ha na e nwere onye zoro n’ugbo ahụ. Arịkpuru m n’oghere a rụnyere n’okpuru ala ụlọ, n’oge na-adịghịkwa anya anụrụ m ụda boot n’elu isi m. N’iji égbè eyi onye ọrụ ugbo ahụ egwu, ọfịsa ahụ tiri mkpu, sị: “E nwere otu nwoke zoro n’ụlọ a! Olee otú anyị ga-esi banye n’oghere a rụnyere n’okpuru ala ụlọ a?” Apụrụ m ịhụ ọkụ tọọchị ha ji na-achọgharị m. Alatụkwuru m azụ ma dinara ebe ahụ, cherekwa. Mgbe ha lasịrị, anọrọ m n’oghere ahụ a rụnyere n’okpuru ala ụlọ ahụ ruo nwa oge iji jide n’aka na ihe ize ndụ ahụ agabigawo.

Tupu chi efoo ahapụrụ m ụlọ ahụ, na-ekele Jehova na a chọtaghị m. Ụmụnna ndị Kraịst nyeere m aka ịchọta ebe ọzọ m zoro, bụ́ ebe m nọrọ ruo mgbe mweghara nke ndị Germany bịara ná njedebe. Ka e mesịrị, anụrụ m na e gbuwo ọfịsa ahụ na onye ndú nke ndị nche obodo ahụ, ihe àmà gosiri na ọ bụ ndị agha okpuru Russia gburu ha. Na June 19, 1944, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Chineke site na baptism ime mmiri, nwanne m nwanyị bụ́ Leida ghọkwara otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Mweghara nke ndị Soviet weghaara Estonia ọzọ malitere na June 1944, ka ọnwa ole na ole gasịkwara, enweere m onwe m ịlaghchi ụlọ iji nye aka n’ọrụ ugbo. Ma na November, n’oge na-adịghị anya mgbe m lọghachisịrị, e nyere m iwu ka m bịa hụ òtù ndị agha Russia. N’ịbụ onye nwere obi ike zuru ezu, eji m obi ike gbaa àmà nye kọmitii ahụ na-edeba aha ndị agha. Ha gwara m na ndị Soviet enweghị mmasị na nkwenkwe m nakwa na onye ọ bụla aghaghị ije ozi n’òtù ndị agha. Otú ọ dị, n’ihe fọdụrụnụ n’agha ahụ, ejisiri m ike nwere onwe m, enyekwara m onwe m n’inye aka iwetara Ndịàmà ibe m akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.

Ọrụ A Rụrụ Mgbe Agha Biri

Mgbe agha biri na May 1945, a gbagharakwa ndị jụrụ ikere òkè na ya n’ihi akọ n’uche ha, alaghachiri m n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ọ na-erule ná mmalite nke afọ 1946, ekwubiri m na m gaghị enwe ihe ịga nke ọma n’ịrụ ọrụ ugbo n’Estonia, ebe ndị Soviet wegharawooro azụmahịa ndị mmadụ nwe. N’ihi ya akwụsịrị m ịga akwụkwọ ma malite ikere òkè n’ụzọ zuru ezu karị n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.

N’okpuru ọchịchị ndị Soviet, a pụghịzi ije ozi anyị n’ihu ọha. N’ezie, anyị na Watch Tower Society adịkwaghị ezirịta ozi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. N’ihi ya m nyere aka site n’iji ígwè mimeograph ochie na-ebipụtaghachi akwụkwọ ndị anyị chekwaworo. Anyị mekwara ike anyị nile inwe nzukọ ọgbakọ.

Mkpagbu nke ndị KGB (Kọmitii Nchebe Obodo Soviet) kpagburu Ndịàmà Jehova malitere n’August 1948. E jidere mmadụ ise n’ime ndị na-edu ndú n’ọrụ ahụ ma tụọ ha mkpọrọ, n’oge na-adịghịkwa anya o doro anya na ndị KGB chọrọ ijide mmadụ nile. E hiwere kọmitii nke anyị mmadụ anọ mejupụtara ịhazi ọrụ nkwusa ahụ, ịgba ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst ume, na inyere ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ aka. Ebe ọ bụ na m ka nwetụụrụ onwe m ịgagharị, e si n’aka m na-akpọtụrụ Ndịàmà ibe anyị.

E zigaara ndị isi gọọmenti Soviet nọ n’Estonia akwụkwọ mkpesa bu akara ụbọchị September 22, 1948. Ọ kọwara nzukọ anyị na nzube nke ọrụ anyị, o kwukwara ka a tọhapụ ndị kwere ekwe ibe anyị a tụrụ mkpọrọ. Gịnị bụ nzaghachi ha? Njide ndị ọzọ. Na December 16, 1948, anyị zigaara Kansụl Ụlọikpe Kasị Elu nke SSR dị n’Estonia akwụkwọ mkpesa ọzọ, na-ekwu ka a tọhapụ ụmụnna anyị ma kwuo na aka ha dị ọcha. A ka nwere mkpesa a na ndị ọzọ na faịlụ dị n’ebe ndebe ihe mgbe ochie nke obodo Tallinn.

Ọ dị ize ndụ ime njem, ebe anyị na-apụghị inweta akwụkwọ ndị kwesịrị ekwesị. Ma, anyị jiri ọgba tum tum nwere ahụ dị ka ụgbọala bụ́ nke a zụtaworo n’aka otu ọfịsa bụ́ onye Russia, na-eleta ọgbakọ ndị dị n’Aravete, Otepää, Tallinn, Tartu, na Võru. Anyị jiri oké mmasị na-akpọ ya Ụgbọ Ịnyịnya.

Mkpesa Anyị Kpesaara Stalin

Na June 1, 1949, e zigara mkpesa ọzọ n’ọfịs kasị elu nke Socialist Republic nke Estonia, zigakwara Nikolay Shvernik, onyeisi oche nke Kọmitii Ndị Nlekọta nke Òtù Ndị Omeiwu nke Soviet. Ihe odide a, nke anyị nwetaghachiri otu n’ime ha site n’ebe ndebe ihe mgbe ochie nke Tallinn, bu akara Nikolay Shvernik suru na ya, na-egosi na o nwetara ya ma zigara Joseph Stalin, bụ́ onyeisi gọọmenti Soviet Union, otu. Akụkụ ikpeazụ nke mkpesa ahụ na-agụ, sị:

“Anyị na-ekwu ka a tọhapụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ mkpọrọ nakwa ka a kwụsị mkpagbu a na-akpagbu ha. E kwesịrị ikwe ka nzukọ Jehova Chineke, site n’aka Watchtower Bible and Tract Society, na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Jehova nye ndị nile bi na Soviet Union, n’enweghị ihe mgbochi; ma ọ bụghị ya, Jehova ga-ebibi Soviet Union na Òtù Ọchịchị Kọmunist kpam kpam.

“Nke a ka anyị na-ekwu ka e mee n’aha Jehova Chineke na Eze nke Alaeze ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nakwa n’aha ndị kwere ekwe ibe anyị nile a tụrụ mkpọrọ.

“Ndị bịanyere aka n’akwụkwọ: Ndịàmà Jehova nọ n’Estonia (June 1, 1949).”

Mkpagbu Esiwanye Ike

Ná mmalite afọ 1950, anyị nwetara mbipụta atọ nke Ụlọ Nche site n’aka onye si Germany lọta. Ka ụmụnna anyị ndị Kraịst nile nwee ike irite uru ná nri ime mmụọ a, e kpebiri na anyị ga-enwe mgbakọ na July 24, 1950, n’ọbá ahịhịa nke otu onye a na-amụrụ Bible, nke dị nso n’obodo nta bụ́ Otepää. Otú ọ dị, n’ụzọ ụfọdụ, ndị KGB matara atụmatụ anyị, ha jikekwaara ijide anyị n’ìgwè.

A kwụwara gwongworo abụọ bujuru ndị soja n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị na Palupera, bụ́ ebe ụmụnna ga-arịtu. Ọzọkwa, otu onye soja jiri redio nke na-ezipụ ozi chechie ha n’ụzọ si Otepää gawa Palupera, nke dị nso n’ebe ahụ a gaje inwe mgbakọ. Mgbe ụmụnna ụfọdụ anyị na-atụ anya ka ha bịarute n’oge na-abịaghị n’oge anyị kara aka, anyị chere na a chọpụtawo atụmatụ anyị.

Akpọọrọ m Onyeàmà ibe m bụ́ Ella Kikas ma jiri ọgba tum tum fere ọsọ ruo n’ebe nke abụọ ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị tupu e rute Palupera. Ụgbọ okporo ígwè ahụ ka bịaruru nnọọ abịaru, ya mere mụ na Ella banyere n’ime ya otu onye site n’ebe isi ya na onye nke ọzọ site n’ebe ọdụ ya na-agba ọsọ ma na-eti mkpu ka mmadụ nile rịtuo. Mgbe Ndịàmà ahụ rịturu, anyị mere ndokwa inwe mgbakọ anyị n’ọbá ọzọ echi ya. E si otú a mee ka atụmatụ ndị KGB mere maka ijide Ndịàmà n’ígwè kụọ afọ n’ala.

Otú ọ dị, ọnwa abụọ mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, a malitere njide n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu. E jidere m ka a jụọ m ajụjụ na September 22, 1950, otú ahụkwa ka ọ dị mmadụ atọ ndị nke ọzọ so na kọmitii ahụ na-elekọta ọrụ nkwusa n’Estonia. E debere anyị n’ụlọ mkpọrọ ndị KGB dị na Tallinn, n’Okporo Ámá Pagari ruo ọnwa asatọ. E mesịa, a kpọgara anyị n’ụlọ mkpọrọ ọha dị n’Okporo Ámá Kalda, bụ́ nke a kpọrọ Battery. E jichiri anyị n’ebe ahụ ruo ọnwa atọ. E jiri ya tụnyere ụlọ mkpọrọ ndị KGB ahụ bụ́ ebe e debeworo anyị n’ọnụ ụlọ dị n’ime ala, nke a dị n’Osimiri Baltic yiri ebe ntụrụndụ oge ezumike.

Ndụ Ihe Isi Ike na Siberia

N’oge na-adịghị anya ka nke a gasịrị, a mara mụ na Harri Ennika, Aleksander Härm, Albert Kose, na Leonhard Kriibi ikpe ịnọ n’otu ogige dị anya na Noril’sk, Siberia, ruo afọ iri. N’ebe ahụ anwụ adịghị ada ada ruo ọnwa abụọ n’oge okpomọkụ, n’oge oyi ọ dịghịkwa awa ruo ọnwa abụọ.

N’August 1951, anyị malitere akụkụ mbụ nke njem ụgbọ okporo ígwè anyị site na Tallinn ruo Noril’sk. Anyị gbara ihe dị ka kilomita 6,000 n’ụzọ gafere Pskov, St. Petersburg (nke bụbu Leningrad), Perm’, Yekaterinburg (nke bụbu Sverdlovsk), Novosibirsk, na Krasnoyarsk, dị n’akụkụ Osimiri Yenisey. N’ikpeazụ, ná mmalite October, anyị banyere otu ụgbọ mmiri e ji ebu ibu na Krasnoyarsk, a dọkpụkwaara anyị gaa ebe ugwu ruo ihe karịrị kilomita 1,600. Ka izu abụọ gasịrị anyị ruru obodo bụ́ Dudinka, dị n’ime ime Ógbè Arctic. Na Dudinka anyị banyere n’ụgbọ okporo ígwè ọzọ maka akụkụ ọzọ dị kilomita 120 na njem ahụ ịgaru Noril’sk. Site n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị na Noril’sk, anyị jiri ụkwụ gaa kilomita 15 ikpeazụ n’oge snow na-adasi ike ruo n’ogige ọrụ ahụ dị ná mpụga obodo.

Ebe ọ bụ na e zuru uwe oge oyi m mgbe anyị nọ n’ime ụgbọ mmiri ahụ e ji ebu ibu, eji m nanị kootu oge okpomọkụ, otu okpu, na sandal. Ọtụtụ izu nke ime njem site na Tallinn emewo ka ike gwụ anyị, enyeghịkwa anyị ntakịrị nri a na-ekenye anyị kwa ụbọchị. N’ihi ya ndị mkpọrọ ụfọdụ tụbọrọ. Anyị nyeere ha aka ruo mgbe e wetara ịnyịnya, anyị tinyezie ha n’ihe e ji ebu ibu n’elu snow nke ịnyịnya na-adọkpụ.

Mgbe anyị rutere n’ogige ahụ, e debanyere aha anyị n’akwụkwọ, kpọrọ anyị gaa n’ụlọ ebe a na-eji uzu ọkụ asa ahụ, ma kenye anyị nri nke ụbọchị ahụ. Ogige ndị soja ahụ na-ekpo ọkụ, n’oge na-adịghịkwa anya ezigbo ụra buuru m. Otú ọ dị, n’etiti abalị, etetara m na-enwe oké ihe mgbu n’ihi ihe zara m ná ntị. N’ụtụtụ echi ya e lekọtara m, a gwakwara m ka m ghara ịrụ ọrụ. Ma ndị isi ụlọ mkpọrọ were iwe na apụghị m ịrụ ọrụ, ha tikwara m ihe. E tinyere m na nga ịnọ nanị m ruo otu ọnwa, dị ka ha si kwuo, m “na-akpaghasị udo nke ogige ahụ.” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e nyere m ọgwụ si n’ebe nlekọta ndị ọrịa, oge ahụ m nọ nanị m mere ka m nwetaghachi ahụ ike m.

Oge oyi nke mbụ n’ogige ahụ kasị sie ike. Ọrụ, nke a na-arụkarị n’olulu ghere oghe a na-egwupụta ígwè nickel, na-agwụ ike, obere nri anyị na-enweta adịghị enye ihe n’ahụ. Mgbe ọtụtụ ndị malitere inwe ihe mgbaàmà nke ọrịa scurvy, a gbara anyị ọgwụ vitamin C iji belata ọrịa ahụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na anyị zutere ọtụtụ Ndịàmà ibe anyị n’ogige ahụ, bụ́ ndị si Moldova, Poland, na Ukraine.

Mgbanwe ná Ndụ Ụlọ Mkpọrọ

N’oge opupu ihe ubi nke afọ 1952, ndị mkpọrọ malitere ịnata obere ụgwọ ọnwa, bụ́ nke mere ka anyị nwee ike ịdị na-azụta nri iji mee ka ihe oriri anyị bukwuo ibu. Ndịàmà ụfọdụ malitekwara inweta nri n’igbe ndị nwere ikè e megharịrị emegharị bụ́ ebe e zoro akwụkwọ e ji amụ Bible. Otu Onyeàmà bụ́ onye Moldova nwetara otu mkpọ abụba anụ n’otu oge. Ka a na-eri abụba anụ ahụ, a hụrụ afọ ezì. A hụrụ mbipụta atọ nke Ụlọ Nche n’ime ya!

Mgbe Stalin nwụrụ, na March 5, 1953, ndụ ụlọ mkpọrọ gbanwere n’ụzọ dị ukwuu. Na mbụ, ịgba abụbọ ọrụ na nnupụisi tiwapụtara ka ndị mkpọrọ na-ekwu ka a tọhapụ ha. E zitere usuu ndị agha ka ha kwụsị ha. Na Noril’sk, e gburu ndị mkpọrọ 120 n’otu nnupụisi; ma Ndịàmà etinyeghị aka, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha e gburu ma ọ bụ merụọ ahụ. N’oge okpomọkụ nke afọ 1953, ọrụ kwụsịrị n’ebe ahụ a na-egwupụta ígwè nickel ruo izu abụọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndụ ụlọ mkpọrọ bịara dịkwuo mfe. A tọhapụrụ ndị mkpọrọ ụfọdụ, e gbubilatakwara oge mkpọrọ nke ndị ọzọ.

Onyeàmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Mgbe oge a nke oké ọgba aghara n’ogige ahụ gasịrị, a kpọfere m n’otu ogige dị n’ebe ndịda na nso nso obodo ukwu bụ́ Tayshet, n’ógbè Irkutsk. N’ebe ahụ ezutere m Artur Indus, bụ́ onye buru ụzọ mụọrọ m Bible. Ọ jụwo ịrụ ọrụ dị ka onye dọkịta n’ogige ahụ, kama nke ahụ na-ahọrọ ịrụ ọrụ siri ike karị. Ọ kọwara, sị: “Akọ na uche m ekweghị m inye ndị mkpọrọ ahụ siri ike bụ́ ndị nwere ọkwá nlekọta ikike ịga ezumike n’ihi ọrịa, ebe a na-amanye ndị mkpọrọ ahụ na-esighị ike n’ezie ịrụ ọrụ.”

Mgbe ahụ Nwanna Indus atachaala ahụ ma na-arịa ọrịa, ebe ọ bụ na ọ rụbeghị ọrụ siri ike mbụ. Ma ọ gwara m na ya chere na nhụjuanya ya anụchawo obi ya n’ụzọ ime mmụọ. Anyị nọkọrọ ruo ihe dị ka izu atọ. A kpọgaziri ya n’ụlọ ọgwụ dị n’ogige ahụ, bụ́ ebe ọ nọrọ nwụọ na January 1954. Ili ya a na-amaghị kpọmkwem dị n’oké ọhịa buru nnukwu ibu dị nso n’ógbè Arctic. Ọ nwụrụ dị ka onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ma na-echere mbilite n’ọnwụ.

Ntọhapụ na Ịla

Na 1956 e zitere otu Kọmitii Ndị Nlekọta nke Òtù Ndị Omeiwu nke Soviet n’ogige anyị ịtụleghachi faịlụ ndị mkpọrọ. Mgbe m pụtara n’ihu òtù ahụ, onyeisi ya jụrụ m, sị: “Gịnị ka ị ga-eme mgbe a tọhapụsịrị gị?”

“Anyị ga-ama mgbe oge ruru,” ka m zaghachiri.

A gwara m ka m pụtụ n’ụlọ ahụ, mgbe a kpọghachiri m, onyeisi ahụ kwuru, sị: “Ị bụ onye iro kasị njọ nke Soviet Union—ị na-emegide echiche ha.” Ma o kwukwasịrị: “Anyị ga-atọhapụ gị, ma anyị ga na-esogharị gị.” A tọhapụrụ m na July 26, 1956.

Ruo ụbọchị abụọ eletara m Ndịàmà si Ukraine nọ na Suyetikha, bụ́ obodo nta dị nso na Tayshet, bụ́ ebe a chụgara ha na 1951. Akwụsịziri m n’ógbè Tomsk nke dị nso n’ebe a chụgara mama anyị, bụ́ ebe m nọruru ụbọchị anọ. Eji m ụkwụ gaa kilomita 20 site n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị ruo obodo nta bụ́ Grigoryevka. N’ebe ahụ ahụrụ m ọnọdụ ndị kadị ndị ọtụtụ n’ime anyị nọrọ n’ogige ndị ahụ njọ! A tọhapụwo nwanne m nwanyị bụ́ Leida n’ụlọ mkpọrọ dị na Kazakhstan, ọ bịawokwa nọnyere mama anyị n’ógbè ahụ n’ọnwa ole na ole gara aga tupu mgbe ahụ. Ma ebe ọ bụ na e jichiwo akwụkwọ ikike ngafe ya, o nwebeghị ike ịlaghachi Estonia.

N’okpuru Nrụgide n’Estonia

Ka oge na-aga, alọghachiri m Estonia ma gaa ozugbo n’ugbo nne na nna m. Achọpụtara m, dị ka m nụrụ na Siberia, na gọọmenti ebibiwo ụlọ anyị nile! Ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ebutere m ọrịa polio. Anọrọ m n’ụlọ ọgwụ ruo ogologo oge ma nọgide na-agbaso usoro ọgwụgwọ ka m pụtasịrị. M na-ete ụkwụ ruo taa.

N’oge na-adịghị anya enwetara m ọrụ n’otu ụlọ ọrụ m rụbuuru ọrụ n’oge okpomọkụ nke afọ 1943, bụ́ Ụlọ Ọrụ Na-egwupụta Ihe Yiri Coal dị na Lehtse. E sitere n’aka ha nye m ụlọ, mgbe mama anyị na Leida si ebe a chụgara ha lọta na December 1956, ha bịara soro m biri na Lehtse.

Na November 1957, alụrụ m Ella Kikas, bụ́ onye sikwa ogige ụlọ mkpọrọ dị na Siberia lọta n’oge na-adịbeghị anya. Ọnwa abụọ mgbe nke ahụ gasịrị anyị kwagara Tartu, bụ́ ebe anyị nwetara obere ọnụ ụlọ n’ụlọ mmadụ nwe. N’ikpeazụ, enwere m ike inweta ọrụ dị ka ọkwọ ụgbọala n’Òtù Mgbakọ Aka Maka Ndị Na-azụ Ngwá Ahịa nke Ógbè Tartu.

Mgbe m nọ na Siberia asụgharịwo m isiokwu iri nke Ụlọ Nche dịịrị ọmụmụ site n’asụsụ Russian gaa n’asụsụ Estonian, ejikwa m ha lọta ụlọ. Ka e mesịrị, anyị nwetara akwụkwọ bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri, bụ́ nke anyị sụgharịkwara gaa n’asụsụ Estonian. Anyị jiziri ígwè typewriter depụtakwuo akwụkwọ ahụ. Ka ọ dịgodị, ndị KGB nọgidere ná nledo ha. Ebe anyị ma usoro ndị ha na-eji achọ ihe, anyị na-anọ na nche ma na-akpachara anya mgbe nile, dị ka ụmụ anụmanụ a na-achụ ijide.

Ndị Ndị KGB Lekwasịrị Anya

Ná mmalite afọ ndị 1960, ndị KGB malitere otu nkwutọ megide Ndịàmà. Mụ na nwunye m bụ ndị a kasị lekwasị anya. Akwụkwọ akụkọ dị iche iche malitere ibu isiokwu ndị okwu nkwutọ jupụtara, a katọkwara anyị na redio nakwa na telivishọn. Ndị KGB nwere nzukọ ihu ọha ugboro abụọ n’ebe m na-arụ ọrụ. Ọzọkwa, ndị ọkà n’ime ihe nkiri gosiri ihe omume na-atọ ọchị e jiri m mee n’Ebe Ihe Nkiri nke Estonia dị na Tallinn. Ọnọdụ ahụ chetaara m okwu Devid bụ́: “Ndị na-anọdụ n’ọnụ ụzọ ámá na-atụgharị uche banyere m; aghọwokwa m abụ nke ndị na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-abụ n’ịkpọ ụbọ akwara.”—Abụ Ọma 69:12.

Mgbalị ndị a iji mechuo anyị ihu gara n’ihu ruo afọ 1965 bụ́ mgbe e nwere nzukọ ikpeazụ n’Ụlọ Maka Ahụ Ike Ndị Ọrụ dị na Tartu. Ma mụ ma Ella nọ n’ebe ahụ, ndị ọrụ KGB na ígwè mmadụ buru nnọọ ibu nọkwa ya. Ọtụtụ oge mgbe a jụrụ Ella ajụjụ, ndị na-ege ntị zaghachiri site n’ịkụ aka. O doro anya na ndị na-ege ntị dụnyeere anyị úkwù. Ihe agaraghị ndị ọrụ KGB dị ka ha si chee, ihe si na ya pụta kpasukwara ha iwe.

E Gboo Agụụ Ime Mmụọ

Ọ bụ ezie na ndị Kọmunist nwara ịkwụsị nkesa nke akwụkwọ anyị, mgbe ihe dị ka afọ 1965 gasịrị anyị nwere ike ibujere ụmụnna anyị ndị Kraịst akwụkwọ butụrụ ibu. Otú ọ dị, ọrụ ime nsụgharị na nzuzo na ibizi ya n’ebe zoro ezo were oge na ume dị ukwuu. N’izo aka n’ọrụ nzuzo m na usoro m ji ebu akwụkwọ, otu onye ọrụ KGB gwara m n’otu oge, sị: “Toom, i yiri igbe e megharịrị ikè ya emegharị.”

Otú ọ dị, anyị aghaghị inwe nzukọ anyị na nzuzo na n’ígwè ndị dị nta. Anyị mekwara nkwusa mberede. Ụmụnna anyị aghaghị ịdị njikere ka e nyochaa ụlọ ha n’oge ọ bụla. Ya mere a ghaghị iji nnọọ nlezianya zopụ akwụkwọ Watch Tower Society. Ma, ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị a, a chọtara ọtụtụ ndị nwere mmasị n’eziokwu Bible, ha wekwaara ọnọdụ ha n’akụkụ Alaeze ahụ.

Mgbe Praịm Minista Mikhail Gorbachev nke Soviet malitere ime mgbanwe ya n’afọ ndị 1980, anyị nwekwuuru onwe anyị ijere Chineke ozi. N’ikpeazụ, Soviet Union kewasịrị na 1991, a nakwekwaara Ndịàmà Jehova dị ka iwu si dị. Ugbu a anyị nwere ọgbakọ anọ na Tartu, na nso nso a anyị rụchakwara Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. E nwere ugbu a ihe karịrị Ndịàmà 3,800 na-ekere ókè n’ozi n’Estonia, n’iji ya atụnyere ikekwe mmadụ 40 ma ọ bụ 50 e nwere mgbe m malitere ime nkwusa ihe karịrị nnọọ ọkara otu narị afọ gara aga.

Ndụ Onye Kraịst Na-eju Afọ

Ọ dịtụbeghị mgbe m nwere obi abụọ ma m mere mkpebi ziri ezi mgbe m weere nguzo m ijere Jehova ozi. M na-eji obi jupụtara n’afọ ojuju dị ukwuu echetaghachi ihe ndị gara aga, na-enwe obi ụtọ ịhụ na ọgbakọ Jehova nọgidere na-aga n’ihu n’ike n’ike nakwa na a ka nwere ọtụtụ ndị ọzọ chọrọ ijere Jehova ozi.

Enwere m obi ekele dị ukwuu n’ebe Jehova nọ na ịhụnanya na nchebe ya akwagidewo mụ na nwunye m eri ọtụtụ afọ ndị a. Iburu n’uche na usoro ihe ezi omume nke Jehova dị nnọọ nso enyewo anyị ume ime mmụọ. N’ezie, ka anyị na-atụle ịrị elu dị ịtụnanya n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-efe Jehova ofufe, anyị kwenyesiri ike na ahụhụ anyị taworo abụghị n’efu.—Ndị Hibru 6:10; 2 Pita 3:11, 12.

[Map dị na peeji 12, 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Map na-egosi njem ahụ were ọnwa abụọ site na Tallinn ruo n’ogige Noril’sk ahụ a na-anọ akpa arụ

Tallinn

Pskov

St. Petersburg

Perm’

Yekaterinburg

Novosibirsk

Krasnoyarsk

Dudinka

Noril’sk

ÓGBÈ ARCTIC

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto dị na peeji nke 14]

Artur Indus, bụ́ onye Kraịst kwụsiri ike, nke nwụrụ n’ihi okwukwe ya

[Foto dị na peeji nke 14]

Ndị mkpọrọ na Siberia, 1956. Abụ m onye nke anọ site n’aka ekpe n’ahịrị dị n’azụ

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na nwunye m, n’ihu ebe bụbu isi ụlọ ọrụ ndị KGB bụ́ ebe a gbara anyị ajụjụ ọnụ ọtụtụ mgbe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya