Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Dị Nnọọ Njọ n’Ịgba Asịrị?
“N’ụlọ akwụkwọ dị elu anyị, ọ dị ka ntiwapụ nke ọrịa na-efe efe. Anyị adịghị eji ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ égbè eme ihe, ma ọ bụ alụ ọgụ—anyị na-agba asịrị. Nke ahụ bụ nnukwu nsogbu anyị nwere.”—Michelle dị afọ 16.a
ỤFỌDỤ na-asị na ọ na-atọ ụtọ. Ndị ọzọ na-asị na ọ bụ nsí. Ọ na-ejupụta na magazin, akwụkwọ akụkọ, na n’ihe omume telivishọn. Ọ na-emekwa ka ọtụtụ mkparịta ụka na-atọ ụtọ. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ mkparịta ụka nkịtị banyere ndị mmadụ na ihe ndị dịịrị ha, bụ́ nke a makwaara dị ka asịrị.
Ikekwe ọ dịghị ihe na-adọrọ uche anyị ngwa ngwa karịa okwu ahụ bụ́, “Ị̀ nụwo nke na-emenụ?” Ihe na-esochi okwu ndị ahụ pụrụ ịbụ eziokwu ma ọ bụ akụkọ e chepụtara echepụta—ma ọ bụ ikekwe nke bụtụcha ha abụọ. N’agbanyeghị nke ọ bụ, ọnwụnwa nke ịgba asịrị pụrụ ịbụ ihe siri ike. “O siri nnọọ ike ịghara inwe mmasị n’okwu aka ndị ọzọ,” ka Lori dị afọ 17, na-ekwu. “E nwere nkwekọrịta a na-ekwupụtaghị ekwupụta na-adị n’etiti gị na ndị enyi gị na mgbe ị nụrụ ihe na-akpali mmasị, ị ghaghị ịgwa ha.”
Ihe Mere Anyị Ji Eme Ya
N’ihi gịnị ka anyị ji ewere ịgba asịrị dị ka ihe na-akpali nnọọ mmasị? Otu ihe bụ na mmadụ bụ ihe e kere eke na-eso ibe ya akpakọrịta. Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Mgbe ahụ, ọ bụ nanị ihe dị otú o kwesịrị na mgbe ụfọdụ mkparịta ụka anyị ga-eche ihu n’ihe na-emenụ ná ndụ ndị enyi anyị na ndị anyị maara.
Nke a ọ̀ dị njọ? Ọ bụghị mgbe nile. Ọtụtụ mgbe, mkparịta ụka nkịtị na-enye ihe ọmụma bara uru, dị ka onye na-alụ di ma ọ bụ nwunye, onye ka mụpụrụ nwa, na onye na-arịa ọrịa. Ọbụna ndị Kraịst narị afọ mbụ kwurịtara ihe ndị na-emenụ mgbe ahụ ná ndụ nke ndị kwere ekwe ibe ha. (Ndị Efesọs 6:21, 22; Ndị Kọlọsi 4:8, 9) N’ezie, mkparịta ụka nkịtị banyere ndị enyi anyị na ndị anyị maara bụ akụkụ bụ́ isi nke otú anyị si enwe nkwurịta okwu ma nọgide na-enwe ezi mmekọrịta.
Ọnyà nke Asịrị Na-emerụ Ahụ
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ọ naghị abụ nanị nchebara echiche na-akpali ikwurịta banyere ndụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Deidra dị afọ 18, na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ na-agba asịrị ka a mara ha. Ha na-eche na ha ga-abụ [ndị a ma ama] n’ihi ịma akụkọ nke ka nke ahụ a ka kọpụụrụ ha mma.” Ọchịchọ ime ihe ga-amasị ndị ọzọ pụrụ ọbụna ịkwali onye na-agba asịrị ịgwagbu ihe mere eme n’ezie. “Ọ bụrụ na ị ma akụkọ ahụ, i nwere ike ịkọ ya otú dị gị mma,” ka Rachel dị afọ 17 na-akọwa. “Ọ dị ka akụkọ i chepụtara, ị pụkwara ime ka akụkọ ahụ ghara ịbụcha eziokwu otú i si chọọ.”
Mgbe ụfọdụ, a na-eji asịrị na-abụghị eziokwu eme ihe dị ka ụzọ isi megwara ihe. “Agbasara m asịrị ụgha banyere enyi m otu mgbe,” ka Amy dị afọ 12 na-ekwu. “Emere m ya n’ihi na o nwere ihe o kwuru banyere m.” Gịnị si na ya pụta? “Na mbụ anọ m na-eche sị, Ehee, emegwarala m ya nnọọ.” Otú ọ dị, Amy na-aga n’ihu ịkọwa, sị: “N’oge na-adịghị anya ọ gbasara, amalitekwara m inwekwu mwute n’ihi ime ya karịa ka m gaara enwe ma a sị na m kpuchiri ọnụ m ná mmalite.”
Dị ka otu ọkachamara ahụ ike uche si kwuo ya, ọ dị mfe ịhụ otú ịgba asịrị pụrụ isi ghọọ “ọkụ nke na-adịghị ekwe nchịkwa ngwa ngwa n’ezie.” (Tụlee Jemes 3:5, 6.) Mgbe nke a mere, ihe na-esi na ya apụta pụrụ ịdị oké njọ. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na a gbasaa ihe kwesịworo ịnọgide na-abụ ihe nzuzo? Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na asịrị ahụ abụghị eziokwu, i mebiekwa aha ọma mmadụ site n’ịgbasa ya? “Otu n’ime ndị enyi m malitere asịrị bụ́ na m na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, nke na-abụghị eziokwu,” ka Bill dị afọ 12, na-ekwu. “Nke ahụ na-egbu mgbu n’obi n’ezie.”
Ịkwụsị Asịrị Na-emerụ Ahụ
Bible nwere ezi ihe mere o ji na-ekwu na “ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.” (Ilu 18:21) Ee, okwu anyị pụrụ ịdị ka ngwá ọrụ ndị e ji ewu ihe ma ọ bụ dị ka ngwá agha e ji ebibi ihe. Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị taa na-eji ire ha eme ihe iji mezuo nke ikpeazụ ahụ. Ha dị ka ụfọdụ ndị ọbụ abụ bụ́ Devid kọwara dị ka ndị “mụworo ire ha dị ka mma agha, ha edowo akụ́ ha, bụ́ okwu dị ilu: ịgba onye zuru okè akụ́ n’ebe nzuzo dị iche iche.”—Abụ Ọma 64:2-4.
Ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ekwesịghị ịgbasa akụkọ na-abụghị eziokwu, n’ihi na Bible na-ekwu na “ihe arụ n’anya Jehova ka egbugbere ọnụ okwu ụgha bụ.” (Ilu 12:22) Ịkpachara anya malite ma ọ bụ ịkọrọ onye ọzọ ihe ị nụrụ nke ị maara na ọ bụghị eziokwu bụ ikwu okwu ụgha, Bible na-ekwukwa na ndị Kraịst ‘ga-atụpụ okwu ụgha’ na ka ha ‘na-ekwu eziokwu onye ọ bụla n’ebe onye agbata obi ya nọ.’—Ndị Efesọs 4:25.
N’ihi ya, tupu i kwuo ihe banyere onye ọzọ, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ maara ihe merenụ n’ezie? Ihe m ga-ekwu ọ̀ ga-eme ka onye na-ege m ntị ghara ịkwanyere onye ahụ m na-ekwu banyere ya ùgwù nke ọma? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị bụ nzube m ji na-ekwu ya?’ Cheta nke a: Eziokwu ahụ bụ́ na na ihe bụ eziokwu adịghị eme ka o zie ezie ịgbasa ya—karịsịa ma ọ bụrụ na ihe ahụ ga-emebi aha ọma mmadụ.
Ajụjụ ọzọ a ga-ajụ bụ, ‘Olee otú ịgba asịrị m ga-esi metụta aha ọma m?’ Ee, site n’ịgba asịrị ị na-ekwu ihe banyere onwe gị. Dị ka ihe atụ, Kristen na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ iji oge hà otú ahụ na-ekwu banyere ndị ọzọ, mgbe ahụ ndụ gị aghaghị ịbụ nke na-adịghị akpali mmasị.” Lisa chọpụtara na ya ịbụ onye a maara dị ka onye na-agba asịrị mere ka ezi enyi ya ghara ịtụkwasị ya obi. “O ruru n’ókè nke na ọ malitere inwe obi abụọ ma à pụrụ ịtụkwasị m obi,” ka ọ na-ekwu. “Ọ dị njọ nke ukwuu—aghaghị m igosi na ọ pụrụ ịdabere n’ebe m nọ.”
Ọ bụrụ na a maara gị dị ka onye na-agba asịrị, ndị mmadụ pụrụ ile gị anya dị ka onye pụrụ imerụ mmadụ ahụ, ha pụkwara ịkwụsị ịchọ isoro gị na-akpakọrịta. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Onye na-agba asịrị na-agagharị ma na-ekpughe ihe nzuzo; ya adịkwala ihe ga-ejikọta gị na onye ọnụ ya ghere oghe mgbe nile.” (Ilu 20:19, Beck) Ma ị̀ maara na ị pụrụ ịtụnye ụtụ n’asịrị na-emerụ ahụ ọbụna n’ekwughị okwu?
Ige Ntị—Akụkụ Ọzọ nke Ịgba Asịrị
Ọ chọrọ ma ọ dịkarịa ala mmadụ abụọ iji gbaa asịrị—onye na-ekwu ekwu na onye na-ege ege. Ọ bụ ezie na onye na-ege ya pụrụ iyi ka a gaghị ataru ya ụta otú a ga-ata onye na-ekwu ya ekwu, Bible nwere echiche dị iche n’okwu ahụ. N’Ilu 17:4, anyị na-agụ, sị: “Onye na-eme ihe ọjọọ na-atọ ntị n’ala n’egbugbere ọnụ na-ekwu ajọ ihe; onye okwu ụgha na-aṅa ntị ire na-ekwu ihe ịla n’iyi.” Ya mere, ụta dị ukwuu dịịrị onye na-ege asịrị. “N’ụzọ ụfọdụ ọ kadị njọ ịge asịrị karịa ịgba ya agba,” ka onye edemede bụ́ Stephen M. Wylen, na-ekwu. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a? “Site n’ịbụ onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-ege ntị,” Wylen na-ekwukwasị, “ị na-agba onye na-ekwu ya ume ịga n’ihu.”
Mgbe ahụ, gịnị ka i kwesịrị ime mgbe ị nụrụ asịrị na-emerụ ahụ? N’emeghị ka onye ezi omume n’anya onwe gị, ị pụrụ nanị ịsị: ‘Ka anyị kwuo ihe ọzọ’ ma ọ bụ, ‘Ahụ erughị m ala n’ezie ikwu banyere ihe a. E kwuwerị, ọ nọghị ebe a ịzara ọnụ ya.’
Ma gịnị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-eze gị eze n’ihi na ị naghị ekwe ekere òkè ná mkparịta ụka ha? N’otu echiche nke a pụrụ ichebe gị. N’ụzọ dị aṅaa? Cheta na onye na-agbara gị asịrị banyere ndị ọzọ yiri ka ọ ga-agbara ndị ọzọ asịrị banyere gị. N’ihi ya, ị pụrụ izere ịkpatara onwe gị nnukwu nsogbu site n’isoro ndị ntorobịa na ndị toworo eto bụ́ ndị na-adịghị akatọ ndị ọzọ na-akpachi anya. Wylen na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị ihe ọ bụla agbaghị asịrị furu gị, n’oge na-adịghị anya ị ga-ahụ na ọ dịghị ihe funahụworo gị ma ọ bụghị ohere ịkpatara onwe gị nhụsianya. N’ikpeazụ ọ ga-akara gị mma n’ihi na ị ga-abụ onye a maara dị ka onye a pụrụ ịtụkwasị obi.”
Nke kasị mkpa, ị ga-enwe aha ọma n’ebe Chineke nọ. O nwere mmasị n’ụzọ anyị si ekwu okwu banyere ndị ọzọ, n’ihi na Jisọs Kraịst dọrọ aka ná ntị, sị: “Okwu ọ bụla mmadụ ga-ekwu nke na-abaghị n’ihe, ha ga-aza ajụjụ banyere ya n’ụbọchị ikpe. N’ihi na a ga-esite n’okwu ọnụ gị nile gụọ gị n’onye ezi omume, a ga-esitekwa n’okwu ọnụ gị nile kpegbuo gị.”—Matiu 12:36, 37.
Mgbe ahụ, ọ bụ ụzọ nke amamihe ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́: “Na-ejisikwa ike ịnọdụ nwayọọ, na ime ihe nile nke aka unu.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11) Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịnọgide soro ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta dị mma na inwe nguzo dị mma n’ihu Chineke.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.
[Igbe dị na peeji nke 19]
“Ngwá Ọrụ A Kasị Eji Agba Asịrị n’Ụwa”
Ị̀ nụwo nke na-emenụ? N’ihi mmepụta nke ozi ígwè electronic, bụ́ ozi E-mail, asịrị abanyewo n’ógbè nkà na ụzụ ndị ike ya ugbu a. N’eziokwu, onye edemede bụ́ Seth Godin kpọrọ ozi E-mail “ngwá ọrụ a kasị eji agba asịrị n’ụwa.” Ọ bụ ezie na o kwetara na ọ bara uru, ọ na-adụ ọdụ, sị: “Mmadụ pụrụ iji ihe bụ́ eziokwu ma ọ bụ ihe e kwuhiere ekwuhie malite, na mberede ọtụtụ puku ndị mmadụ pụkwara isonye na ya.”
Ozi E-mail pụrụ irute ọtụtụ ndị aka—rutekwa ha ngwa ngwa. Godin na-ekwu, sị: “Ọ bụ usoro nzirịta ozi ọhụrụ mbụ nwere ma ikike ma echiche e leziri anya wepụta nke ihe e dere ede ma ịdị ngwa nke òkù telifon na ịchọ nlebara anya ozugbo.” Mgbe ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ijide n’aka na i mere ka nzube nke ozi gị doo anya, mgbe ị na-ezije ozi E-mail. N’ezie, ezijekwarala ndị enyi gị ozi a na-anwapụtaghị anwapụta.
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Onye na-agbara gị asịrị banyere ndị ọzọ . . . yiri ka ọ ga-agbara ndị ọzọ asịrị banyere gị