Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’August 25, 2008. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke July 7 ruo August 25, 2008.
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere ezi uche mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl? (Fil. 4:5) [be-IB p. 251 para. 3]
2. Olee otú ihe atụ Pọl gosiri mgbe ọ gwara ndị Grik nọ n’Ariopagọs okwu nwere ike isi nyere anyị aka mgbe anyị na-ezi ndị na-ewereghị Baịbụl dị ka o kwuchaa o bie ozi ọma? (Ọrụ 17:22, 23) [be-IB p. 252 para. 1-2]
3. Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ikwenyesi ike na ihe onye anyị na ya na-ekwurịta okwu kwuru abụghị eziokwu, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere ezi uche mgbe anyị na-azaghachi ya okwu? [be-IB p. 253 para. 1-2]
4. Ka anyị na-agbalị ikwu okwu n’ụzọ ga-eme ka e kwenye, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche? [be-IB p. 255 para. 3, igbe]
5. Olee otú anyị nwere ike isi jiri nghọta mee ihe mgbe anyị na-agbalị iru n’obi onye na-ege anyị ntị? (Ilu 20:5) [be-IB p. 258 para. 1-5]
IHE OMUME NKE 1
6. Gịnị ka ụmụnna nwaanyị kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-ahọrọ ọnọdụ okwu? [be-IB p. 44 para. 5-6]
7. Gịnị ka ụmụnna nwoke kwesịrị ịgbalị ịrụzu ka ha na-eme isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl? (Nehe. 8:8) [be-IB p. 47 para. 2-3]
8. Olee otú nwanna nwoke kwesịrị isi mee ihe omume e kenyere ya ná Nzukọ Ije Ozi, bụ́ nke nwere ihe ngosi ma ọ bụ ajụjụ ọnụ? [be-IB p. 49 para. 5]
9. Gịnị mere Pọl na Banabas ji jụ ihe ịchọ mma a na-eke n’isi, bụ́ ndị e ji okooko osisi mee, bụ́ ndị a chọrọ iji fee ha ofufe na Listra? (Ọrụ 14:8-18) [w90 5/15-IB p. 25, igbe nke atọ]
10. Gịnị ka ọkà okwu ihu ọha kwesịrị ime iji hụ na okwu ya dabeere na Baịbụl? (Ọrụ 17:2, 3) [be-IB p. 52 para. 6–p. 53 para. 2]
ỌGỤGỤ BAỊBỤL KWA IZU
11. Olee ihe mere onye Filipaị ahụ na-elekọta ụlọ nga ji chọọ “igbu onwe ya”? (Ọrụ 16:25-27) [w90 5/15-IB p. 25, igbe]
12. Gịnị ka Arịstakọs na Geyọs mere mgbe a na-akpagbu ha? (Ọrụ 19:29; 20:4, 5) [w08 2/15-IB p. 10 para. 16-17]
13. Gịnị ka Sọl ‘ịgba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ’ pụtara? (Ọrụ 26:14) [w03 10/1-IB p. 32]
14. Olee otú ‘ihe Chineke nyere ụmụ Izrel n’iwu si kpalie mmehie’? (Rom 7:8, 11) [w08 6/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Rom”]
15. Olee otú anyị si ‘ekpokwasị icheku ọkụ n’isi’ onye iro anyị? (Rom 12:20) [w08 6/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Rom”]