Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’August: E nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? September: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ ị gara na nke ha. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enweela akwụkwọ a enwee, mee ka ha hụ otú ha pụrụ isi rite uru na ya site n’igosi ha, n’ụzọ dị nkenke, otú e si eji ya amụ Baịbụl. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe ndị mmadụ gosiri mmasị, nye ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma kọwaara ha ihe dị na ya iji mara ma ị̀ ga-amalite iduziri ha ọmụmụ Baịbụl. November: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.
◼ A na-echetara ndị okenye ka ha soro ntụziaka ahụ e nyere n’Ụlọ Nche April 15, 1991, peeji nke 21-23, banyere ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị kewapụrụ onwe ha, bụ́ ndị chọrọ ka a nabataghachi ha.