Mgbakọ Ndị Pụrụ Iche Na-ewetara Jehova Otuto
1. Olee uru mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe kwa afọ bara?
1 Mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova na-enwe kwa afọ na-agba ha ume n’ofufe ha na-efe Chineke, ọ na-emekwa ka ha soro Ndị Kraịst ibe ha nọkọọ. Mgbakọ ukwu ndị Jehova na-enwe bụkwa ụzọ magburu onwe ya ha si eme ka ndị mmadụ mara aha Jehova, ma na-agbasa ozi ọma Alaeze ahụ.
2. Olee ohere mgbakọ ukwu ndị pụrụ iche na-enye anyị?
2 A na-ahaziri ụmụnna anyị niile mgbakọ distrikti kwa afọ n’ụwa niile. Mgbe ụfọdụkwa, a na-enwe mgbakọ ukwu ndị pụrụ iche ná mba ụfọdụ. Nke a na-enye anyị ohere igosi na nzukọ a zuru ụwa ọnụ, ọ na-enyekwa anyị ohere ịgbakwuru ndị mmadụ àmà.
3. (a) Ọ̀ ga-ekwe omume na mmadụ niile ga-aga mgbakọ ndị pụrụ iche a ga-enwe? Kọwaa. (b) Olee otú ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 14:40 ga-esi enyere anyị aka ma ọ bụrụ na a họrọghị anyị ịga?
3 Nhazi E Mere Ịhọ Ndị Ga-aganụ Ahọ: Ọtụtụ puku ụmụnna agaala mgbakọ ndị pụrụ iche. Ka oge na-aga, e nwere ike inwekwu ụmụnna ndị ga-aga otu n’ime mgbakọ ndị a. Ma, iji mezuo nzube nke mgbakọ ndị a pụrụ iche, nakwa iji hụ na ihe niile gara n’usoro nakwa n’ụzọ dị mma n’anya, e mere ndokwa ka alaka ụlọ ọrụ dị iche iche weta mmadụ ole na ole maka mgbakọ nke ọ bụla. Nke a ga-eme ka e nwee ndị ga-esi n’ụwa niile nọchite anya ụmụnna anyị, gbaa ụmụnna ndị a ga-eme mgbakọ ndị ahụ n’obodo ha ume, gbaakwara ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova àmà. Ma, ihe nke a pụtara bụ na ọ bụghị mmadụ niile tinyere akwụkwọ, bụ́ ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ bịanyere aka n’akwụkwọ ha, ka a ga-ahọrọ ịga nọchite anya anyị ná mgbakọ ndị a. Ọ ga-ewute ụfọdụ ndị ma ọ bụrụ na a họrọghị ha, ma anyị maara na mmadụ niile ga-aghọta ihe ndị mere o ji dị mkpa ka e mee ndokwa dị otú ahụ.—1 Kọr. 14:40.
4. Olee ndị na-ekpebi mmadụ ole ga-aga nọchite anya mba ha ná mgbakọ ndị pụrụ iche, n’ihi gịnịkwa?
4 Iji gbaara ndị mmadụ ezi àmà, anyị na-arịọ mmadụ niile ka ha kwado ndokwa ndị e mere maka mgbakọ ndị a pụrụ iche. Ọ bụrụ na ụmụnna ụfọdụ emee ndokwa nke aka ha ịga mgbakọ ndị a, n’agbanyeghị na a họrọghị ha ịga, ọ na-akpata nsogbu. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi mmadụ ole ga-anọchite anya mba ha ná mgbakọ pụrụ iche. Ihe mere nke a ji dị mkpa bụ ka mmadụ ghara ịkarị akarị n’ebe ndị a ga-anọ mee mgbakọ ndị ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ akarịa akarịa n’ebe ndị ahụ, ọ ga-eme ka ihe ghara ịga werewere ná mgbakọ ahụ ma wetara anyị aha ọjọọ n’ebe ndị ọchịchị obodo ahụ nọ.
5. (a) Olee ihe na-adịghị mma a hụrụ mgbe a gara Mgbakọ Pụrụ Iche nke Afọ 2003? (b) Olee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ga-enyere anyị aka izere àgwà ahụ na-adịghị mma?
5 N’afọ 2003, a chọpụtara na mmadụ ole na ole n’ime ndị a họọrọ isi na Nigeria gaa mgbakọ pụrụ iche na Ghana kpọ ụmụ ha ndị na-erubeghị ime njem ahụ gaa n’agbanyeghị ntụziaka niile alaka ụlọ ọrụ nyere ka a ghara ime otú ahụ. Nke a mere ka ahụ́ ghara iru ndị ọzọ so gaa mgbakọ ndị ahụ ala ebe ọ bụ na ha nọ na-eche ihe mere a ga-eji kwere ka ụfọdụ kpọrọ ụmụ ha ndị na-erubeghị afọ ole e kwuru gaa. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) A na-arịọ anyị ka anyị mee ihe ọ bụla a gwara anyị mee ka mgbakọ ahụ wee gaa nke ọma. Ọ bụrụ na anyị esetịpụrụ ụmụnna anyị ezi ihe nlereanya, ọ na-eme ka e nwee ịhụnanya na ịdị n’otu, ọ na-emekwa ka anyị na-akwadorịta onwe anyị.—1 Kọr. 16:16; Fil. 2:1-4.
6, 7. Olee ihe ndị a họọrọ ịga ga-eburu n’uche?
6 Ndị a họọrọ ịnọchite anya anyị ná mgbakọ ahụ kwesịrị iburu n’obi na nzube ha ji aga bụ iji mee ka ndị mmadụ marakwuo banyere Alaeze Chineke. A ga-aka emezu nzube a ma ọ bụrụ na ndị niile ga-aganụ akwado ndokwa ndị nzukọ a mere banyere ime njem ahụ na ihe ndị ọzọ, nakwa ma ha ghara ime ndokwa ndị nke aka ha.
7 N’afọ 2009, a ga-enwe mgbakọ pụrụ iche n’ebe dị iche iche n’ụwa niile. Ebe e kenyere Nigeria ịga mgbakọ a pụrụ iche bụ na Ghana. A họrọwala ndị ga-aga mgbakọ a. Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ahọpụtala ndị ha kwadoro ka ha gaa ma zitere alaka ụlọ ọrụ fọm ha. Anyị na-atụ anya na ndị niile a họọrọ ịga ga-eso ndị ga-esi mba ndị ọzọ abịa gbaa ezi àmà.
8. Ma ànyị ga-aga mgbakọ distrikti ma ànyị ga-aga mgbakọ pụrụ iche, olee otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà?
8 Ma à họọrọ anyị ịga mgbakọ pụrụ iche, ma ànyị ga-aga mgbakọ distrikti nke e kenyere ọgbakọ anyị, ka otú anyị si akpa àgwà kwa ụbọchị gosi na anyị ji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi, nakwa na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịsọpụrụ ya n’ihe niile anyị na-eme!—1 Kọr. 10:31; 1 Pita 2:12.