Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/08 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite n’August 11
  • Izu Na-amalite n’August 18
  • Izu Na-amalite n’August 25
  • Izu Na-amalite na September 1
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 8/08 p. 2

Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite n’August 11

Abụ nke 63

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị dị na magazin ndị ọhụrụ e nwere, bụ́ ndị ha chere ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwa ha ka ha kọọ kpọmkwem isi ihe ụfọdụ ndị dị n’isiokwu ndị ahụ bụ́ ndị ha chọrọ iji enyefe magazin ndị ahụ. Olee ajụjụ e nwere ike iji malite nkwurịta okwu? Olee amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ bụ́ nke e nweziri ike ịgụ? Mee ndokwa iji aro ndị a tụrụ mee ihe ngosi.

Nkeji 15: Na-eme Uche Chineke—N’enweghị Ihe Ndọpụ Uche. Okwu dabeere n’akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M,’ peeji nke 91-93, paragraf 12-13.

Nkeji 20: “Ị̀ Na-eji Ya Eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu?”a Gbaa onye nkwusa jitụrụla otu n’ime isiokwu ọhụrụ ndị ahụ dị n’Ụlọ Nche nke ọhaneze zie ozi ọma ajụjụ ọnụ. E nwere ike iji ahụmahụ ya mee ihe ngosi. Ọzọkwa, dabere n’ihe e kwuru na paragraf nke 2, mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi jiri isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs,” nke gbara n’Ụlọ Nche nke August 1, malite ọmụmụ Baịbụl.

Abụ nke 26

Izu Na-amalite n’August 18

Abụ nke 135

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit.” Maa ọkwa ụbọchị unu ga-enwe mgbakọ sekit unu ma ọ bụrụ na unu amatala ya. Chetara ndị na-ege ntị ka ha jiri Ụlọ Nche ha nke September 1 na Teta! July–September bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ, nakwa ka ha kwadebe ikwu otú a ga-esi nyefee ha n’ókèala unu.

Nkeji 20: Uwe na Ejiji Anyị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ. Okwu okenye ga-ekwu. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke nke dị nsọ, ndị Chineke anaghị eji ịdị ọcha elu ahụ́ egwuri egwu. (Ọpụ. 30:17-21; 40:30-32) Anyị iyi ezigbo uwe na iji ejiji dị mma n’anya, karịsịa mgbe anyị nọ n’ozi, na-eme Jehova obi ụtọ ma na-ewetara ya otuto. (1 Pita 2:12) N’aka nke ọzọ, anyị ịghara ime otú ahụ nwere ike ime ka ‘a katọọ okwu Chineke.’ (Taị. 2:5) Kọọ ahụmahụ mere n’ógbè unu ma ọ bụ nke e bipụtara ebipụta nke otú iji ejiji dị mma si nye mmadụ ohere ịgba àmà.

Nkeji 15: Ndị Ntorobịa Na-agba Ezigbo Àmà. Okwu ga-agba ndị nne na nna na ụmụ ha bụ́ ndị ụlọ akwụkwọ ha ga-emepe n’oge na-adịghị anya ume. Chetara ndị na-eto eto ka ha jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa àmà. Dabere n’otú oge e nwere hà, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ otú ha si gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ.

Abụ nke 61

Izu Na-amalite n’August 25

Abụ nke 24

Nkeji 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche,” ma maa ọkwa mgbe ọzọ unu ga-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ma ọ bụrụ na unu amatala ya.

Nkeji 15: Mkpa ọgbakọ.

Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche nke September 1 na Teta! nke July–September. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Kọwatụ isi ihe ndị dị na magazin ndị a, ma jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu. Olee ajụjụ na amaokwu Baịbụl e nwere ike iji malite mkparịta ụka? Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi jiri otu aro dị n’Ozi Alaeze Anyị nyefee magazin ndị ahụ. Gwa otu okenye ka o mee ihe ngosi dị mkpirikpi ọ kwadebere nke dabeere n’isiokwu nke ga-adaba n’ókèala unu.

Abụ nke 196

Izu Na-amalite na September 1

Abụ nke 112

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọnwa August.

Nkeji 20: Ha Nọ Naanị Ha Ma E Chefughị Ha. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke April 15, 2008, peeji nke 25-28. Kpọọ aha ndị ọgbakọ unu bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Ọ bụrụ na e nweghị, jiri ụkpụrụ ndị dị n’isiokwu ahụ gbaa ọgbakọ ume ka ha nyere onye ọ bụla ahụ́ na-esikwaghị ike ma ọ bụ ndị na-enweghịzi ike iso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ dị ka ha na-emebu.

Nkeji 15: Malite Ọmụmụ Baịbụl Mgbe Mbụ Ị Gara na nke Mmadụ na September. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. N’ọnwa September, anyị ga na-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gbalịa iso onye nwe ụlọ tụlee paragraf ole na ole n’oge mbụ anyị gara na nke ya. Tụleghachi aro ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2006 ma mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ ga-egosi otú a ga-esi amalite ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ a gara na nke mmadụ.

Abụ nke 74

[Ihe odide ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya