Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/08 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka NzuKỌ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka NzuKỌ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na September 8
  • Izu Na-amalite na September 15
  • Izu Na-amalite na September 22
  • Izu Na-amalite na September 29
  • Izu Na-amalite n’October 6
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 9/08 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka NzuKỌ Ije Ozi

BURUNỤ NKE A N’UCHE: N’Ozi Alaeze Anyị, a ga-enwe usoro ihe omume maka Nzukọ Ije Ozi kwa izu n’oge mgbakọ distrikti. Ọgbakọ dị iche iche ga-eme mgbanwe dị ka o kwesịrị ka ha wee nwee ohere ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu!” Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ, jirinụ nkeji iri na ise tụleghachi ndụmọdụ na ihe ndị a ga-echeta banyere mgbakọ distrikti ndị metụtara ọgbakọ unu, bụ́ ndị pụtara n’ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a. Otu ọnwa ma ọ bụ abụọ unu lọtasịrị mgbakọ unu, wepụtanụ ihe dị ka nkeji iri na ise ma ọ bụ nkeji iri abụọ ná Nzukọ Ije Ozi (ma eleghị anya oge e dokwara iji tụlee mkpa ọgbakọ) iji tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ, bụ́ ndị ndị nkwusa chọpụtara na ha nyeere ha aka n’ozi ha. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi kwesịrị ime ihe omume a. Jụọ ndị na-ege ntị otú ha si na-etinye ihe ndị ha mụtara n’ọrụ ná mgbakọ a n’ozi ha ma ọ bụ atụmatụ ha na-eme iji tinye ha n’ọrụ n’ozi ha.

Izu Na-amalite na September 8

Abụ nke 204

Nkeji 8: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị dị na magazin ndị ọhụrụ bụ́ ndị masịrịla ndị bi n’ókèala unu karịa. Jụọ ha ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị ha jirila dọta mmasị ndị mmadụ n’isiokwu ndị ahụ. Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.

Nkeji 12: Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịghọ Ndị Nkụzi. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke January 15, 2007, peeji nke 29-30, paragraf nke 14-20. Mee ndokwa ka e mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke na-egosi ebe onye nkwusa na-akọwara onye ọ malitere ịmụrụ Baịbụl ọhụrụ otú e si ekwu okwu ihu ọha na otú e si eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma na-akpọ ya òkù ịbịa ọmụmụ ihe.

Nkeji 25: “Oge Anyị Ga-eji Rie Nri Ime Mmụọ Ma Nwee Ọṅụ.”a Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ihe omume a. Kwuo mgbakọ nke e kenyere ọgbakọ unu ịga. Tụlee ihe dị n’igbe bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti.”

Abụ nke 127

Izu Na-amalite na September 15

Abụ nke 94

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa September. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Nkeji 20: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Gara Aga? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-ekwu. Tụleghachi akụkọ ozi ọgbakọ unu maka afọ ije ozi gara aga, lekwasịkwa anya n’ezigbo ihe ndị unu rụzuru. Jaa ọgbakọ mma n’ebe ha mere nke ọma. Mee ndokwa tupu oge eruo maka otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ịkọ ahụmahụ pụrụ iche ha nwere. Kwuo otu ebe ma ọ bụ abụọ ọgbakọ unu kwesịrị ịrụ ọrụ n’afọ na-abịa abịa, tụọkwara ha aro ndị ga-enyere ha aka inwe ọganihu.

Nkeji 15: Imeri Ịkpọasị n’Ozi Anyị. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’ihe nzukọ a bipụtarala banyere otú ịkpọasị nwere ike isi metụta ozi anyị. Kọwaa otú e nwere ike isi merie ụdị ịkpọasị ahụ. Mgbe ụfọdụ, àgwà anyị, ma mgbe anyị nọ n’ozi ubi ma mgbe anyị na-eme ihe ndị ọzọ dịịrị anyị kwa ụbọchị, nwere ike ime ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ anyị asị ma meghee obi ha ịnabata eziokwu Baịbụl. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya banyere ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme mgbe niile. (1 Pita 2:12; 3:1, 2) Kọọ ahụmahụ ole na ole mere n’ókèala unu ma ọ bụ ndị e bipụtara ebipụta bụ́ ndị na-egosi otú e nwere ike isi merie ịkpọasị.

Abụ nke 51

Izu Na-amalite na September 22

Abụ nke 104

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Tụlee akwụkwọ ozi sitere n’aka alaka ụlọ ọrụ, bụ́ nke dị na peeji nke 1.

Nkeji 15: Ụgwọ Ọrụ Dịịrị Ọrụ Unu. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche April 15, 2005, malite na peeji nke 28, paragraf nke 6, ruo n’ọgwụgwụ nke peeji nke 29. Gbaa otu onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ banyere otú Jehova si gbooro ha mkpa anụ ahụ́ ha ma ọ bụ gbaa ha ume.

Nkeji 20: “Sochie Nzọụkwụ Ya Anya.”b Dabere n’oge e nwere, jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị amaokwu Baịbụl ndị a kpọtụrụ uche na ha na-ekwu.

Abụ nke 190

Izu Na-amalite na September 29

Abụ nke 45

Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi maka ọkara nke abụọ nke ọnwa September.

Nkeji 20: “Bụrụ Onye Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Site n’Ịbụ Onye Nkwusa Na-ejechi Ozi Anya.”c Kpọọ ndị mmadụ ka ha gụọ paragraf nke 3 na nke 4.

Nkeji 20: “Otú Ndị Kraịst Si Ele Aghụghọ Ule Anya.”d Mgbe a na-atụle paragraf nke 7, jụọ mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ, bụ́ ndị zeere aghụghọ ule, otú ha si mee ya. Mee ka o doo anya na ihe nyeere ha aka bụ inwe akọnuche ziri ezi.

Abụ nke 2

Izu Na-amalite n’October 6

Abụ nke 15

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Nkeji 15: Igbe Ajụjụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Kwuo okwu n’ihe dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 2005, peeji nke 20-22, paragraf nke 10-16.

Nkeji 20: “Kụziere Ndị Ọzọ Ịhụ Jehova n’Anya.”e Dabere n’oge e nwere, jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị dị n’amaokwu Baịbụl ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 132

[Ihe odide ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

e Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya