Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/08 p. 3
  • “Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 9/08 p. 3

“Sochie Nzọụkwụ Ya Anya”

1. Olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ezigbo ndị ozi?

1 Jizọs agụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị rabaị, ma ọ bụ Onye Ozi kasịnụ a kọtụrụla n’akụkọ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na e dekọrọ ihe banyere ozi Jizọs n’akwụkwọ maka abamuru anyị. Iji bụrụ ezigbo ndị ozi, ọ dị mkpa ka anyị “sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 Pita 2:21.

2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịhụ ndị mmadụ n’anya otú Jizọs si hụ ha?

2 Gosi na Ị Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya: Ọ bụ ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kpaliri ya izi ha ihe. (Mak 6:30-34) Ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị nọ “n’ihe mgbu,” eziokwu dịkwa ha oké mkpa. (Rom 8:22) Ọ bụrụ na anyị echeta na ọnọdụ ha adịghị mma, chetakwa na Jehova hụrụ ha n’anya, nke a ga-akpali anyị ịnọgide na-ezi ha ozi ọma. (2 Pita 3:9) Ọzọkwa, ọ ga-adịrị ndị mmadụ mfe ige ntị n’ozi ọma anyị ma ha chọpụta na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe ha nọ.

3. Olee ohere ndị Jizọs ji zie ndị mmadụ ozi ọma?

3 Jiri Ohere Ọ Bụla Dapụtaranụ Zie Ozi: Jizọs ji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ndị mmadụ ozi ọma. (Mat. 4:23; 9:9; Jọn 4:7-10) Dị ka Jizọs, anyị kwesịrị ịdị njikere ikwu banyere eziokwu ahụ ka anyị na-eme ihe dịịrị anyị kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-edebe Baịbụl na akwụkwọ e ji amụ Baịbụl nso ka ha wee nwee ike ịgba àmà n’ụlọ ọrụ ha, n’ụlọ akwụkwọ ha, mgbe ha na-eme njem, mgbe ha na-azụ ahịa, na n’oge ndị ọzọ.

4. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Alaeze ahụ bụrụ isiokwu nke ozi ọma anyị?

4 Lekwasị Anya n’Alaeze Ahụ: Alaeze ahụ bụ isiokwu nke ozi ọma Jizọs. (Luk 4:43) Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ghara ịkpọ Alaeze ahụ aha ozugbo ma ọ bụ ná mmalite, anyị kwesịrị iburu n’uche inyere onye nwe ụlọ aka ịhụ na Alaeze ahụ dị ya mkpa. Ọbụna mgbe anyị na-ekwu banyere ọnọdụ ụwa ndị na-egosi na anyị na-ebi n’oge ikpeazụ, ọrụ anyị bụ́ isi bụ ‘izisa ozi ọma nke ihe dị mma.’—Rom 10:15.

5. Ka anyị wee nwee ike izi ozi ọma nke ọma, gịnị ka anyị kwesịrị iji Baịbụl mee?

5 Dabere n’Okwu Chineke: N’oge niile Jizọs jere ozi ọma, o ji Akwụkwọ Nsọ kwado ihe ọ na-ekwu. O zighị ozizi nke ya. (Jọn 7:16, 18) Ọ mụrụ Okwu Chineke, jirikwa ya chebe onwe ya mgbe Setan na-anwa ya. (Mat. 4:1-4) Iji nwee ike ịkụziri ndị mmadụ ihe nke ọma, ọ dị mkpa ka anyị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-etinye ihe anyị gụtara n’ọrụ. (Rom 2:21) Mgbe anyị na-aza ajụjụ ndị a jụrụ anyị n’ozi ọma, anyị kwesịrị ikwu ebe ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ ma gụọ ya kpọmkwem site na Baịbụl anyị mgbe ọ bụla o kwere omume. Anyị chọrọ ka onye nwe ụlọ mara na anyị anaghị ekwu okwu nke aka anyị kama na anyị na-ekwu ihe bụ́ uche Chineke.

6. Olee ihe Jizọs mere iji hụ na ihe ọ kụziri ruru ndị na-ege ya ntị n’obi?

6 Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Ruo n’Obi Ndị Mmadụ: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” (Jọn 7:46) Nke ahụ bụ ihe ndị ọrụ nche ahụ kwuru banyere Jizọs mgbe ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụrụ ha ihe mere na ha ejideghị Jizọs. Nkụzi Jizọs abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ ihe ndị ha na-amabughị, kama nke ahụ, ọ kụziri ihe otú o ruru ndị ọ na-akụziri ya n’obi. (Luk 24:32) Ihe atụ ndị e nwetara site n’ihe ndị na-eme kwa ụbọchị mere ka okwu ya metụ ndị mmadụ n’ahụ́. (Mat. 13:34) Jizọs akọjughị ndị na-ege ya ntị isi. (Jọn 16:12) O mere ka ha chewe banyere Jehova, ọ bụghị ka ha chewe banyere ya onwe ya. Dị ka Jizọs, anyị nwere ike ịghọ ezi ndị nkụzi naanị ma ọ bụrụ na anyị ‘ana-elezi ozizi anyị anya mgbe niile.’—1 Tim. 4:16.

7. Olee ihe mere Jizọs ji nọgidesie ike n’ozi ya?

7 Nọgidesie Ike n’Agbanyeghị Enweghị Mmasị na Mmegide: N’agbanyeghị na Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, ọtụtụ ndị egeghị ya ntị. (Luk 10:13) Ọbụna ndị ezinụlọ Jizọs chere na “isi emebiela ya.” (Mak 3:21) N’agbanyeghị nke ahụ, ike agwụghị Jizọs. Ọ nọgidere na-enwe olileanya n’ihi na o doro ya anya na ya nwere eziokwu nke nwere ike ime ka ndị mmadụ nwere onwe ha. (Jọn 8:32) Site n’enyemaka Jehova, anyị ekpebisiekwala ike na ike agaghị agwụ anyị.—2 Kọr. 4:1.

8, 9. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs n’ịchụ àjà maka ozi ọma ahụ?

8 Chụọ Àjà Ndị Dị Mkpa Iji Na-ejechi Ozi Anya: Jizọs hapụrụ ihe ndị gaara ime ka ahụ́ ruo ya ala n’ihi ozi ahụ. (Mat. 8:20) Ike ikwusa ozi ọma agwụghị ya, mgbe ụfọdụ o kwusakwara ya ruo chi ojiji. (Mak 6:35, 36) Jizọs maara na a gụrụ oge o nwere iji rụọ ọrụ ya ọnụ. Ebe ọ bụ na “oge fọdụrụ dị ntakịrị,” ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa iji ihe ndị dị ka oge anyị, ike anyị, na ihe onwunwe anyị chụọ àjà dị ka Jizọs mere.—1 Kọr. 7:29-31.

9 Ihe mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji nwee ihe ịga nke ọma n’ozi ha bụ na ha mụtara ihe n’aka Jizọs. (Ọrụ 4:13) Anyị onwe anyị kwa nwere ike ijezu ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị eṅomie Onye Ozi ahụ kasịnụ e nwetụrụla n’ụwa.—2 Tim. 4:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya