Oge Anyị Ga-eji Rie Nri Ime Mmụọ Ma Nwee Ọṅụ
1. Olee otú Jehova si ahụ maka mkpa ime mmụọ nke ndị na-ejere ya ozi?
1 Jehova na-eji ịhụnanya ahụ maka mkpa ime mmụọ nke ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ ezie na ụwa niile nọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ, anyị na-eriju nnọọ afọ. (Aịza. 65:13) Otu ụzọ Jehova si azụ anyị n’ụzọ ime mmụọ bụ site ná mgbakọ distrikti anyị na-enwe kwa afọ. Ì mewela ndokwa ịgazu ụbọchị niile nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu”? A kwadeberela anyị nri ime mmụọ dị ụtọ ma na-edozi ahụ́.
2. Olee ihe ibu ụzọ eme atụmatụ banyere mgbakọ gụnyere?
2 Buru Ụzọ Mee Atụmatụ: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” (Ilu 21:5) N’ihi ya, ka ị na-eme atụmatụ ịbịazu ụbọchị atọ nke mgbakọ ahụ, egbula oge ịgwa onye ị na-arụrụ ọrụ ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa inweta ikike iji gaa. Ọ bụrụ na ị ga-ehi ehi, ì meela ndokwa ebe ị ga-ehi? Ọ ga-adịkwa mkpa ka i mee atụmatụ maka nri ehihie gị ka i wee nwee ike iso ụmụnna gị rie ihe n’ụlọ mgbakọ ahụ. Mee ndokwa irute n’ebe ahụ a na-eme mgbakọ n’oge kwa ụbọchị ka i wee nwee ike ịchọta ebe ị ga-anọ ma soro n’abụ na ekpere mmeghe.
3. Olee ụdị uwe anyị kwesịrị iyi?
3 Anyị kwesịrị ịhụ na uwe anyị ga-eyi ga-adị mma n’anya ma ghara ịdọpụ uche ndị mmadụ. (1 Tim. 2:9, 10) Mgbakọ distrikti na-enye anyị ohere magburu onwe ya iji gbaara ndị bi n’ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ àmà. Ọ bụrụ na anyị ana-eyi uwe dị mma n’anya ma na-eyi baajị mgbakọ anyị, anyị ga-adị iche n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ ma dọta mmasị ndị na-ahụ anyị.
4. Olee ihe ga-enyere anyị na ndị ezinụlọ anyị aka irite uru kasịnụ n’ihe a ga-ekwu ná mgbakọ?
4 Gee Ntị Nke Ọma: Anyị agaghị achọ ka ọbụna obere nri dapụnahụ anyị n’oriri ime mmụọ a anyị na-aga! (Ilu 22:17, 18) Ịdị na-emepe Baịbụl anyị mgbe a na-agụ amaokwu dị iche iche na idetu obere ihe ga-enyere anyị aka ime ka uche anyị dịgide n’ihe a na-amụ, nyekwara anyị aka izere ihe ọ bụla ga-adọpụ anyị uche. Ná mgbede, anyị nwere ike iji ihe ndị anyị deturu kọọrọ ndị ọzọ isi ihe ndị masịrị anyị n’ihe ndị e kwuru n’ụbọchị ahụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, a chọpụtala na ụfọdụ ndị na-eto eto na-anọkọta ọnụ ná mgbakọ, na-akọrị akụkọ ma jiri ekwe ntị ha na-ezigara ndị ọzọ ozi ka ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na anyị nwere ụmụ, nke gụnyere ndị dị afọ iri na ụma, o nwere ike ịbara anyị uru ma anyị na ha nọkọta ọnụ ka ezinụlọ ma gere ihe a na-ekwu kama ikwe ka ha hapụ anyị gaa nọnyere ndị na-eto eto ndị ọzọ.
5. Olee otú anyị nwere ike isi nụkwuo ụtọ mgbakọ?
5 Gị na Ndị Ọzọ Kpakọrịta: Nri dị ụtọ na-atọkwu ụtọ mgbe gị na ndị enyi gị rikọrọ ya ọnụ. (Ilu 15:17) N’otu aka ahụ, anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ịkpakọrịta na-eme ka mgbakọ anyị tọkwuo anyị ụtọ. N’ihi ya, mgbe a kwụsịtụrụ ihe omume, ọ ga-abụ nnọọ ihe magburu onwe ya ịkpakwuru ndị ọzọ bịara mgbakọ! (Ọma 133:1) Mgbe onyeisi oche gbara anyị ume ka anyị gaa nọdụ ala tupu abụ olu ụtọ amalite, anyị kwesịrị ịkwụsị mkparịta ụka anyị ma gaa were oche chere mgbe ihe omume ga-amalite.
6. Kọọ ahụmahụ nke onwe gị nke na-egosi otú anyị nwere ike isi zie ndị mmadụ ozi ọma n’ebe e nwere mgbakọ.
6 Jiri Ohere Ọ Bụla Ị Hụrụ Gbaa Àmà: Oge mgbakọ distrikti na-enyekarị anyị ohere magburu onwe ya ịgba àmà. Ndị na-eresị ndị mmadụ nri na ndị ọzọ na-ajụ ndị bịara mgbakọ, bụ́ ndị gara iri nri n’ụlọ nri ma ọ bụ n’ebe ndị a na-ere nri ahịa banyere isiokwu mgbakọ e dere na baajị ha. Nke a emeela ka ha malite nkwurịta okwu, meekwa ka ha gbaara eziokwu ahụ ezigbo àmà. A kpọọkwala ụfọdụ n’ime ha ka ha bịa mgbakọ ahụ, ha abịa.
7. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gaa mgbakọ distrikti na-abịa abịa?
7 O were ọtụtụ puku awa iji kwadebe usoro ihe omume ahụ, hazie ebe a ga-anọ nwee mgbakọ, hazie ngalaba dị iche iche nke mgbakọ ahụ, kwadebekwa okwu ndị a ga-ekwu. Mgbalị niile e ji ịhụnanya mee n’ịkwadebe oriri ime mmụọ a na-egosi na Jehova ji ịhụnanya elekọta ndị ya. Ka anyị niile soro bịa ma rijuo afọ! Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, n’adịghị ka ụwa, anyị ga-eti “mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị [anyị] mma.”—Aịza. 65:14.
Igbe dị na peeji nke 4]
Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti
◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite mgbe o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Mgbe a kpọnyere abụ olu ụtọ e ji amalite nnọkọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka ihe omume wee nwee ike ịmalite n’ụzọ dị ùgwù. Ihe omume nke ụbọchị Friday na Saturday ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi ebe nke ụbọchị Sunday ga-emechi n’elekere anọ nke uhuruchi.
◼ Ịdọba Ụgbọ: N’ebe niile a ga-eme mgbakọ, ndị atendantị ga na-enyere ndị mmadụ aka ịma ebe ha ga-adọba ụgbọ ha. Biko gbasoo ntụziaka ha.—1 Kọr. 14:40.
◼ Ịchọtara Ndị Ọzọ Oche: I nwere ike ịchọtara ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ oche.
◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa kama isi n’ebe a na-eme mgbakọ na-apụ n’oge nkwụsịtụ nke ehihie ịga nweta nri. I nwere ike iji obere igbe nri nke nwere ike ịba n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata igbe nri ndị buru oké ibu na ihe ndị na-akụwa akụwa n’ebe a na-enwe mgbakọ, a chọghịkwa ka e webata mmanya na-aba n’anya n’ebe ahụ.
◼ Onyinye: Anyị nwere ike igosi ekele anyị nwere maka mgbakọ anyị site n’inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ ná mgbakọ distrikti. N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a ga-enye n’onyinye ná mgbakọ distrikti, e kwesiri ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Ọghọm na Ihe Mberede: Ọ buru na e nwee onye nọ n’ala mgbakọ daa ọrịa nke e kwesiri ime ihe ngwa ngwa banyere ya, biko, gwa onye atendantị nọ nso, bụ́ onye ga-eme ka ndị na-arụ n’Ebe Ịnara Ọgwụ mara ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara onye ahụ ahụ́ na-adịghị anya ma nyere ya aka.
◼ Kpachara Anya Mgbe Ị Na-anya Ụgbọala: Biko, kpachapụ anya mgbe ị na-agba n’okporo ụzọ, rubekwa isi n’iwu okporo ụzọ mgbe ị na-abịa mgbakọ na mgbe ị na-ala. Ndị Kraịst maara na ndụ dị nsọ, n’ihi ya kwa, ha na-edebe iwu niile e nyere maka iji zere ihe ọghọm. (Ọma 36:9) Ụmụnna ndị na-ahụ maka ụgbọala ọgbakọ ji aga mgbakọ kwesịrị ịgba onye ọkwọ ụgbọala ume ka ọ ghara ịgba ọnwụ ọnwụ, kama, ka o jiri nwayọọ mgbe ọ na-anya ụgbọala iji zere ihe ọghọm.
◼ Itinye Ihe A Na-ekwu na Teepu: E kwesịghị ịkwụnye ihe ọ bụla e ji etinye ihe na teepu n’ọkụ eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị dị n’ala mgbakọ, e nwekwara ike itinye ihe ndị a na-eme na teepu naanị ma ọ bụrụ ọ gaghị adọpụ uche ndị ọzọ n’ihe a na-ekwu.
◼ Ise Foto: Ọ bụrụ na ị chọrọ ise foto n’oge ihe omume na-aga n’ihu, biko, ejila ọkụ kamera. O kwesịghị ekwesị ka mmadụ gaa ise foto mgbe ihe omume na-aga n’ihu. E kwesighịkwa ikwe ka ndị ji ise foto akpa ego bata n’ebe a na-enwe mgbakọ na-ese ndị mmadụ foto, ọ bụrụgodị na ha bụ Ndịàmà.
◼ Fọm A Ga-edejupụta Mgbe Mmadụ Gosiri Mmasị: E kwesiri iji fom Please Follow Up (S-43) dee banyere onye ọ bụla gosiri mmasị mgbe anyị gbaara ya àmà n’oge anyị gara mgbakọ distrikti. Ndị nkwusa kwesiri iji otu fọm a ma ọ bụ abụọ bịa mgbakọ. I nwere ike inye odeakwụkwọ ọgbakọ fọm nke i dejupụtara edejupụta mgbe unu lọtara ka o nwee ike ime ihe banyere ya.
◼ Ebe Ire Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Sọpụrụ aha Jehova site n’ịkpa ezi àgwà n’ebe ndị a na-ere nri. O kwesịghị ekwesị ịzụ ndị na-ere nri na ndị ahịa mbugharị ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịzụ ihe ọ bụla, ọ ga-akasị mma ka o mee otú ahụ tupu ihe omume amalite ma ọ bụ mgbe ihe omume kwụsịrị.
◼ Ihe Nkiri: Ọ bụrụ na ụmụnna nwaanyị afụrụ ịchafụ ndị buru oké ibu n’ehihie Sunday mgbe a na-eme ihe nkiri, ha adịghị egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya ebe ọ bụ na nke a ga-eme ka ndị nọ ha n’azụ ghara ịhụ ihe a na-eme. Nke a dị mkpa karịsịa n’ihi ụzọ di mfe e si rụọ Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a pụrụ iji mee mgbakọ bụ́ ndị e ji na-eme ihe ugbu a.
◼ Ụlọ Obibi: Gosi na i nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ị gara ka e nye gị ụlọ n’oge ị bịarutere n’ebe a na-eme mgbakọ. Anọla n’ụlọ ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ngalaba Na-enye Ụlọ nyere gị ya. Rubere ndị na-enye ụlọ isi site n’ịnọ naanị n’ebe e nyere gị ụlọ. O kwesighịkwa ekwesị ka ụmụnna nwoke nọrọ n’ebe e nyere ụmụnna nwaanyị ụlọ ruo mgbe chi jimiri ma ọ bụ ọbụna hie n’ebe ahụ, ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ime nke a. Sie nri naanị n’ebe ndị a kwadoro ka a nọrọ na-esi nri. Isi nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu anaghịkwa egosi na anyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (Luk 10:38-42) Ọ bụrụ na nsogbu ọ bụla adapụta n’ihe metụtara ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ngalaba na-enye ụlọ ozugbo o kwere gị mee mgbe ị ka nọ n’ala mgbakọ.
◼ Ikpofu Ihe n’Ebe Kwesịrị Ekwesị: Ndị nne na nna kwesịrị ịzụ ụmụ ha azụ ka ha wee ghara iji wọtapruf e ji ṅụpụ mmiri oyi, mkpo ihe dị iche iche, na ihe mkpofu ndị ọzọ, metọọ ụlọ mgbakọ, karịsịa na gburugburu ebe ha nọ ọdụ. Nke a gụnyekwara gburugburu Ụlọ Mgbakọ. A ga-edebe ihe ndị buru ibu a ga na-atụba ihe mkpofu ka o wee dịrị mmadụ niile, gụnyere ụmụaka, mfe ịtụfu ihe n’ebe kwesịrị ekwesị, a ga-edowekwa ole ga-ezunụ. Ọ dị mma ịzụ ụmụaka malite mgbe ha ka dị obere ka ha mata mkpa ọ dị ime ka ebe ọ bụla ha nọ dị ọcha.