Otú Ndị Kraịst Si Ele Aghụghọ Ule Anya
1 Ezi Ndị Kraịst niile kweere ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Hibru 13:18, nke bụ́: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” Anyị na-achọ ime otú ahụ n’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa na-emikpukwu n’omume rụrụ arụ kwa ụbọchị. Emeghị ihe n’eziokwu eruola ebe niile, ma n’ule ụlọ akwụkwọ. Mmadụ ịchọ ime nke ọma n’ule ka e wee nwee ike ibuli ya n’ọkwá ma ọ bụ iji nwee ike ịbanye na mahadum emekwuola nnọọ ka ndị mmadụ na-achọ ime nke ọma n’ule n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu.
2 Otú E Merurula Ya: Ndị na-ele ule na-aghọ ụdị aghụghọ dịgasị iche iche iji mee nke ọma. Ụfọdụ aghụghọ ndị a bụ iji mpempe akwụkwọ e dere azịza ule na ha aga ebe a na-ele ule, idere ihe onye nọ mmadụ n’akụkụ n’ebe a na-ele ule dere, inweta azịza nke ajụjụ ndị a ga-ajụ tupu ụbọchị ule, iji ekwe ntị enweta azịza ule, ma ọ bụ ọbụna ide azịza ule n’akụkụ ahụ́ ọ ga-esiri onye ọzọ ike ịhụ. Ụfọdụ na-etinyedị aha ha ile ule ma kwụzie ndị ọzọ ụgwọ ka ha lechitere ha ule ahụ.
3 E nweela otú ọzọ e si aghọ aghụghọ ule. Ndị isi ụlọ akwụkwọ ụfọdụ na-agwa ụmụ akwụkwọ ha ga-ele ule ka ha kwụọ ego espo a na-akpọ “cooperation fee.” A na-enye ndị kwụrụ ụgwọ ahụ kaadị ha ga-eji abanye n’ebe a na-ele ule bụ́ ebe a hazirila maka aghụghọ ule. Anyị na-anụ na ụfọdụ nne na nna na-agba ụmụ ha ume ka gaa lee ule n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-akpọ “cooperative schools,” bụ́ ebe a na-aghọ aghụghọ ule. Ndị ọzọ na-eto eto na-edokọta ego ma kwụọ ego espo n’emeghị ka ndị mụrụ ha mara.
4 N’ebe ndị ọzọ, a na-amanye ụmụ akwụkwọ ịkwụ ya. Dị ka ihe atụ, e yiri otu nwanna nwaanyị egwu na ọ bụrụ na o wetaghị ego espo nke ya, na a gaghị ekwe ya lee ule. Nwanne ya nwoke, bụ́ okenye n’ọgbakọ, degaara Ministri Okwu Agụmakwụkwọ Dị n’Aka akwụkwọ ozi. Nke a mere ka a kpochie ụfọdụ n’ime ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ bụ́ ndị na-ahazi aghụghọ ule a. Nke bụ́ eziokwu bụ na ma Ministri Okwu Agụmakwụkwọ Dị n’Aka ma ndị ọchịchị anaghị akwado aghụghọ ule. Ma ụfọdụ ndị isi ụlọ akwụkwọ na ndị nkụzi na-akwado ya n’ihi na ọ na-eme ka ha nwetakwuo ego; a na-anụkwa aha ụlọ akwụkwọ ha ma ọ bụrụ na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ha emee nke ọma n’ule.
5 Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Zere Ya: Baịbụl katọrọ ụdị aghụghọ ule ọ bụla. Ilu 11:1 kwuru, sị: “Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke gbara mkpị e ji aghọgbu mmadụ bụ ihe arụ n’anya Jehova.” Ọ bụrụ na mmadụ aghọọ aghụghọ n’ule iji mee nke ọma, akara ahụ o nwetara ma ọ bụ otuto a ga-eto ya erughịrị ya n’ihi na akara ahụ egosighị ókè amamihe ya hà. Ebe ọ bụ na Jehova kpọrọ aghụghọ dị otú ahụ asị, ezi Ndị Kraịst na-egosi na ha maara ihe site n’ịghara ime ka ndị ọzọ chee na ha bụ ihe ha na-abụghị.
6 Ihe ọzọ mere Ndị Kraịst na-eji ezere aghụghọ ule bụ na mmadụ itinye aka na ya n’ụzọ ọ bụla na-egosi na onye ahụ anaghị akwanyere Siza ùgwù. Iwu Nigeria kwuru na a ga-atụrịrị onye mere ya mkpọrọ. Ọ bụ ezie na ihe mere anyị ji ezere ya abụghị naanị iji zere ntaramahụhụ, anyị na-eme otú ahụ n’ihi na iwu ji anyị ‘ido onwe anyị n’okpuru ndị ọchịchị.’—Rom 13:1-7.
7 Ọzọkwa, Ndị Kraịst adịghị aghọ aghụghọ ma ọ bụ na-agba ndị ọzọ ume ịghọ aghụghọ n’ihi na ime otú ahụ nwere ike ime ka akọnuche anyị jiri nwayọọ nwayọọ nwụọ ma kwụsị ichebe anyị. Jehova nyere anyị akọnuche ka ọ na-agbara anyị àmà mgbe anyị gahiewere. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka o jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ịrụ ọrụ site n’ịjụ ịṅa ya ntị n’ihe ndị yiri obere okwu, anya nwere ike kaa anyị ime mmehie ndị ka njọ, ọ ga-akpakwa mmekọrịta anyị na Jehova aka ọjọọ.—1 Pita 3:16.
8 Ọrụ Ndị Mụrụ Ụmụ: O doro anya na ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst hụrụ ụmụ ha n’anya, chọọkwa ka ihe gaara ha nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ka o doo ụmụ ha anya na ha ka nwere mmasị n’ọganihu ime mmụọ nke ụmụ ha karịa ná mbọ ọ bụla ha na-agba inwe ọganihu n’agụmakwụkwọ ụwa. Ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke maara na Jehova nyefere ha ọrụ ịkụziri ụmụ ha ihe n’aka. (Efe. 6:4) N’ihi ya, ha anaghị akwado ụmụ ha n’ihe ọjọọ ọ bụla. Nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-ewepụta oge iji kụziere ha ịdị na-eme ihe n’eziokwu na ịdị na-eme omume ọma.
9 E ji ime ihe n’eziokwu mara Ndịàmà Jehova. Ma, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịhụ na o mebighị aha ọma a e ji mara anyị. N’ihi ya, ka anyị gbaa ụmụ anyị na-eto eto ume ka ha gụsie akwụkwọ ike iji mee nke ọma n’ule. (Ilu 10:4; 22:29) N’agbanyeghị otú aghụghọ ule si ewu ewu n’ụwa, ka anyị niile gbasie mbọ ike inwe akọnuche dị ọcha n’anya mmadụ niile, si otú ahụ na-ewetara Jehova otuto.—Hib. 13:18.