Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na December 29, 2008. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri abụọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke November 3 ruo December 29, 2008.
NKÀ OKWU
1. Gịnị mere ‘iji ịhụnanya enye mmadụ ndụmọdụ’ ji adị irè? (Faị. 9) [be-IB p. 266 para. 1-3]
2. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ndị ọzọ nwee obi ike? [be-IB p. 268 para. 4–p. 269 para. 2]
IHE OMUME NKE 1
3. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara Taịtọs si bụrụ nke ‘dị mma, bakwaara anyị uru’ taa? (Taị. 3:8) [w91 2/15-IB p. 22 para. 4]
4. Gịnị mere o ji bụrụ na akwụkwọ ozi mbụ Pita dere bịara n’oge kwesịrị ekwesị? [w91 3/15-IB p. 30 para. 2]
5. Olee otú ihe atụ ndị e ji mee ihe ná Mkpughe kwesịrị isi metụta anyị? [w91 5/1-IB p. 21 para. 2]
ỌGỤGỤ BAỊBỤL KWA IZU
6. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere Pọl ji jikọta ‘ịghara ịbụ ndị nkwutọ’ na ‘ịghara ịdị na-aṅụ oké mmanya’ na Taịtọs 2:3? [w94 6/15-IB p. 20 para. 12]
7. Na Setan “nwere ikike ịkpata ọnwụ” ọ̀ pụtara na o nwere ike igbuchu onye ọ bụla ọ chọrọ? (Hib. 2:14) [w08 10/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs, Faịlimọn, na Ndị Hibru”]
8. Ònye bụ “onye e ji gbaa ndụ” n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (Hib. 9:16) [w08 10/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs, Faịlimọn, na Ndị Hibru”]
9. Gịnị ka ịbụ onye udo pụtara, oleekwa ajụjụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị banyere nke a? (Jems 3:17) [w08 3/15-IB p. 24 para. 18]
10. Gịnị ka ahịrịokwu ahụ bụ́ “Chineke karịrị obi anyị” pụtara? (1 Jọn 3:20) [w05 8/1-IB p. 30 para. 19]