Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo na ha nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. January: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla metụrụla ochie nke ka fọrọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. February: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, e nyefee Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. March: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.
◼ Anyị na-echetara ọgbakọ niile na ha kwesịrị ịgwa alaka ụlọ ọrụ oge ndị ha ga-eji na-amụ ihe malite na January 1, 2009. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu emebeghị nke a, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị iji kaadị Congregation Meeting Information (S-5) mee nke a ozugbo. Anyị na-ezitere ọgbakọ nke ọ bụla mkpụrụ kaadị abụọ maka nke a. E kwesịrị idejupụta otu kaadị ahụ ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ.