Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’April 6
IZU NA-AMALITE N’APRIL 6
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 7-10
Nke 1: Ọpụpụ 9:1-19
Nke 2: Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs (lr isi nke 13)
Nke 3: Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Gosi na Ndị Galeshia 6:2 Emegideghị Ndị Galeshia 6:5?
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Otú E Si Ekwu Ihe Ndị Ziri Ezi Iji Kwadoo Okwu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke a ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 255-257.
Nkeji 20: Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke okenye ga-eme, nke ga-esi na traktị Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? Jaa ndị na-eto eto mma, bụ́ ndị na-agbalị ibute ihe ndị metụtara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ha. Jiri nkeji ole na ole gbaa otu onye malitere ozi oge niile mgbe ọ ka na-eto eto ajụjụ ọnụ. ‘Gịnị kpaliri gị ịmalite ozi oge niile? Olee ngọzi ndị i nwetarala?’