Usoro Ihe Omume Maka Izu Nke May 25
IZU NA-AMALITE NA MAY 25
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 34-37
Nke 1: Ọpụpụ 37:1-24
Nke 2: Ịlụ Ọgụ Ọ̀ Dị Mma? (lr isi nke 19)
Nke 3: Gịnị Bụ Ịnakwere Ihe Ọ Bụla, Oleekwa Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Zere Ya?
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 193
Nkeji 5: Ịma Ọkwa.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Ụlọ Nche June 1 na Teta! April-June. Mgbe ị kọwatụchara ihe dị na magazin ndị ahụ, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị ha na-akwadebe iji nyefee ha ndị mmadụ na ihe mere ha ji họrọ isiokwu ndị ahụ. Olee ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị ha ga-agụ tupu ha enyefee ha. Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla n’ókèala unu.
Nkeji 10: Ịgba Àmà Banyere Jizọs. Okwu ga-esi na paragraf anọ mbụ dị n’okpuru isiokwu a, na peeji nke 275 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.
Nkeji 10: “Jiri Akwụkwọ Anyị Na-eme Ihe Bara Uru.” Ajụjụ na azịza. Mee ka ndị nọ n’ọgbakọ ghọta na e nwere ihe dị iche n’akwụkwọ ole ha na-aga ewere n’ebe a na-ewere akwụkwọ na ole ha nyefere n’ọnwa.