Usoro Ihe Omume Maka Izu Nke June 1
IZU NA-AMALITE NA JUNE 1
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 38-40
Nke 1: Ọpụpụ 40:1-19
Nke 2: Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile? (lr isi nke 20)
Nke 3: Mmụọ Nsọ Abụghị Onye? (td 5D)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma Ọkwa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọnwa May.
Nkeji 10: Nyere Ndị Ọzọ Aka Inwe Ọganihu. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle nke si n’isiokwu nta nke abụọ dị na peeji nke 187 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Jiri nkeji ole na ole gbaa onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nkwusa nyeerela onye ọhụrụ aka inwe ọganihu ajụjụ ọnụ.
Nkeji 10: Jiri Yearbook 2009 Na-eme Ihe Bara Uru. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Tụlee “Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi,” bụ́ nke so Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa March bịa. Mee ndokwa tupu oge eruo ka ndị nkwusa kọọ ná mkpirikpi ahụmahụ ndị gbara ha ume ha gụtara na Yearbook ahụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị kacha mee ha obi ụtọ n’akụkọ ozi ụwa niile. N’okwu mmechi gị, gbaa mmadụ niile ume ka ha hụ na ha gụchara Yearbook ahụ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Rụzuru? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Jaa ọgbakọ mma maka otú ha si wepụtakwuo oge jee ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, kwuokwa kpọmkwem ihe ndị a rụzuru. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara mgbe ha na-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụ mgbe ha na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.