Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’August 31, 2009. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri abụọ, ọ ga-esikwa n’ihe ndị a mụrụ n’izu July 6 ruo August 31, 2009.
1. Gịnị mere e ji kwuo na a ga-ama “onye kpọrọ nna ya na nne ya iyi” ikpe ọnwụ? (Lev. 20:9) [w04 5/15 p. 24 par. 6]
2. Ebe ọ bụ na a chọrọ ka ụmụ nwoke niile bụ́ ndị Izrel gaa Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, ònyezi na-egbute ọka bali mbụ ahụ e ji enye onyinye? (Lev. 23:5, 11) [w07 7/15 p. 26 par. 3]
3. Gịnị ka afọ Jubili sere onyinyo ya? (Lev. 25:10, 11) [w04 7/15 p. 26-27]
4. Ò nwere otú “ihe ịrịba ama” e kwuru okwu ya n’Ọnụ Ọgụgụ 2:2 si gbasa ofufe ụmụ Izrel? [w02 9/15 p. 21 par. 4]
5. Olee àgwà yiri nke ndị Naziraịt Izrel oge ochie nke ndị ozi oge niile taa nwere? (Ọnụ Ọgụ. 6:3, 5, 6) [w04 8/1 p. 24-25]
6. Olee otú iwu e nyere ndị Livaị banyere ịkwụsị ije ozi nwere ike isi gbasa ndị Jehova taa? (Ọnụ Ọgụ. 8:25, 26) [w04 8/1 p. 25 par. 1]
7. Olee otú ndị Izrel si nwee “akpịrị ogologo,” oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri Ndị Kraịst taa? (Ọnụ Ọgụ. 11:4) [w01 6/15 pp. 14-15; w95 3/1 p. 15 par. 10]
8. Gịnị mere o ji bụrụ naanị Miriam ka e tiri ekpenta, oleekwa ihe dị oké mkpa anyị nwere ike ịmụta na nke a? (Ọnụ Ọgụ. 12:9-11) [w04 8/1 p. 26 par. 2; it-2-E p. 415 par. 1]
9. Olee ihe Jọshụa na Keleb bu n’obi mgbe ha kwuru na ndị Kenan bụ “ihe oriri”? (Ọnụ Ọgụ. 14:9) [w06 10/1 p. 16 par. 5; it-1-E pp. 363-364]
10. Olee otú Ọnụ Ọgụgụ 21:5 si na-adọ anyị aka ná ntị? [w99 8/15 p. 26-27]