Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/09 p. 6-7
  • Nzukọ Ozi Ubi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ozi Ubi
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 8/09 p. 6-7

Nzukọ Ozi Ubi

1. Gịnị mere anyị ji achọ ka a hazie otú anyị ga-esi aga ozi ọma ahazi?

1 Jizọs haziri ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ nke ọma ma jee ya otú dị mma, o sikwa otú ahụ hapụrụ anyị ihe nlereanya. Taakwa, ndị na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa niile chọkwara ịhụ na a haziri ọrụ a nke ọma otú ahụ Jizọs mere. N’ihi nke a, ọgbakọ dị iche iche n’ụwa niile na-enwe nzukọ ozi ubi iji hazie otú ụmụnna ga-esi aga kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ.—Mat. 24:45-47; 25:21; Luk 10:1-7.

2. Olee otú e kwesịrị isi na-eduzi nzukọ ozi ubi?

2 Ndokwa Mara Mma: Ihe mere e ji enwe nzukọ ozi ubi bụ ka a gbaa ụmụnna ume, nye ha ntụziaka ụfọdụ ndị ga-abara ha uru n’ozi ọma, ma gwa ndị chọrọ ịga ozi ọma ebe ha ga-arụ. E nwere ike iji nkeji ole na ole tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma ọ bụrụ na ihe e kwuru na ya gbasara ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike isi n’Ozi Alaeze Anyị, n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, ma ọ bụdị n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nweta ihe ndị ga-enyere ụmụnna aka n’ozi ụbọchị ahụ. E nwekwara ike iji nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú a ga-esi enyefe akwụkwọ anyị na-enyefe n’ọnwa a nọ na ya. E nwere ike ikpe ekpere mmechi tupu e kenye ndị nkwusa ndị ha na ha ga-arụ nakwa ebe ha ga-arụ ma ọ bụ kpee ya mgbe e mechara. Nzukọ a e kwesịghị ịgafe nkeji iri na ise. Mmadụ niile kwesịkwara ịgawa ókèala e kenyere ha ozugbo a gbasara.

3. Olee ndị na-ahụ maka nzukọ ozi ubi?

3 Olee Otú E Si Ahazi Ya? Ọ bụ onye nlekọta ije ozi na-ebute ụzọ n’ịhazi nzukọ ozi ubi. Ọ bụ ọrụ ndị nlekọta ìgwè ma ọ bụ ndị na-enyere ha aka iso ìgwè ozi ubi ha na-aga ozi ọma ná ngwụcha izu. Ụfọdụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi nwere ike isoro ìgwè ozi ubi jee ozi n’ime izu. Ndị nlekọta ìgwè na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na ìgwè ha nwere ókèala ga-ezuru ha ije ozi ụlọ n’ụlọ ná ngwụcha izu. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịhụ na e nwere ndị ga-eduru ndị pụtara ozi ọma n’ime izu jee ozi.

4-6. (a) Olee uru ọ bara inwe nzukọ ozi ubi n’ókèala a ga-arụ? (b) Olee ihe ndị e nwere ike ichebara echiche mgbe a na-ekpebi oge na ebe kacha mma ịnọ nwee nzukọ ozi ubi?

4 Olee Ebe na Oge E Kwesịrị Inwe Ya? Kama ọgbakọ niile izukọ n’otu ebe mgbe niile maka nzukọ ozi ubi, ọ kacha mma ka a na-enwe ya n’ebe dị iche iche ga-adịrị ụmụnna mfe izukọ, nke na-abụkarị n’ụlọ ụmụnna bi n’ókèala a ga-arụ. Nke a ga-enye aka mee ka ọgbakọ na-arụzu ókèala ha. E nwekwara ike ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nwee nzukọ a. N’ọtụtụ ọgbakọ, a na-enwe nzukọ ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze obere oge a gbasachara ọmụmụ ihe n’ụbọchị Sunday. E kwesịrị ịgbalị hụ na ebe a ga-arụ dị nso n’ebe e zukọrọ, ka ụmụnna ghara ịga ogologo ije. N’ihi ya, site n’oge ruo n’oge, e nwere ike ilebagharị anya n’ebe ndị a na-anọ enwe nzukọ ozi ubi iji hụ na ebe ndị ahụ bụ ebe ka mma ịnọ na-enwe nzukọ ozi ubi. Nke a ga-eme ka a na-arụzu ókèala ọgbakọ otú dị mma.

5 Ọ bụ otú ókèala ọgbakọ dị ka a ga-agbakwasị ụkwụ kpebie oge kacha mma inwe nzukọ ozi ubi nakwa ugboro ole e kwesịrị inwe ya n’otu izu. Ajụjụ ndị na-esonụ nwere ike inyere unu aka ikpebi oge na ebe kacha mma ịnọ nwee nzukọ ozi ubi.

6 Olee ókèala anyị ọ dị mkpa ka anyị jekwuo ozi ọma na ya? Olee oge kacha mma ịga ozi ụlọ n’ụlọ? Ọ̀ ga-aka mma iwepụta oge ná mgbede maka ịga ozi ụlọ n’ụlọ ka ọ bụ ịga nletaghachi? E kwesịrị ịmapawa ndokwa ọ bụla e mere maka ije ozi ọma na bọọdụ ịma ọkwa. Ọ na-agụ ndị nkwusa Alaeze niile agụụ ịhụ na a rụzuru ókèala ha nke ọma nke na ha nwere ike ikwu dị ka Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Enwekwaghị m ókèala a na-akpabeghị aka.’—Rom 15:23.

7. Olee ọrụ dịịrị onye e kenyere ka o duzie nzukọ ozi ubi?

7 Otú E Kwesịrị Isi Duzie Ya: Onye ga-eduzi nzukọ ozi ubi kwesịrị igosi na ya na-akwanyere ndokwa a Jehova mere ùgwù site n’ịkwadebe nke ọma. E kwesịrị ịmalite nzukọ a n’oge, e kwesịkwara ikwu ihe ndị ga-abara ndị pụtara ozi ọma uru, kwuokwa ya ná mkpirikpi. Nzukọ a ekwesịghị ịgafe nkeji iri na ise. Onye na-eduzi nzukọ ozi ubi kwesịrị ịma ókèala a ga-arụ tupu o duziwe nzukọ ahụ. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mkpa ịnọ chere ndị ga-abịa n’azụ oge mgbe e nwechara nzukọ ozi ubi, a ga-enyere ha aka ịchọta ebe a na-arụ ma a gwa ndị nọ nso ebe ahụ e zukọrọ ebe a ga-arụ. Mmadụ niile kwesịrị ịgawa n’ókèala ha ga-arụ ozugbo e nwechara nzukọ ozi ubi. O doro anya na ọ bụrụ na a hazie nzukọ ozi ubi nke ọma ma kwuo ihe ndị ga-abara ndị nkwusa uru, ọ ga-enyere ndị niile pụtara ozi ọma aka ime nke ọma n’ozi ụbọchị ahụ.—Ilu 11:14.

8. Olee otú ụmụnna ndị pụtara ozi ọma ga-esi gosi na ha na-akwado ndị na-eduzi nzukọ ozi ubi?

8 Ịbịa Nzukọ Ozi Ubi: Ọ dị mkpa ịrụkọ ọrụ ọnụ. (Hib. 13:17) Mgbe ọ bụla o kwere mee, nwanna na-ahazi ozi ọma ga-ekenye onye ọ bụla chọrọnụ onye ya na ya ga-arụ. Ọ ga-adị mma ma ndị nkwusa bụ́ aka ochie bịa nzukọ a, ka ha na ndị nkwusa ọhụrụ na ndị na-amachaghị otú e si ezi ozi ọma rụkọọ. Ọ bụrụ na anyị ana-ekwe ka anyị na ndị nkwusa dị iche iche na-arụ, ọ ga-aba ezigbo uru. (Ilu 27:17; Rom 15:1, 2) Mmadụ niile kwesịrị ịgbalịsi ike na-abịa n’oge. Ịkwanyere ndokwa a Chineke mere ùgwù na ichebara ụmụnna anyị ndị ọzọ echiche ga-enyere anyị aka ịhazi ihe ndị anyị na-eme nke ọma iji nwee ike na-abịa n’oge.—2 Kọr. 6:3, 4; Fil. 2:4.

9. Olee ihe ndị ọsụ ụzọ nwere ike ime iji kwadoo nzukọ ozi ubi?

9 Otú Ndị Ọsụ Ụzọ Si Akwado Ya: Ọ bụrụ na ndị ọsụ ụzọ ana-akwado nzukọ ozi ubi, ọ ga-abara onye ọ bụla uru, gbaakwa mmadụ niile ume. N’eziokwu, ndị ọsụ ụzọ nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ. E wezụga iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na ịgara ha nletaghachi, ha nwekwara ihe ndị ọzọ ha na-arụ n’ụbọchị, ndị dị ka, ịrụ ọrụ ndị dị n’ezinụlọ ha na ịrụ ọrụ ha ji akpata ego. N’ihi ya, ọ bụghị iwu na ndị ọsụ ụzọ ga-abịacha nzukọ ozi ubi niile, karịchaa ma ọ bụrụ na a na-enwe ya ụbọchị niile. Ma, ndị ọsụ ụzọ nwere ike ịga ụfọdụ n’ime nzukọ ozi ubi ndị e nwere n’izu. E nwere ike ikwu na nzukọ ozi ubi bụ ebe a na-azụ anyị, amamihe na ahụmahụ ndị ọsụ ụzọ nwere n’ozi ubi ga-abakwara ndị ọzọ ezigbo uru. Ozi ọma ha na-agachi anya emeela ka ha nwee ahụmahụ n’ozi ubi. Ndị ọzọ nwere ike ịmụta ihe n’aka ha. Anyị nwere ike isi n’aka ha mụta ịgachi ozi ọma anya nakwa ikwu ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru mgbe a na-enwe nzukọ ozi ubi. Obi na-adị anyị nnọọ ụtọ ma ha bịa nzukọ ozi ubi.

10. Gịnị mere o ji dị mma ka ndị nkwusa Alaeze niile jiri obi ha niile na-akwado nzukọ ozi ubi?

10 Ozi ụlọ n’ụlọ Jizọs na ndị na-eso ya gara mere ka ha kwusaara ọtụtụ ndị ozi Alaeze ahụ, otú ahụkwa ka ọ dị anyị taa. Ihe mere e ji enwe nzukọ ozi ubi bụ ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume nakwa iji nyere anyị aka izi ozi ọma Alaeze ahụ otú ọ ga-eru ndị mmadụ n’obi. Ndị nkwusa niile kwesịrị ịkwado ndokwa a si n’aka Jehova ruo ókè o kwere ha mee. (Ọrụ 5:42; 20:20) Ka anyị niile jiri obi anyị niile na-akwado nzukọ ozi ubi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị n’ụba, anyị ga-emekwa ka obi Onye Ndú anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, ṅụrịa ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Mat. 25:34-40; 28:19, 20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya