Chebe Ụmụ Gị Ka Ha Ghara Ikpe Okpukpe Ụgha n’Ụlọ Akwụkwọ
1. (a) Olee ihe mere ụmụ Ndịàmà Jehova ji akpa àgwà ọma n’ụlọ akwụkwọ? (b) Gịnị mere ọ naghị adị mfe ịkpa àgwà ọma n’ụlọ akwụkwọ?
1 N’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, e ji àgwà ọma mara ụmụ Ndịàmà Jehova. Nke a bụ n’ihi ezigbo mbọ nne na nna ha gbara ‘ịzụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.’ (Efe. 6:4) Ma, ọ naghị adị mfe ịkpa ezigbo àgwà n’ụlọ akwụkwọ. Ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ụmụaka na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ na-eme ihe ike n’ụlọ akwụkwọ.
2. Olee ihe ndị isi ụlọ akwụkwọ ụfọdụ na-eme iji nyere ụmụ akwụkwọ aka ịkwụsị ịkpa àgwà ọjọọ?
2 Ọtụtụ mgbe, ndị isi ụlọ akwụkwọ na-ewepụta oge maka ịgwa ụmụ akwụkwọ okwuchukwu iji nyere ha aka ịkwụsi àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa. Mgbe ụfọdụ, ha na-akpọ ndị ụkọchukwu ka ha bịa kwuo okwuchukwu ahụ. N’Ụlọ akwụkwọ ụfọdụ, a na-ebu ụzọ anọkọ kpee ekpere n’ụtụtụ ọ bụla tupu ebido ịmụ ihe. A na-abụkarịkwa abụ chọọchị ná nnọkọ ụtụtụ ahụ. A kụziwekwara ụmụ akwụkwọ ihe na klas, a na-akụziri ha ozizi na ukwe ndị okpukpe ụgha. Ndị isi ụlọ akwụkwọ na-ekwu na nwa akwụkwọ ọ bụla ga-esorịrị na-eme ihe ndị a nakwa na e nwere ike ịkwụsị nwa akwụkwọ ọ bụla ịbịa akwụkwọ ruo nwa oge ma ọ bụdị chụpụ ya n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ jụ iso eme ha.
3. Olee ihe ndị nne na nna kwesịrị ịgbalịsi ike ime?
3 E nwere ezigbo ihe mere ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ji agbalịsi ike ichebe ụmụ ha ka ha ghara ikpe okpukpe ụgha. Ha na-eji ntụziaka dị n’Akwụkwọ Nsọ enyere ha aka izere ihe ọ bụla gbasara Babịlọn Ukwu ahụ, ka ha ghara “iso ya kere òkè ná mmehie ya,” ‘kwụsịkwa imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’ (Mkpu. 18:4; 2 Kọr. 6:14-18) Anyị na-aja ndị nne na nna niile mma, bụ́ ndị na-agbalịsi ike inyere ụmụ ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Olee ihe ọzọ ndị nne na nna nwere ike ime iji chebe ụmụ ha ka “onye mmegide,” bụ́ onye na-achọkarị iripịa ụmụaka na ndị na-amachaghị nke a na-akọ, ghara iripịa ha?—1 Pita 5:7, 8.
4. Olee mgbe ndị nne na nna kwesịrị ịgakwuru ndị nkụzi ụmụ ha ka ha na ha kwurịta okwu?
4 Tupu e nyewe ụmụaka nsogbu n’ụlọ akwụkwọ, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna gakwuru ndị isi ụlọ akwụkwọ na ndị nkụzi ụmụ ha, ka ha na ha kwurịta ihe ndị dị na broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ. Ha kwurịtachaa ya, ọ ga-adị mma ka ha degakwara ndị ụlọ akwụkwọ ahụ akwụkwọ ozi kọwara ihe ndị ahụ ha kwurịtara. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha kwesịrị iji nkwanye ùgwù kọwaa ebe ha kwụ n’okwu ahụ, deekwa ya otú doro anya ma dị mfe nghọta.
5. Olee ngọzi ndị nne na nna ga-enweta ma ọ bụrụ na ha agbaa mbọ chebe ụmụ ha?
5 Ebe ọ bụ na ụwa na-achọ ka ụmụ anyị na-akpa àgwà ka ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ụmụ anyị ga-enwe ọtụtụ ọnwụnwa. (Rom 12:2) Obi siri anyị ike na unu ndị nne na nna ga-egosi na unu maara ihe nakwa na unu ga-echebe ụmụ unu ndị na-amabeghị nke a na-akọ, ka ha ghara itinye aka n’okpukpe ụgha. (Ilu 22:3) Ka obi sie unu ike na Jehova ga-agọzi mbọ unu na-agba inyere ụmụ unu aka ka ha nọgide n’okporo ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ.—Mat. 7:13, 14.