Bụrụ Aka Ochie n’Iji Baịbụl Akụzi Ihe
1. Gịnị mere Baịbụl ji baa ezigbo uru?
1 Anyị bụrụ aka oche n’iji Okwu Chineke akụzi ihe, anyị ga-enwe ike ikwusa eziokwu ahụ ma kụzie ya otú ọ ga-edo anya, nweekwa ike ịgba ozizi ụgha na ọdịnala ndị na-adịghị mma n’anwụ.—2 Tim. 2:15; 1 Pita 3:15.
2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịbụ aka ochie n’ịchọta amaokwu Baịbụl?
2 Matakwuo Baịbụl nke Ọma: Tupu mmadụ abụrụ aka ochie n’iji ngwá ọrụ ọ bụla arụ ọrụ, ọ ga-ama ngwá ọrụ ahụ nke ọma. Isi n’isi gụrụ Baịbụl ruo ná ngwụcha ga-eme ka ị ghọta isiokwu Baịbụl. Ọ ga-enyekwara gị aka icheta amaokwu Baịbụl dị iche iche na ịchọta ha ngwa ngwa. Ka ị na-amatakwu Akwụkwọ Nsọ, ị ga na-ejikwu ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ị ga-ekwukwa ya otú na-egosi na ihe ị na-ekwu doro gị anya, ọ sọgodị ya ya bụrụ mgbe ị na-anọghị n’ozi ọma.—1 Tesa. 1:5.
3, 4. (a) Olee ụfọdụ ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmatakwu Baịbụl nke ọma? (b) Ò nweela ihe ndị ọzọ i merela iji matakwuo Akwụkwọ Nsọ nke ọma?
3 N’ọmụmụ ihe, mee ka ọ mara gị ahụ́ ịna-asapeta Baịbụl gị ma na-ele anya mgbe a na-agụ ebe a kpọrọ ka a gụọ. Mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye na mgbe ị na-akwadebe ọmụmụ ihe, gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị n’ihe ị na-amụ ma chebara ihe e kwuru ebe ahụ echiche. Ọtụtụ ndị achọpụtala na isi na Baịbụl agụpụta amaokwu Akwụkwọ Nsọ, kama ịgụ ya na kọmputa ma ọ bụ n’ebe e bipụtara ya ná mpempe akwụkwọ, na-eme ka ọ dịrị ha mfe ịchọta amaokwu Baịbụl ha chọrọ ịgụ mgbe ha nọ n’ozi ọma.—Jọn 14:26.
4 Ụfọdụ ezinụlọ na-ewepụta oge ha ji ebu amaokwu Baịbụl dị iche iche n’isi. Otú e nwere ike isi mee ya bụ ide otu amaokwu Baịbụl n’ihu otu mpempe akwụkwọ, dezie ihe ebe ahụ kwuru n’azụ mpempe akwụkwọ ahụ. Ha na-eji ya ama onye ga-agụli amaokwu Baịbụl ahụ n’isi ma ọ bụ cheta ebe ọ dị na Baịbụl ma e gosi ya ihu mpempe akwụkwọ ahụ ma ọ bụ azụ ya. Anyị na-aghọkwu aka ochie n’iji Baịbụl akụzi ihe ma anyị na-amụgharị otú anyị ga-esi zie ozi ọma, otú anyị ga-esi zaghachi okwu mgbochi ma ọ bụkwanụ otú anyị ga-esi jiri Baịbụl zaa ajụjụ a jụrụ anyị.
5. Gịnị mere o ji dị mkpa na anyị ga-abụ aka ochie n’iji Baịbụl akụzi ihe?
5 O nweghị akwụkwọ bara uru ka Baịbụl. Ọ bụ naanị na Baịbụl ka e dere ihe ndị nwere ike ime ka ndị mmadụ “mara ihe iji nweta nzọpụta.” (2 Tim. 3:15) Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bi n’ókèala anyị amaghị ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị na Baịbụl, ọ dị ezigbo mkpa na anyị ga-abụ aka ochie n’iji Baịbụl akụziri ha ihe.—Ilu 2:1-5.