Akụkọ Ozi
Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na nletaghachi ndị anyị gara n’ọnwa May afọ a dị 1,800,215. Nletaghachi a ji 127,045 karịa nke anyị gara n’ọnwa May afọ gara aga. Ọmụmụ Baịbụl anyị duziri n’ọnwa May afọ a jikwa 55,480 karịa nke anyị duziri n’ọnwa May afọ gara aga.