Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 11
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 11
Abụ nke 118
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 15 ¶10-17, igbe dị na peeji nke 177
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 21-24
Na 1: Jọshụa 24:1-13
Na 2: Chineke Ọ̀ Bụ Onye Na-enweghị Mmetụta nke Obi Tara Mmiri?
Na 3: Baptizim Adịghị Asachapụ Mmehie (td 6B)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 97
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Kụziere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Otú E Si Amụ Ihe. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 28-31, n’isiokwu nta bụ́ “Ụzọ Isi Mụọ Ihe.” Buru ụzọ mee ihe ngosi ebe onye nkwusa ma nke a na-akọ na-akụziri onye ọ na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi akwadebe ihe ha ga-amụ. Ọ ga-eji ihe e dere n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, peeji nke 7 mee ihe ngosi ahụ.
Nkeji 15: “Èruru M Eru Ikwusa Ozi Ọma?” Ajụjụ na azịza. A tụlechaa paragraf nke 4, gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ. Jụọ ya ajụjụ ndị a: Olee ihe isi ike ndị i meriri tupu i nwee ike ikwusawa ozi ọma nke ọma? Olee otú e si nyere gị aka ime nke ọma n’ozi gị?
Abụ nke 43