Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Jenụwarị: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, ndị nkwusa nwere ike inye ha akwụkwọ ọ bụla merela ochie e nwere n’ọgbakọ. Ma ọ bụkwanụ, nyefee ha Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Febụwarị: E nwere ike inyefe Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ndị nkwusa kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalitere onye ha nyefere akwụkwọ a ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụ malitere ndị nwerela akwụkwọ a ọmụmụ Baịbụl. Eprel na Mee: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi enyefe akwụkwọ a bụ iji ya duziwe ọmụmụ Baịbụl.
◼ Malite na Febụwarị, isiokwu okwu ihu ọha ọhụrụ ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ “Ihe Alaeze Chineke Na-emere Anyị Ugbu A.”
◼ Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’afọ 2010, a ga-enwe mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ ndị ogbi (ASL) n’ebe ndị a: Na Bini Siti, ọ ga-abụ na Mach 20-21 nakwa Ọgọst 21; n’Ọta, ọ ga-abụ n’Eprel 10-11 nakwa Julaị 10; n’Uli, ọ ga-abụ na Jun 5-6 nakwa Eprel 24. A ga-enwekwa mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ French. A ga-enwe ya na Badagrị na Mach 6-7 nakwa Julaị 3. Ná ndị nke a ga-enwe n’asụsụ ndị ogbi, okwu niile a ga-ekwu ga-abụ n’asụsụ ndị ogbi. Na nke ahụ a ga-enwe n’asụsụ French, okwu niile ga-abụkwa n’asụsụ French. A na-agba ndị na-aghọta asụsụ ndị a ume ka ha bịa.