Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Febụwarị: E nwere ike inyefe Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ndị nkwusa kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalitere onye ha nyefere akwụkwọ a ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụ malitere ndị nwerela akwụkwọ a ọmụmụ Baịbụl. Eprel na Mee: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi enyefe akwụkwọ a bụ iji ya duziwe ọmụmụ Baịbụl.
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche nke afọ 2010 bụ: “Olee Mgbe A Ga-enwe Ezi Udo na Obi Iru Ala?” A ga-amalite ikwu ya n’izu Eprel 12, 2010. Ọgbakọ ndị ga-aga mgbakọ sekit, ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ma ọ bụ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit n’izu ahụ, nwere ike ikwu okwu ihu ọha ahụ n’izu Eprel 19, 2010.