Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 3
IZU NA-AMALITE NA MEE 3
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:2 Samuel 1-3
Na 1: 2 Samuel 2:12-23
Na 2: Jizọs Ọ̀ Kpọrọ Aha Chineke Mgbe Ọ Na-ezi Ozi Ọma?
Na 3: Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Imerụ Gị Ahụ́? (td 41B)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ọ Bụrụ na Onye Nwe Ụlọ Asị, ‘Unu Ekweghị na Jizọs.’ Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Gịnị mere ndị bi n’ókèala anyị ji ekwu ụdị ihe a? Olee ajụjụ e nwere ike ịjụ ha iji mata ihe ha bu n’uche kwuo ya? Olee ihe Jizọs kụziri nke nwere ike ịmasị ha? Olee ihe dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, isi nke 4, bụ́ nke e nwere ike iji zaghachi ha? Gwa ndị nkwusa ka ha gụpụtara onye nwe ụlọ ihe e dere na peeji nke 2 n’Ụlọ Nche, bụ́ ebe e kwuru ihe ndị mere e ji ebipụta magazin ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Soro Nweta Ngọzi Na-adị n’Ozi Ìgwè. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke ga-esi n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 108, paragraf 1-3. Gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo ndokwa ndị e mere maka ụbọchị ndị a ga-aga ozi ọma nakwa ebe ndị a ga-anọ enwe nzukọ ozi ubi n’ụbọchị ndị ahụ. Jụọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo uru ndị ha ritere n’ihi iso ndokwa a nakwa iso ndị nkwusa ndị ọzọ na-aga ozi ọma.