Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 20
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 20
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ihe E Mere 20-24
Nke 1: 2 Ihe E Mere 20:1-12
Nke 2: Olee Ihe Ịmụ na Ịsụ Asụsụ Dị Ọcha Chọrọ Mmadụ n’Aka? (Zef. 3:9)
Nke 3: Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Ụmụ Mmadụ (td 2A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Ị̀ Gbalịala Ime Ya? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Onye nwe ihe omume a ga-ekwu ná nkenke isi ihe ndị dị n’isiokwu ndị a e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị na nso nso a, ha bụ: “Ò Nweela Onye I Duziiri Ọmụmụ Baịbụl n’Oge Mbụ Ị Gara na nke Ya?” na “Otú E Si Akụziri Ndị Ọhụrụ Izi Ozi Ọma” (km 5/10) nakwa “Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!” (km 8/10). Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha sirila mee ihe ndị ahụ e kwuru n’isiokwu ndị ahụ nakwa uru ndị ha riterela.
Nkeji 15: “Ihe Ọhụrụ nke Ga-enyere Anyị Aka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl.” Ajụjụ na azịza. Tupu ị malite ihe omume a, hụ na e nyere onye nkwusa ọ bụla na-ejighị Ụlọ Nche Jenụwarị 1, 2011, otu Ụlọ Nche ahụ. Tupu i mechie, mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ nke otú e nwere ike isi jiri isiokwu ọhụrụ ahụ bụ́ “Mụta Ihe n’Okwu Chineke—Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?” malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl.