Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 20
IZU NA-AMALITE NA JUN 20
Abụ nke 63 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 5 ¶9-16, igbe dị na p. 41-42 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 45-51 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 48:1–49:9 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Bụ Chọọchị Ndị Kraịst?—td 8A (Nkeji 5)
Nke 3: Ebe Ọ Bụ na Ndụ Bụ Onyinye, Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-eme Ihe Ga-eme Ka A Zọpụta Anyị?—Rom 6:23; Fil. 2:12 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Julaị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri nkeji ole na ole kwuo akwụkwọ ndị a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Julaị, gị na ndị na-ege ntị kwurịtakwa ihe ụfọdụ dị na ya. Unu mechazie, mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ gbasara otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ akwụkwọ ndị ahụ.
Nkeji 10: Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ. (Mat. 21:15, 16) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche January 1, 1995, peeji nke 24. Ị kọchaa ahụmahụ nke ọ bụla, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-agba Àmà n’Okporo Ámá.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Kọwaa isiokwu a otú ọ ga-adaba adaba n’otú ókèala unu dị. Jiri nkeji ole na ole mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ gbasara otú e nwere ike isi mee ihe e kwuru n’isiokwu a.
Abụ nke 107 na Ekpere