Akụkọ Ozi
N’agbata ọnwa Julaị na Nọvemba afọ 2010, narị ndị nkwusa itoolu na iri abụọ na abụọ gara kwusaa ozi ọma n’ókèala ndị a na-anaghị agakarị ozi ọma na n’ókèala ndị a na-eketaghị ọrụ na Naịjirịa. Ha si iri ọgbakọ asatọ na asatọ. Ha duziiri puku mmadụ atọ, narị atọ na iri ise na abụọ ọmụmụ Baịbụl n’ókèala ndị ahụ. E nwere otu nwoke naara akwụkwọ Bible Na-akụzi, kwuo na ya chọrọ ka a malitere ya ọmụmụ ihe n’isi nke asaa. Ihe mere o ji họrọ ebe ahụ bụ na deede ya na papa ya nwụrụ n’Ọgọst 2010. Nwoke ahụ siri ọnwụ na ya na nwanna na-eduziri ya ọmụmụ ihe ahụ ga-amụcha isiokwu ahụ n’ụbọchị ahụ. Ihe mere o ji sie ọnwụ bụ na ihe ha nọ na-amụ na-akasi ya obi, na-emekwa ka obi sie ya ike na ya ga-emecha hụ deede ya na papa ya ọzọ. Afọ a bụkwa afọ ọzọ anyị ga-eji gaa n’ụdị ókèala ndị ahụ, iji kasie ụdị ndị ahụ obi. Ị̀ ga-achọ iso rụọ ọrụ a dị ezigbo mkpa n’afọ a?