Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 31
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 31
Abụ nke 104 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 12 ¶1-8, igbe dị na p. 96 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ilu 22-26 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. “Olee Otú Ha Dị n’Anya?” Okwu. I kwuchaa, jiri ihe dị ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” bụ́ nke dị na peeji nke 8, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Nọvemba.
Nkeji 15: Uru Ọ Bara Ịdị Mma n’Anya Mgbe Anyị Na-aga Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 131-134. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a.
Nkeji 10: Jikere Inye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Nọvemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu. Jụzie ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji isiokwu ndị mbụ gbara n’Ụlọ Nche nke ọnwa ahụ nye mmadụ magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ onye ahụ. Meekwa otu ihe ahụ na Teta! nke ọnwa ahụ, ọ bụrụkwa na oge fọrọ, i nwekwara ike họrọ otu isiokwu ọzọ dị na Teta! ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 90 na Ekpere