Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 28
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 28
Abụ nke 26 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 13 ¶8-16, igbe dị na p. 105 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Sọlọmọn 1-8 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Sọlọmọn 1:1-17 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Hel Abụghị Ebe A Na-emekpa Mmadụ Ahụ́—td 13A (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwanyewere Anyị Ùgwù? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” bụ́ nke dị na peeji nke 8, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Disemba. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ. Kwuo akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Disemba, kwuokwa ụfọdụ ihe ndị dị na ya.
Nkeji 25: “Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?” Ajụjụ na azịza. Ọ bụrụ na e nwere onye nkwusa nọ n’ọgbakọ unu, nke garala mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma, gbaa ya ajụjụ ọnụ.
Abụ nke 95 na Ekpere