Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 12
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 12
Abụ nke 43 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 14 ¶1-5, igbe dị na p. 112 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 6-10 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 6:1-13 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Akụkọ Ọgaranya na Lazarọs Adịghị Egosi na A Na-emekpa Mmadụ Ahụ́ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—td 13CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Ịhụnanya Adịghị Ada Ada—1 Kọr. 13:8; 1 Jọn 4:8 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke Afọ 2012. Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Kwusie okwu ike n’ihe ndị ga-akacha abara ọgbakọ unu uru, bụ́ ndị dị n’usoro ihe omume nke afọ 2012. Kọwaa ihe bụ́ ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka. Gbaa mmadụ niile ume ka ha na-eji ihe omume e nyere ha akpọrọ ihe, ka ha na-ekwu ihe ndị ha mụtara n’isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl, nakwa ka ha na-eme ihe ndị e ji akwụkwọ Rite Uru kọwaara anyị n’izu ọ bụla.
Nkeji 15: “Anyị Kwesịrị Ịna-ekwusa Ozi Ọma Mgbe Niile.” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 2, jiri nkeji ole na ole gbaa onye nkwusa na-ezikarị ozi ọma mgbe ọ na-anọghị ozi ụlọ n’ụlọ ajụjụ ọnụ. Jụọ ya otú ọ na-esi akwadebe ụdị ozi ọma a, ya kọọkwa otu ahụmahụ dị ụtọ o nwerela.
Abụ nke 135 na Ekpere