Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite Disemba 26, 2011.
1. Ọ bụrụ na anyị kpasuru mmadụ iwe, olee otú ndụmọdụ dị n’Ilu 30:32 ga-esi enyere anyị aka ka anyị ghara ịkpasukwu onye ahụ iwe? [w87 5/15 p. 30 para. 17]
2. Olee ụdị “ịṅụrị ọṅụ” nwere ike ime ka ndụ gwụ mmadụ ike? (Ekli. 2:1) [g 4/06 p. 6 para. 1-2]
3. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị sị na ihe Sọlọmọn kwuru n’Ekliziastis 3:1-9 gosiri na ihe na-eme mmadụ si n’akara aka ya, olee otú ihe o kwuru n’Ekliziastis 9:11 si gosi na ihe ahụ ha na-ekwu abụghị eziokwu, ya bụ na ọ bụghị akara aka mmadụ na-ekpebi ihe na-eme ná ndụ ya? [w09 3/1 p. 4 para. 4]
4. Olee nsogbu na-adị ná mmadụ ịbụ “onye ezi omume gabiga ókè”? (Ekli. 7:16) [w10 10/15 p. 9 para. 8-9]
5. Olee otú ihe e dere n’Abụ Sọlọmọn 2:7 si egosi na ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ ndị chọrọ ịlụ nwunye kwesịrị imeda obi họrọ onye ha ga-alụ? [w06 11/15 p. 19 para. 1]
6. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’Abụ Sọlọmọn 4:11, bụ́ nke kwuru na ihe si ‘n’egbugbere ọnụ nwa agbọghọ Shulem na-atasị bụ mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya,’ nakwa na ‘mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi dị n’okpuru ire ya’? [w06 11/15 p. 19 para. 6]
7. Olee otú aha ndị a na-etu Jizọs, ya bụ, “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,” “Chineke nke bụ́ Dike,” na “Nna Mgbe Ebighị Ebi,” si enyere anyị aka ịghọta àgwà ndị Jizọs nwere na otú ọchịchị ya ga-adị n’ụwa ọhụrụ? (Aịza. 9:6) [w91 4/15 p. 5 para. 7]
8. Olee ndị nọchiri anya ‘mba Izrel ahụ dapụrụ n’ezi ofufe,’ oleekwa ndị ga-abụ “ụtarị” Jehova ga-eji bibie ha? (Aịza. 10:5, 6) [ip-1 p. 145 para. 4-5; p. 152 para. 20]
9. Olee otú amụma Aịzaya buru gbasara mbibi a ga-ebibi Babịlọn si mezuo, oleekwa otú mmezu amụma ahụ si ewusi okwukwe anyị ike? (Aịza. 13:19, 20) [bh p. 24-25 para. 16-17]
10. Olee mgbe Jizọs natara “mkpịsị ugodi nke ụlọ Devid,” oleekwa otú o si jiri ya na-arụ ọrụ? (Aịza. 22:22) [w09 1/15 p. 31 para. 2]